You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
E duola Bassirou Diomaye Faye n'iyi ọrụ dịka Onyeisiala ọhụrụ nke mba Senegal
E duola Bassirou Diomaye Faye n'iyi ọrụ dịka Onyeisiala nke ise nke mba Senegal n'emume e mere n'obodo Diamniadio, dị nso na Dakar isiobodo mba ahụ.
Ndịisiala mba dị iche iche gụnyere Onyuyeisiala Naijiria mabụrụ ocnyeisioche otu Ecowas gara mmemme idunyya n'iyi ọrụ
N'ọnwa gara aga, Faye gbara afọ 44 meriri na ntuliaka e mere dịka o nwetara pasent 54 vootu a tụrụ merie Amadou Ba.
N'ụbọchị Fraide, ọgbakọ Iwu ala mba ahụ kwuru na o mereriri n'ezie..
A họpụtala Bassirou Diomaye Faye dịka onyeisiala ọhụru mba Senegal
Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na mba Senegal akpọpụtala Bassirou Diomaye Faye dịka onye meriri na ntuliaka ọkwa onyeisiala mba ahụ e mere n’ụbọchị Sọnde.
Faye bụ onye pati na-anọghị n’ọchịchị ji vootu pasentị 54.28 merie Amadou Ba ji aha pati nọ n’ọchịchị nwetere vootu pasentị 35.79.
Ọtụtụ ndị so zọọ ọkwa malitere ikele Faye ma n’ikwete na mmeri ya n’ime awa ole ma ole e mechara ntuliaka ahụ.
Faye sepụtara isi n’ịzọ ọkwa ahụ mgbe Ousmane Sonko a ma ama n’ịma ọchịchị gọọmentị aka rịturu n’ịzọ ọkwa ahụ maka ebubo nakwa ikpe ndị a mara ya.
A tụrụ Faye mkpọrọ ihe chụwara otu afọ mana e mechara tọhapụ ya site na mgbaghara onyeisiala.
O ji naanị ụbọchị itoolu mee njem achụmnta vootu ya tupu e mee ntuliaka ahụ, mana ugbua ọ bụrụla onye a họpụtara ka onyeisiala mba Senegal ma bụrụkwa onye kachasị obere n’afọ a ga-ahọpụta ịbụ onyeisiala na mba Afrịka.
Faye ekweela nkwa ibuso mpụ na nrụrụaka agha n’ogogo ọbụla ma gboo nsogbu enweghi ọrụ na ọnụ ahịa obibi ndụ nke dị elu.
Ihe ruru mmadụ nde 7.3 n'ime mmadụ nde 18 denyere aha ịtụ vootu ga-apụta họpụta onyeisiala ọhụrụ mba Senegal, dịka otu nhazi ntuliaka mba Senegal si wee kwuo.
Onye ọbụla merirị na ntụlịaka ahụ ga-abụ onyeisiala nke ise kemgbe mba ahụ nwere onwe ha n'aka ndị ọcha n'afọ 1960
Onyeisiala mba ahụ bụ Macky Sall agaghị eso zọ ya bụ ọkwa.
Cheta na Sall n'onwe ya bughariri ya bụ ntuliaka e kwesịrị inwebu n'ọnwa Febrụwarị
Mana ndị mmadụ katọrọ ya maka nke a. Mana All na akọwa na ya mere ịhe dị na ịwụ.
Ụlọikpe ukwu mba ahụ ke kpebiri na okwu ya dara iwu ala ahụ nke mere ka etiyachi ntuliaka ahụ taa bụ ụbọchị 24 nke ọnwa Maachị.
Ụfọdụ na sị na ha ahụghị ohere ịtụ vootuna agbanyeghị na ha mere njem bịa ọdọ ntuliaka
Ụfọdụ ndị na-atụ vootu na mpaghara ụfọdụ na Senegal ekwuola na ha ahụbeghị ohere ịtụ vootu ha.
Otu nwamadị gwara BBC okwu sị na ọ gbara ụgbọ iji bịa mana n'ihe dịka elekere atọ n'ehihie, ya na ndị agbataobi ha.
Ụmụafọ mba Senegal ga-apụ n’ama n’ụbọchị 24 Maachị, 2024 ibinye aka ma họpụta onyeisiala ha nke ugboro ise. Mmadụ 19 na-azọ ọkwa ọkwa ịbụ Onyeisiala mba Senegal.
Nke a bụ mbụ ụdịrị ọnụọgụgụ mmadụ ole a ga-apụta n’ịzọ ọkwa ahụ. Mmadụ ise zọrọ ya n’afọ 2019, 14 na 2012, 15 na 2017 na mmadụ asatọ n’afọ 2000 na 1993.
Ntuliaka nke afọ a ga-abụ ihe a tụghị anya ya maka na ọ bụ mbụ onye bụ onyeisiala esoghi na-azọ ọkwa ahụ.
Onyeisiala Macky Sall nọọrọ n’ụbọchị 23 Julaị, 2023 kwuru na ọ gaghị azọ ọkwa ọchịchị nke ugboro atọ na-agbanyeghi na iwu kwadoro ya ịpụta.
Kedụ mgbe a ga-eme ntuliaka a?
E hiweburu ntuliaka ahụ na 25 Febụwarị 2024 tupu a gbatịa ya, ugbua ọ ga-abụzi n’ụbọchị 24 Maachị, 2024. Nke ga-abụ nke ugboro 12 kamgbe mba kwụụrụ onwe ya n’afọ 1960. Mmadụ nde 7.3 debanyere aha ịtụ vootu
Kedụ ndị ga-azọ ọkwa a dị elu?
N’ụbọchị 20 Jenụwarị ka kọmitii ndị ọkaiwu iwu kwadoro wepụtara aha mmadụ 20 ga-azọ ọkwa onyeisiala mba Senegal n’ụbọchị 24 Maachị, 2024.
Mana otu onye bụ Rose Wardini mechara sepụ aka n’ịzọ ọkwa ahụ n’ụbọchị 19 Febụwar, maka nghọtahie banyere ịbụ nwafọ mba abụọ (Senegal na France), nke mere o jiei bụrụ mmadụ 19 na-azọzi ọkwa a.
Ndị a gụnyere; Anta Babacar Ngom, Amadou Ba, Boubacar Camara, Cheikh Tidiane Dieye, Déthié Fall, Daouda Ndiaye, Habib Sy, Khalifa Sall, Idrissa Seck, Mame Boye Diao, Mohamed Boun Abdallah Dione, Aliou Mamadou Dia, Malick Gackou, Aly Ngouille Ndiaye, Mamadou Lamine Diallo, Serigne Mboup, Pope Djibril Fall, Bassirou Diomaye - The Best Of Bassirou Diomaye, Thierno Allassane Sall