Ncheta nwereonwe afọ 65: Obi, Atiku adọọla aka na ntị maka ọnọdụ Naịjirịa

Aha onyonyo, Etu ndị Naịjirịa si eme ncheta nwereonwe afọ 65
Ncheta nwereonwe afọ 65: Obi, Atiku adọọla aka na ntị maka ọnọdụ Naịjirịa
Atiku Abubakar na Peter Obi

Ebe foto si, Atiku Abubakar na Peter Obi / FB

Nkọwa foto, Atiku Abubakar na Peter Obi

Mmadụ abụọ a maama na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa bụ Peter Obi nakwa Atiku Abubakar ejirila emume ncheta nwereonwe mba Naịjirịa nwere dọọ aka na ntị banyere ọtụtụ ihe ha kwuru na-eme na kwesiri ịkwụsị ugbua.

Ha abụọ ji akara soshal mịdịa ha nwere bipụta ozi ekele maka ncheta nwereonwe Naịjirịa ebe ha nọ kwuo uche ha.

Ha tinyere ọnụ n'ihe dị icheiche ọkachasị etu ọnọdụ akụnụba, nchekwa, nakwa usoro ọchịchị si dị ugbua dịka ha kenerele ụmụ Naịjirịa maka ịgba afọ iri isii na ise.

Peter Obi

Ebe foto si, Peter Obi/FB

Nkọwa foto, Peter Obi

Okwu Peter Obi na nkenke

Peter Obi ji otu ndọrọndọrọ ọchịchị Lebọ patị zọọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023 kwuru na orileanya dị na Naịjirịa ga-adị mma ọzọ n'agbenyeghị ihe cheere ya aka mgba.

N'okwu ya "taa kwesiri ịbụ ụbọchị aṅụrị na ncheta ụbọchị ndị nnanna anyị ṅụrụ ọgụ ma zọpụta Naịjirịa n'aka ndị ọcha".

"N'agbanyeghị ihe iche aka mgba, Naịjirịa ka nwere ntụkwasị obi na ihe ga-adị mma, mana kamgbe afọ iri garaaga n'ọchịchị ndị otu patị APC , mpụ, nkewa, ịkpa oke, ọchịchị akaike na enweghị ikike dịara mmadụ emetọọla Naịjirịa".

Obi kwuru na ugbua "Gọọmenti na-ara nnukwu ụtụisi nke na-akpagbu ndị ji ego achụ nta ego nakwa ọtụtụ ụmụ amaala Naịjirịa ebe ndị nọ n'ọchịchị na-ebi ndụ mmefu nnukwu ego".

Obi katọrọ "akatamkpo ego gọọmenti ji zụọ ụgbọelu, ụgbọ mmiri nakwa nnukwu ụgbọala ọhụrụ" nke o kwuru na "o zuruoke igbanwe ọnọdụ ngaraba ahụike nke nta na Naịjirịa".

"Gọọmenti na-ebite ego ha na-emefu agharaaghara ebe ọnọdụ nchekwa na-adị njọ. Ụmụ Naịjirịa na-atụ egwu ime njem, ebe ndị ntọ na-atọrọ igwe mmadụ na-anapụ ha akatamkpo ego".

Mana n'ihe ndị a niile Peter Obi kwuru na "Naịjirịa ka nwekwara ohere ịbụ nnukwu mba. Anyị agaghị enwepụ uche n'ime ka Naịjirịa buru obudo dị mma ma nwee ezi nchekwa".

Ihe Atiku Abubakar kwuru maka Naịjirịa

Atiku Abubakar

Ebe foto si, Atiku Abubakar/FB

Nkọwa foto, Atiku Abubakar

Atiku Abubakar bụ onye ji otu ndọrọndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party (PDP) zọọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023 kwuru sị "ọ bụ ajọ ihe na mba Chukwu goziri nwere mmadụ na akụnụba ka e nwedere ọtụtụ ala ka ha bụrụ ndị arịrọ nakwa ndị enweghị ebe obibi n'ala nna ha".

"Gọọmenti maara ihe na-eme ka nchekwa na ọ dị mma mba ha bụrụ isi sekpụntị n'ọchịchị ha mana ihe anyị nwere bụ ọchịchị na-amaghị ihe ọbụla maka ọdị mma ụmụamaala."

"Agụụ na-egbu ụmụ Naịjirịa, ndị ojiegbe na-amwakpo ime obodo na-egbu igwe mmadụ mana Onyeisiala Tinubu na ndị ọchịchị achọghị ịmaa".

"Ụtọ ọchịchị onye kwuo uche ya dị na ntuliaka. Ndị a na-akpagbu taata, ndị a gbara nkịtị ga-eji iwe tọọ vootu ma kpochapụ gọọmenti ha na-enweghị ntụkwasịobi"

Ọ gara n'ihu kwuo na "Naịjirịa bụ mba kacha n'Afrịka mana ọ na-aga ije nwanyọọ nwanyọọ maka ajọ ndị ọchịchị".

