Ihe mere m jiri hụ egwu anya nke ukwuu - Otiegwu KCEE

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

N'agba abụọ na mkparịtaụka anyị na otiegwu KCEE, ọ kọwaara anyị ụfọdụ ihe bụ ahụmihe ya dịka ọ na-eto n'Ajegunle.

O kwuru etu ịgba bọọlụ si masị ya nakwa etu ya na onye tu ya bụ Presh si merie 'Star Quest' n'afọ 2002.

Ihe ọzọ o kwuru bụ etu o si malite iso egwu n'ihi ụdịrị ọrụ nna ya a-arụ.

Ude ya ka na-ede n'ihe gbasara itiegwu maka etu o si agbanwe ụdịrị egwu o na-eti kwa mgbe kwa mgbe.

Ọ kọwara ihe mere o ji ekpuchi ihu ya nakwa akụkọ ndị so egwu ya 'Ojapiano' na-efegharị ugbua.