Ndị okenye ekwesịrị ịṅụ mmiri ara nwaanyị? Lee ihe ndị ọrụ ahụike kwuru
Oge ụfọdụ a na-akpọ ya 'mmiri ọlaedo'. Ụfọdụ ndị ọkachamara kwuru na ọ na-enye 'ikike dị egwu.'
Ndị nchọcha sayensị kwetara na mmiri ara na-arọpụta ihe ndị na-edozi ahụ na akụrụngwa ndị na-akwalite uto nwata. Mana ụfọdụ ndị okenye na-adabere n'ikike dị etu a o nwere ịrọpụta ọtụtụ uru.
Jameson Ritenour dị afọ 39 ma bụrụ nna mụrụ ụmụ atọ ṅụrụ mmiri ara nke mbụ ya oge nwunye ya bụ Melissa na-enye nwa ara ma na-agbapụta mmiri ara ndị ọ chọghị.
Etinyere m ya n'ihe ọṅụṅụ m, ọ bụnadị ka nwunye m chere na e nwere etu ọ dị," ka ọ gwara BBC.
Jameson nwere mmasị ịchọpụta uru dị n'ime mmiri ara oge o kirichara onyonyo YouTube ebe otu onye na-ewulite ahụ kwuru maka uru dị n'ịṅụ ya.

Ebe foto si, Jameson Ritenour
Ịṅụ mmiri ara nwunye ya bụụrụ ihe Jameson na-emekaarị: ọ ga-aṅụrịrị akpa abụọ kwa ụbọchị nke arụ otu n'ime ha ruru ounce asatọ.
"Ọnọdụ ahụ m mara ezigbo mma oge ahụ," ka ọ gwara BBC.
"O na-enyere m aka iwulite akwara m. Ana m ata ahụ dịka m na-agbakwunye ihe dịka akwara 5% n'ime ihe dịka izuụka asatọ."
Jameson kwuru na ya enweghị ike cheta oge ọ rịara ọrịa maọbụ nwee oyi oge ahụ ọ na-aṅụ mmiri ara nwunye ya.
"Achọrọ m ito dịka nwata ma hie ụra dịka nwata, ọ bụ ya ka m jiri kpebie na m ga na-eri nri dịka nwata," ka o kwuru.
Ịzụ mmiri ara n'ịntaneetị adịghị mma
Ndị nchọcha sayensị ekwuola na e nweghị ihe akaebe sayensị kwuru na ịṅụ mmiri ara bara uru ọbụla maka ahụ okenye.
Mana ụfọdụ ndị ọkachamara kwuru na o nwekwara ike ịba uru.
"O nwere ọtụtụ protein, akwara nwata na-aka ngwangwa mana ọ bụ ihe ndị na-ewulite ahụ ha chọrọ," ka Dr Lars Bode, onye tụziaka mbụ na Human Milk Institute dị na University of California, San Diego dị n'Amerịka kwuru.
Mana Dr Bode nyere ndụmọdụ ka a kpachara anya ugbua, dịka ụfọdụ mmadụ si n'aka ndị amaghị azụta mmiri ara na Facebook, Craigslist na Reddit.
"That milk is untested, and there are significant health risks," warned Dr Bode. "It can be a vector for diseases like HIV or hepatitis."
"E nyochaghị mmiri ara ahụ dịka ọ pụrụ ibute ọghọm nke ahụike mmadụ," ka Dr Bode dọrọ aka na ntị. "E nwere ike isi na ya bute ọrịa dịka HIV na ịba anya odo."
Mmiri ara pụrụ ịdị mma dabere n'ọnọdụ ahụike onye nwe ya ma bụrụkwa nke a pụrụ iji fesaa ọtụtụ ọrịa.
Ụfọdụ ụmụnwaanyị nwereike gbapụta mmiri ara ebe adịghị ọcha dịka nke a pụrụ imetụta mmiri ara ahụ.
Nchọcha Nationwide Children's Hospital dị n'Amerịka mere na 2015 chọpụtara na n'ime mmiri ara 101 a zụtara n'ịntaneetị maka nchọcha ahụ, 75% n'ime ha nwere akụrụngwa ọjọọ adịghị mma maka ahụ mmadụ ebe 10% bụ ndị a gwakọtara mmiri ara ehi maọbụ nri nwata.

