Etu ndị ọrụ nchekwa mba Greece sị tụnye ụmụaka Afrịka na ndị ọzọ n’ime osimiri

Ngụkọ na nyocha nke BBC mere gosiri na e boro ndị ọrụ nchekwa mba Greece na arụ ọrụ n’osimiri Mediterranean ebubo na ha gburu ọtụtụ ndị mmadụ na-aga njem ọkacha ndị sị mba Afrịka.
Ọtụtụ n’ime ndị ahụ e gburu gunyere ụmụaka.
Mana ndị ọrụ nchekwa na osimiri mba Greece gọrọ ma sepu onwe ha n’ebubo ahụ nakwa nke nyịrị ya.
BBC nyopchara akụkọ iri na ise ebe eboro ụdịrị ebubo ahụ ebe egburu mmadụ ịrị anọ na atọ bụ nke ha sị n’ozị sitere na ọnụ ndị ọrụ nchekwa ọsịmịrị nke ndị Turkey, ụlọ mgbasa ọzị dị n’mba ahụ na ndị ọrụ onyemaka.
Nyocha ahụ jikwa akụkọ ndị bịara gba aka ebe, ndị hụrụ ihe mere ma ọ bụ ndị ọ metutara.
Ụfọdụ n'ime ahụ a gbara ajụjụ ọnụ kwuru na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa mba Gris tụbanyere ha n’ime osimiri.
Otu onye n’ime ndị ha gbara ajuju bụ onye Cameroon kwuru na oge ya batara Samos mpaghara Gris na ọ bụ ndị uweoji na mba ahụ jidere ya, na onye ọzọ sị mba Ivory Coast nwere ranye ha n’aka ndị ọ bụ ọrụ ha ichekwa osimiri ahụ.
“Ha bu ụzọ jide onye nke Ivory Coast, kepu ya aka na azụ were tubanye ya n’ime mmịrị. Nwoke Ivory Coast ahụ bere akwa ma rịọ ha sị “zọpụta m, achọghị m ịwụ...ọ mechere ọsịmịrị elo ya”.
Nwoke Cameroon ahụ mechere kọwa na ndị ọrụ nchekwa Gris tiri ya ihe ka anụmanụ. Ka ha kụchara ya ihe ha akwabanye ya n’im osimiri na enweghị ihe nchekwa ndu. Ya jisike gwuo mmịrị rụọ ebe ndị Turkey huru ya ma zọpụta ya.
Onye ọka iwu nke nwoke Cameroon ahụ na akpọ oku ka gọọmenti mba Gris mee nyocha ma kpe ndị aka ha dị n’ime ya ikpe igbu ọchụ.
Mana onye ọzọ bụ Mohamed bụ onye mba Syria kọwara ka ndị ọrụ nchekwa osimiri Gris ahụ sị jide ya na ezinaulo ya wee tinye ha n’ihe dịka ụgbọmmịrị na adaghị mma bụ nke buru ha gaa na Turkey.
“Ha hụrụ oge mmịrị bidoro na elo anyị .... Ha nụrụ oge anyị na ebe akwa ka ha nyere anyị aka mana ha hapụrụ anyị gbalaga”
“Nwa nwanne nna m bụ ihe bụ ụzọ nwụọ. E tu a ka ụmụaka sị anwụ otu otu tụpụụ anyị nwanne nna m efụọ. Na oge chị gị efo, ụmụaka rụrụ asatọ anwụọla”
“Nwa m nwụrụ n’ụtụtụ... ka ọ wụchara ka ndị ọrụ nchekwa ọsịmịrị n’Turkey bịara”

Mana BBC gosiri Dimitris Baltakos bụ onye bụbụ onye isi na ngaraba ọrụ nchekwa osimiri mba Greek. Ọ gọrọ ma hara ịkwụ ihe obula gbasara ihe onyonyo e gosiri ya ma kwuo na ndị ọrụ ha adaghị ada ịwụ.
Dimitris amaghị na kamera ka na ese ihe oge ọ pụrụ n’irọ ebe ọ na gwa mmadụ ọkwụ ma sị “Ọ kwa onwebeghi ihe m gwara ha? Mana ọ dọrọ anya. ọ bụghị ihe nka n’ụzụ. Amaghị m ihe mere ha gi eji mee udịrị ihee dị etu ahụ n’ehihe.... Nke a bụ ịda ịwụ. Ọ bụ ịda ịwụ mba ụwa niile”.
Ka BBC zịgara ndị ọrụ nchekwa osimiri na mba Gris ihe ha hụrụ, ha kwuru na ndị ọrụ ha na-arụ ọrụ dị ka ndị maara ihe, ma buru ịwụ na ikike dịrị mmadụ n’obi nakwa etu iwu mba ụwa sị kwado.











