Nkwa Onyeisiala Tinubu kwere maka mmanụ ụgbọala na ihe ndị ọzọ nakwa ihe o mere

Onyeisiala Bola Tinubu mgbe ọ na-achụ nta vootu

Ebe foto si, ChannelsTv

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ndị mmadụ tetara n'ụtụtụ ụbọchị Wenzde were chọpụta na ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala arịala elu ọzọ.

Nke a mere n'agbanyeghi na ụlọọrụ NNPC ekwuputaghi ọnụ ọhụrụ kama na ndị mmadụ hụrụ mgbanwe a mgbe ha gara ịzụ ya n'ọdọ mmanụ ụgbọala.

Nke a ga-eme ya ugboro anọ ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala na-agbali elu naanị n'afọ 2024.

O bu ụzọ malite na N668 n'ọnwa Jenụwarị, e si ebe ahụ bugo ya na N897 n'ọnwa Sepụtemba bụkwa ebe o si rịa ruo N998 n'ọnwa Ọktoba ma mechaa bụrụ N1,030 ugbua dịka ọnụ ahịa si kwụrụ na Lagọs steeti.

Buru n'obi na ọnụ ahịa na steeti dị icheiche karịrị nke ndị akpọpụtara na Legọs.

N'ihi nke a ka anyị tulee nkwa ndị onyeisiala Tinubu kwere mgbe ọ na-achụnta vootu na etu ihe si kwụrụ ugbua.

Anyị ga-etinye anya na nkwa anọ bụ ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala, nchekwa, ọkụ latrik nakwa akụnaụba obodo.

Ọnụ mmanụ ụgbọala

Mgbe onyeisiala Tinubu meriri ntuliaka imeulo APC

Ebe foto si, APC

Mgbe Onyeisiala Tinubu nọ njem achụmnta vootu ya n'afọ 2022, ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala ka bụ N175.

O kwere nkwa ịbutuso ya mgbe ọ na-ezi ndị nkwado ya ozi n'Ogun steeti.

Mana ị lee anya ihe na-aga ugbua, e buliela ya ọnụ ahịa ya bụ mmanụ ụgbọala ugboro ise kemgbe ụbọchị e duru ya n'iyi ọrụ bụ May 29 2023.

Mgbe ọ na-enye ozi nnabata ya, o kwuru na gọọmentị ewepula ụgwọ subsidy na-ejitu ọnụ mmanụ ụgbọala nke mere ka o jiri ike si na N175 rue N540 naanị n'otu abalị.

Ọkụ latrik

Ọdọ ọkụ latrik na Naịjirịa

Ebe foto si, TCN

N'akwụkwọ nkwa o kwere mgbe ọ na-achụ nta vootu, Tinubu kwuru (gụnye ihe ndị ọzọ) na ọ ga-awụlite ọnụogụgụ ọkụ latrịk Naịjirịa na-emepụta.

Mana rue ugbua, o nwebeghi ihe gosiri na Naịjirịa awụlitela ọnụọgụgụ ọkụ latrik ọ na-emepụta.

Kama igwe ọkụ latrik kachasị na Naịjirịa bụ National Grid adaala ihe karịrị ugboro iri na abụọ kemgbe o banyere n'ọkwa.

Nchọpụta nke ụlọorụ Punch mere gosiri na Naịjirịa ebitela ego ugboro iri ruru $4.36bn n'aka ụlọakụ ụwa kemgbe afọ iri gara aga iji wulite nsogbu ọkụ latrik na Naịjirịa.

N'otu aka ahụ, ọ bụghị ego ahụ niile ruru Naịjirịa aka mana gọọmentị etiti etinyela nnuwku ego n'ịwụlite ya bụ ihe.

Akụnaụba obodo

Ndị na-eme ngagharịiwe