You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Willie Obiano: "Esi m n'ụra teta ma na-anụ akụkọ kwuru na anwụọla m"
Willie Obiano bụbu Gọvanọ Anambra Steeti ekwuola na ọ dị ndụ, na ahụ gbasiri ya ike na ọ nwụghị anwụ.
Obiano kwuru nke a n'ozi o wepụtara n'akara Facebook ya n'ụbọchị Fraịde 14 Nọvemba 2025, mgbe akụkọ na-efegharị banyere ọnwụ ya.
O kwuru na o si n'ụra teta ma na-anụ akụkọ banyere ọnwụ ya mana ka o mee ka o doo onye ọbụla anya na ahụ siri ya ike.
"Ndị Anambra nke m, ndị enyi m na ndị ihe m na-amasị, etetara m n'ụra na-anụ akụkọ banyere ahụike m.
"Ka m jiri aka m mee ka o doo gị anya; adị m ndụ, ahụ siri m ike, site n'amara Chineke ana m eme ọfụma.
"Ọ bụ ihe mwute na ụfọdụ ndị na-enweta aṅụrị n'ikesa akụkọ ụgha, nke a maghị ihe bụ uru ha na ya. Mana anyị ga na-arị elu karịa akụkọ ụgha ha."
Obiano gara n'ihu kelee ndị niile kpọrọ ya oku n'ekwentị ma ndị ziteere ya ozi ma kwuo ka ha aṅala ntị n'akụkọ ụgha ahụ.
Ihe onye rụburu ọrụ n'okpuru Obiano kwuru
"Willie Obiano bụbu Gọvanọ Anambra Steeti anwụbeghi, ọ ka dị ndụ"
Nke a bụ ihe Uche Nworah rụrụ ọrụ n'okpuru Obiano, mgbe ọ bụ Gọvanọ Anambra Steeti kwuru.
Ọ sị na ọ kpọrọ otu onye ezinaụlọ Obiano bụ onye nọ ya nso na mba Amerịka, na onye ahụ kwuru na Willie Obiano dị ndụ na o nweghi ọnwụ ọbụla ọ nwụrụ.
Nworah gara n'ihu depụta nke a n'akara Facebook ya kwuo "Onyeisi anyị Willie Obiano bụbu Gọvanọ Anambra Steeti dị ndụ, ọ nwụghị anwụ. Biko egela ntị n'ihe na-efegharị na soshal midia."
Uche Nworah bụ onyeisi ụlọọrụ mgbasaozi Anambra Broadcasting Service, mgbe Obiano nọ n'ọchịchị.
Nke a na-abịa dịka akụkọ na-efegharị na soshal midia na Obiano anwụọ.
Akụkọ a malitere ifegharị mgbe ndị ntaakụkọ Sahara Reporters bipụtara akụkọ na Obiano nwụrụ n'ụlọọgwụ dị n'obodo Lọndọn n'ihi ọrịa obi.
Willie Obiano bụ nwafọ obodo Aguleri dị n'okpuruọchịchị Anambra East.
A mụrụ ya n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Ọgọstụ, afọ 1955.
Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Lagos na ngalaba ngụkọ ego (Accountancy)
Ọ chịrị dịka Gọvanọ Anambra Steeti afọ asatọ malite n'afọ 2014 ruo afọ 2022.
Kamgbe ọ rịturu n'ọkwa ọchịchị, ụlọọrụ na-ebuagha megide mpụ na nrụrụaka ego bụ EFCC n'ịchafụ na-enyocha ya n'ebubo iri ego dị ijeri naịra anọ (N4bn).