You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe anyị ma maka nwuchi Onyeisioche Ogbaru, Anambra Steeti maka ebubo ime mpụ ịntanetị n'Amerịka
Aka akparala Onyeisioche Okpuruọchịchị Ogbaru, Anambra Steeti bụ Franklin Ikechukwu Nwadialo na mba Amerịka maka ebubo iji ime ọyị adịgboroja aghọnarị ndị mmadụ ọtụtụ nde dọla.
Nke a dị n’akwụkwọ ozi ngalaba ụlọọrụ ‘U.S. Attorney’ wepụtara n’ụbọchị 5 nke ọnwa Nọvemba 2024.
Ha kwuru na a malitere inyocha Nwadialo n’ọnwa Disemba afọ 2023 n’ọnụ ebubo ruru iri na anọ (14) metụtara isi ụzọ ime ọyi aghụghọ na-aghọnarị ndị mmadụ ego.
Ha kwuru na a nwụchiri ya ka o si na Naịjirịa na-abata na mba Amerịka.
Nwadialo so n’otu n’ime ndị zọrọ ọkwa onyeisioche okpuruọchịchị Ogbaru n’ụbọchị 28 ọnwa Sepụtemba ma merie, e duru ya n’iyi ọrụ n’ọnwa Ọktoba.
Mpụ a sị na Nwadialo mere
Dịka akwụkwọ rụrụ Nwadialo aka si kwuo, o ji ụzọ aghụghọ napụta ndị mmadụ ego karịrị nde dọla atọ na ụma ($3.3million).
O ji ọtụtụ aha dịka ‘Giovanno’ zute ọtụtụ mmadụ n’ọbaozi ịntanetị dị iche iche. O ji foto adịgboroja na-abụghị foto ya na-agwa ndị ọ na-aghọrị na ọ bụ onye ọrụ agha e zigara ọrụ na mba ọzọ nke mere na ọ gaghị enwe ike izute ha n’ihu n’ihu.
Nwadialo ji aha adịgboroja ahụ na-anapụta ndị mmadụ ego, n’afọ 2020, o kwuru na ndịagha riri ya iwu maka ịgwa onye ahụ ebe ọ nọ ma rịọ onye ahụ ka o nyetụ ego $150,000 iji kwụọ ụgwọ ahụ, n’ikpeazụ ọ natara otu onye ahụ ego ruru $2.4million.
N’ọnwa 2019, Nwadialo napụtara onye ọzọ ego ruru $310,000 ma tụọ asị na ọ chọrọ iji ya lie ozu nna ya nwụrụ anwụ.
Ọ napụtara otu nwaanyị ọzọ ego ruru $270,000 site n’ịghọ ya aghụghọ na ọ chọrọ itinyere ya ego ahụ n’azụmaahịa ‘ego cryptocurrency’.
Nwadialo gakwara n’ihu n’afọ 2020 zutere onye ọzọ n’ọbaozi ebe a na-achọta ọyi nwoke na nwaanyị ma napụta ya ego ruru $310,000 ma tụọ asị na ọ chọro iji ya lie nna ya nakwa kwụọ ụgwọ akwụkwọ nwa ya nwoke.
Ntaramahụhụ e nwereike inye Nwadialo
Dịka iwu mba Amerịka si kwuo, onye ọbụla ikpe maara n’ebubo ndị e boro Nwadialo, a ga-atụ onye ahụ mkpọro ruru afọ iri abụọ ma kpachie ihe niile o ji ego ahụ ọ ghọtara n'aghụghọ mepụta.
Dịka ọ dị ugbua, ihe niile a ka bụ ebubo e boro Nwadialo, a ga-akpụpụ ya n’ụlọikpe dịka ngalaba nchekwa Federal Bureau of Investigation (FBI) ka na-eme nyocha.
A ga-ebuga Nwadialo na ngalaba ụlọikpe dị na Washington maka ịkpe ya ikpe.
Kedụ ihe gọọmentị Anambra Kwuru?
O dochabeghi anya ma gọọmentị Anambra Steeti ekwuola ihe ọbụla banyere akụkọ nwuchi nwamadị a.
BBC Igbo kpọtụụrụ kọmishọna na-ahụ maka mgbasozi bụ Maazị Law Mefor n'ekwentị mana ọ zabeghi.
N'otu aka ahụ, odeakwụkwọ mgbasaozi gọvanọ Soludo bụ Christain Aburime e zigaara ozi ka ha tinye ọnụ azabeghi.
Mana akụkọ si n'ụlọ ntaakụkọ Punch kwuru na kọmishọna na-ahụ maka Okpuruọchịchị obodo bụ Tonycollins Nwabunwanne sị na gọọmentị na-eme nyocha banyere mpụ ahụ a sị na Nwadialo mere.
Ọ gara n'ihu kwuo na gọọmentị anatabeghi ozi ọbụla banyere ya site n'ala ngalaba nchekwa gọọmentị Amerịka.