Kedụ ebe Sunday na Calista Ifedi nọ?

Ebe foto si, Amnesty International Nigeria/X
Otu na-ahụ maka ugwu ruuru mmadụ bụ Amnesty International eboola ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa ebubo ịtọrọ Maazị Sunday Ifedi na nwunye ya bụ Calista Ifedi n'afọ 2021.
Ndị otu Amnesty International kwuru na ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa dọkpụụrụ di na nwunye ahụ n’ike n’ụbọchị 23 nke ọnwa Nọvemba afọ 2021.
Dịka otu ahụ siri kọwaa n’otu ozi ha bipụtara n’ọbaozi X ha, ihe mere ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa jiri dọkpụrụ di na nwunye ahụ bụ n’ihi na a na-ebo ha ebubo ị bụ ndị otu Indigenous People of Biafra (IPOB).
Amnesty International kwuru na ụmụ di na nwunye ahụ akwụsịla agụmaakwụkwọ ha n’ihi nne na nna ha na-efu efu.
Otu ihe onyonyoo na-efegharị n’ikuku na nso nso a gosiri otu nwatanwaanyị kwuru na ya bụ nwa Sunday na Calista Ifedi.
Dịka nwatanwaanyị ahụ siri kwuo, ndị ọrụ DSS wụchiri n’ụlọ ha n’ụzọ ụtụtụ ụbọchị 23 nke ọnwa Nọvemba 2021 ma dọkpụrụ nne na nna ya n’ihi ebubo na ha so n’otu IPOB.
Ka osiladị, ụlọorụ DSS nọọrọ n’ime afọ 2022 gọọ aka na ụkwụ ya gbasara ebubo ịdọkpụrụ ndị mmadụ.
Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ DSS bụ Peter Afunanya gọrọ agụgọ ahụ n’otu ozi o wepụtara gbasara ebubo ndị ọrụ mgbasaozi na otu dị iche iche na-ebo DSS ịnwụchi ndị aka ha dị ọcha n’okpuru ọchịchị Muhammadu Buhari.
Etu nke a siri mee

Ebe foto si, Amnesty International Nigeria/X
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Otu ihe onyonyoo fesara n’ikuku nke BBC Igbo hụrụ gosiri nwatanwaanyị a sị na aha ya bụ Merit Ifedi, onye kwuru na ya bụ Ada Sunday na Calista Ifedi.
Nwatanwaanyị ahụ sịrị na ndị ọrụ nchekwa wụchiri n’ụlọ ha n’ụzọ ụtụtụ mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere anọ (4:00am) n’ụbọchị 23 nke ọnwa Nọvemba afọ 2021 ma malite ịkwagharị ihe niile dị n’ime ụlọ ha sị na e nwere ihe ha na-achọ.
Ọ sịrị na ndị ọrụ nchekwa ahụ bu egbe naara nne ya ekwentị ya ma gbochie ha ime mkpọtụ maọbụ kpọtụrụ onye ọbụla. Ka e mesịrị ha akpụrụ nne na nna ya pụọ.
Nwaada ahụ kwuru na ya na ndị agbataobi sooro gaa n’ụlọọrụ ndịagha nakwa n’ụlọọrụ nchekwa ndị ọzọ dị n’Enugwu mana enweghị ndị kwetara na ọ bụ ha ji nne na nna ya.
Ọ sịrị na ọ bụ mgbe ha gara nye mkpesa n’aka otu na-ahụ maka ugwu nke mmadụ ka ndị ọrụ nchekwa kwetara na ọ bụ ha ji mmadụ abụọ ahụ mana ekweghị ka ahụ ha anya.
Oge ọ na-agwa ndị ọrụ mgbasaozi okwu, Merit sịrị na ụbọchị ọzọ ha gara n’ụlọọrụ ndị nchekwa ka a gwara ha na akpọgaala nne na nna ya Abuja.
Merit kwuru na ya gbahapụrụ agụmaakwụkwọ ya kemgbe ahụ a dọkpụụrụ nne na nna ya iji nwee ike leta ụmụnne ya ndị nke obere anya.
Cheta na otu ụlọikpe dị n’Enugwu nọọrọ n’afọ 2023 kwupụta na IPOB abụghị otu na-eyi ndụ egwu dịka a nọbuuru n’afọ 2017 kwupụta ya.