Atiku kwuru na Naịjirịa ka ga-ebili mgbe ndị ọchịchị maara ihe ha na-eme banyere n'ọkwa ọchịchị".

Etu ụmụafọ Naịjirịa si eme ncheta ụbọchị nwereonwe afọ 65

Ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa ekwuola ebumnobi ha dịka Naịjirịa na-eme emume ncheta ụbọchị nwereonwe ya.

Ụfọdụ ndị Naịjirịa BBC News Igbo gbara ajụjụ ọnụ, kwuru ihe dị iche iche ha chọrọ ịhụ dịka Naịjirịa na-eme ncheta ụbọchị nwereonwer afọ 65.

Ha kpọrọ oku ka gọọmenti gbaa mbọ wulite ezi ọnọdụ nchekwa, mepụta ọrụ nye ndị ntoroọbịa, wulite ọnọdụ agụmakwụkwọ ma mee ka nri oriri dị ọnụala n'ahịa.

Ndị ọzọ kwuru na ha chọrọ ka gọọmenti wulite ezi ịdị n'otu na Naịjirịa iji hụ na e nwere ọganihu n'obodo.

Cheta na Ọktoba 1 afọ ọbụla bụ ụbọchị Naịjirịa ji echeta nwereonwe ya n'aka mba Briten nke mere n'ụbọchị Satọde Ọktoba 1, 1960.

Kemgbe ahụ, Ọktoba 1 afọ ọbụla na-abụ ụbọchị ezumike nye ndị ọrụ na ụmụakwụkwọ Naịjirịa iji nye ha ohere zuo ike ma tulee uche banyere nwereonwe Naịjirịa.

Ọ bụkwa ụbọchị Onyeisiala Naịjirịa ji agwa ndị Naịjirịa okwu ma kwuputa ọtụtụ uru nwereonwe a baara Naịjirịịa tinyere ihe dị iche iche gọọmenti na-eme iji cheta ụbọchị a dị oke mkpa.

Ihe Onyeisiala Bola Tinubu kwuru n'ozi ya

Nke a bụ ugboro atọ Onyeisiala Tinubu na-agwa ndị Naịjirịa okwu dịka Onyeisiala Naịjirịa kemgbe ọ banyere n'ọchịchị n'afọ 2023

Ebe foto si, Bayo Onanuga/X

Nkọwa foto, Onyeisiala Bola Tinubu na-achị Naịjirịa

Onyeisiala Bola Tinubu nọrọ taa bụ Ọktoba 1, 2025, gwa ndị Naịjirịa okwu dịka a na-emerube emume ncheta nwereonwe nke afọ iri isii na ise nke Naịjirịa.

N'okwu ya, Onyeisiala Tinubu kwuru na Naịjirịa emeriela ihe niile na-echere ya aka mgba ma kwuo na nsogbu Naịjirịa agwụla.

O kwuru na kemgbe afọ afọ iri isii na ise Naịjirịa nweere onwe ya, n'agbanyeghị na ọtụtụ ihe cheere Naịjirịa aka mgba nke gụnyere agha, ọchịchị ndịagha nakwa nsogbu ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche, Naịjirịa gara n'ihu merie ihe ndị a niile.

Onyeisiala Bola Tinubu yi uwe ojii ma kpuru okpu dịka ọ na-ekwu okwu

Ebe foto si, Bola Tinubu/Facebook

Nkọwa foto, Onyeisiala Bola Tinubu banyere n'ọchịchị na Mee 29, 2023 dịka o nwetara mmeri na ntuliaka e mere n'afọ ahụ

Ọ gara n'ihu gụpụta ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-echere Naịjiịrịa aka mgba ma kwuo ihe e nwereike ime iji gbochie ya.

N'okwu ya "Oge eruola mgbe anyị ga-arụ okporoụzọ anyị, rụọ ụlọakwụkwọ ebe ụmụaka anyị ga-aga nakwa ụlọọgwụ ebe a ga-eleta ndị ọrịa. Ọ dị mkpa ka anyị mapụta atụmatụ ndị a ga-abara ụmụ Naịjirịa uru n'ọdịnihu."

O kwuru na ọkụ latrik bụkwa nsogbu ọzọ Naịjirịa nwere tinyere enweghị ezi ọdọ ụgbọmmiri na-ebubata ngwaahịa, ọdọụgbọelu na-etozughị etozu.

O kwuru na ihe ndị a dị ugbua maka na ndị ọchịchị emeghị ihe ha kwesiri ime n'oge gara aga.

Onyeisiala Tinubu mere ka o doo anya na gọọmenti ya amalitela ịgbanwe ajọ ọnọdụ ndị a ma kwuo na ụfọdụ n'ime ha bụzi ihe mgbe ochie.

Ọ kpọrọ oku ka gọọmenti gaa n'ihu n'ọrụ ya iji hụ na Naịjirịa meriri nsogbu ndị a fụdụrụ.

Onyeisiala Bola Tinubu kwuru na ya nyere iwu ka a kagbuo mmemme ngosi ndịagha chọrọ ime iji cheta ụbọchị nwereonwere a.