Ebe foto si, Jameson Ritenour
Oge Jameson na nwunye ya bụ Melissa kewara, ọ naghị enwetazi mmiri ara e chekwara n'igwe njuoyi, ọ malitere ịzụ ya n'ịntaneetị.
O kwuru na ọ maghị gbasara ihe izendụ dị na mmiri ara ndị adịghị mma.
"Azụtara m ya n'aka onye m amaghị n'ịntaneetị mana e mere m nnyocha na Facebook, ọ dị m ka onye enweghị nsogbu," ka Jameson kwuru. "Ọ bụ ya mere m ji sị ka m nwaa."
"Ndị mmadụ nwere ka ha si ele m anya n'ihi na onye niile maara na mmiri ara bụ maka ụmụaka. Mana ọ dịghị njọ ka ndị mmadụ siri chee."

Ebe foto si, Getty Images
Kedụ maka ụmụaka ndị chọrọ ya?
"Agaghị m agwa okenye ka ọ ṅụọ mmiri ara," ka Dr Meghan Azad, onye na-eme nnyocha gbasara etu mmiri ara mmadụ si akwalite ahụike ụmụaka kwuru.
"Echeghị m na ọ ga-ebutere ha ọghọm mana ọ pụtụrụ ibutere ụmụaka ọghọm, bụ ndị chọrọ mmiri ara, dịka ụmụaka a mụrụ n'oge erughị eru."
Dr Bode kwuru na e kwesịrị inyepụ mmiri ara mmadụ ndị a na-achọghị maka ụmụaka ndị chọrọ ya karịa ire ya maka inweta uru.
"Anyị enweghị mmiri ara zuru oke iji zụọ ụmụaka ndị chọsiri ya ike. Mmiri ara nwere akụrụngwa ndị pụrụ ịgwọ ọrịa dị iche iche n'ahụ ụmụaka a mụrụ n'oge erughị eru. Ọ pụrụ ịzọ ndụ."
Dr Azad kwuru na ndị nne ụwa na-atụ n'ọnụ chere na ha pụrụ ịkpata ego site n'iresị ndị na-ewulite ahụ ha mmiri ara n'ịntaneetị. Nke ahụ nwereike ịkwalite ndị okenye ịzụ mmiri ara.
Mana Jameson kwuru na ikpe amaghị ya.
"Ndị mmadụ eboola m ebubo ịgba ụmụaka ọnụ. Mana ọ dịghị ka m kwụ n'ọnụụzọ ụlọọgwụ na-anara ndị nne mmiri ara ha niile!"
O kwuru na ụmụnwaanyị karịrị 100 abịakwutela ya ma chọọ iresị ya mmiri ara ha ndị na-agbafu agbafu.
Uru ndị a pụrụ irite n'ime ya
E mebeghị nnchọcha rijuru afọ gbasara mmiri ara mmadụ.
"Kemgbe ọtụtụ oge, ndị na-akwado nchọcha e nweghị ihe ha mere gbasara mmiri ara n'ihi na ha hụtara ya dịka okwu gbasara ụmụnwaanyị na-abaghị uru," ka Dr Azad kwuru.
Mana nke ahụ na-agbanwe.
N'agbanyeghị ọghọm dị na ndị okenye ịṅụ mmiri ara, a na-enyocha ụfọdụ ihe dị ya n'ime dịka ihe na-agwọ ụfọdụ ọrịa ndị okenye gụnyere akwara mgbu, ọrịa obi, kansa na ọrịa afọ.



