Ihe atọ Vladimiri Putin ji maka ya ga hụ Kim Jong Un

Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin agaala Nọt Koria.
Nke a bụ oge mbụ Putin na-aga na Pyongyang n'ime afọ 24.
Oge ikpeazụ ọ gara Nọt Korịa n’afọ 2000, ọ bụ Kim Jong Il bụ nna onyeisiala ugbua nọ n'ọchịchị.
Putin nabatara ọkpụkpọ oku Kim Jong Un kpọrọ ya n'ọnwa Septemba gara aga ka ha mechara nzuko na Vostochny Cosmodrome dị na Rọshịa.
Nzukọ ya na-egosipụta ọganihu dị na mmekọrịta dị n’etiti mba abụọ ahụ.
Ọbịbịa Putin na-adọta uche mbaụwa maka nkwekọrịta ndịagha ha nwereike inwe na nzukọ ahụ.
A na-atụkwa anya na ọbịbịa Putin ga-eme ka mmekọrịta dị n'etiti omenala, ọrụ ugbo, akụnaụba na ihe ndị ọzọ.
Ihe ọzọ dị mkpa a ga-atụle bụ ka Putin ga-esi leba anya na-mgbanwe ngwaagha na nuklia nke Nọt Korịa.
Kim Dong-yup, onye ọkammụta mahadum Nọt Korịa dị na Saụt Korịa, na-ekwu na nzuko ahụ nwere ike ịbụ ihe ga-ebute ezi mkparịtaụka ga-amịta mkpụrụ.
Ndịagha: Russia chọrọ ngwaagha, North Korea chorọ teknụzụ

Ka Russia na-aga n’ihu na-awakpo Ukraine ihe karịrị afọ abụọ, mmekọ dị n’etiti North Korea na Russia na-esiwanye ike ebe ha na-enyere onwe ha maka ngwaagha.
Nam Sung-wook, onye prọfesọ na ngalaba Unification na Diplomacy na Mahadum Korea, na-ekwu na isi okwu nzukọ a ga-abụ "ka a ga-esi bute ngwaagha North Korea a ga-enye Russia."
A na-atụ anya na North Korea ga-achọ ihe karịrị naanị nri na mmanụ ụgbọala maka inye Russia ngwaagha.
Dịka mba nwere nkà na ụzụ mbara igwe, enyemaka Russia ga-adị mkpa maka North Korea iji nwetakwuo satịlaịtị.
A na-atụkwa anya na North Korea ga-achọ nkwado Russia iji meziwanye satịlaịtị nyocha ya na-ịmepụta ụgbọmmiri nuklia.
Nam kwenyere na mkparịtaụka ọ bụla gbasara ngwaagha nuklia agaghị apụta ihe.
Akụnaụba: Russia chọrọ ọrụ, North Korea chọrọ ego igwe

Kang Dong-wan, onye prọfesọ nke sayensị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Mahadum Dong-A, na-ekwu na ihe North Korea chọrọ n’aka Russia ugbu a bụ "ego igwe n'aka ndị ọrụ". Nke a na-ewelite ohere ka North Korea zigakwuo ndị ọrụ na Russia.
N'aka nke ya, Russia chọrọ ndị ọrụ iji wughachi ụlọ na akụrụngwa nke agha mebiri emebi, ma mee ka akụnaụba ya dịghachi ndụ.
Mana mmachi nke UN Security Council megidere North Korea machibidoro ndị ọrụ ya ịrụ ọrụ na mba ofesi ma nye iwu ka akpụghachi ndị ọrụ North Korea niile site na 22 Disemba 2019.
Kedụ ihe dị iche n’ọbịbịa Putin bịara afọ 24 gara aga?

Afọ 2000 bụ oge mbụ onyeisiala Putin gara Pyongyang wee zute onye ndu North Korea Kim Jong Il - nzukọ mbụ dị n'etiti Russia na North Korea kemgbe njedebe nke Agha ‘cola war’.
N'oge ahụ, Rọshịa na-achọ ịmaliteghachi na ọkwa mbaụwa, ebe North Korea chọrọ ịbawanye ndị ha maa n’ụwa ndị ọzọ.
Ndị isi abụọ ahụ nwere nkwupụta nke gosipụtara nkwado ha iji nyere onwe aka maka ngwaagha, nkwekọrịta enyi na imekọ ihe ọnụ.
N'ihe gbasara nkwado ndịagha, nkwekọrịta ahụ kwuru na mba abụọ ahụ ga-akpọtụrụ ibe ha ozugbo agha dara.
Dịka etu mmekọrịta North Korea na Russia dị na nso nso a, ndị ọkachamara na-eche na enwere ike ịmegharị nkwekọrịta ahụ nke.












