A nwuchiela nwaanyị, onye amụma ụgha a sị kpara nkata igbu nwa di ya

Makuo Osinachi

Ebe foto si, Imo State Police Command

Ndị uweojii Imo steeti anwụchiela otu onye amụma ụgha nakwa otu nwaanyị maka ịkpa nkata merụọ otu nwokorobịa ahụ ma chọọ igbu ya n'a Mgbidi,Imo steeti.

A nwuchiri Makuo Osinachigbara afọ 34, onye Ehime Mbano Imo State na otu nwaanyị a kpọrọ Maria Nwabueze, gbara afọ 50, onye Umuekwe Mgbidi dị n'Okpuru Ọchịchị Oru West n' Imo Steeti maka ebubo mpụ gụnyere ịkpa nkata tọọrọ ma gbalịa igbu otu nwokorobịa bụ Ikenga Ezenyi bụ nwa di ọ lụburu.

Ikenga Ezenyi

Ebe foto si, Imo State Police Command

Nkọwa foto, A kụrụ Ikenga Ezenyi ịga n'aaka na ụkwụ kedo ya n'ukwu osisi nke mere ka aka ya rekasịa

Osinachi na Nwabueze kpara nkata tọrọ suspects conspired and abducted Ikenga Ezenyi kpọga ya n'ụlọekpere 'Holy Sabbath Mission dị n' Uzunamu Mgbidi dị n'Okpuru Ọchịchị Ọlụ ka e kpere ya ekpere ma chụọ ya ajọ mmụọ.

Ha kụrụ aka na ụkwụ ya ịga ma kedo ya n'osisi abalị atọ , taa ya nnukwu ahụhụ were ruo ka aka ya abụọ rekara tupopu nna nwata nwoke ahụ na ndị ntorobia ogbe ha bịara zọpụta ya.

E bugara nwa amadi ahụ ụlọọgwụ ebe e bepụrụ ya aka abụọ iji zọọ ndụ ya.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Geofrey Ogbonna kwuru na ya bụ ihe mere n'eziokwu n'ozi o wepụtara ụbịọchị Fraide.

Ogbonna kwuru na ha anwuchiri mmadụ abụọ ahụ ka ha mechara nnyocha.

" Nnwuchi a so akwụkwọ mkpesa nke nna nwata nwoke ahụ bụ Ike Ezenyi, onye Umuehi Mgbidi detara Komishọna ndị uweojii Imo Steeti bụ Mohammed Ahmed Barde bụ onye nyere ntuziaka ka ndị CID tinye anya mee nyocha ma nwụchie ndị mana ndị ha na ha."

Ọ gara n'ihu kwuo na ha ga-ewepụ ya bụ okwu n'ụlọikpe n'oge na-adịghị anya.