Atọghapụla nwata akwụkwọ dere ihe na Twitter maka Aisha Buhari

Aminu Mohammed nakwa Aisha Buhari

Ebe foto si, Baba Azare

Nwunye onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Aisha Buhari ewepụla akwụkwọ ọ gbara nwata akwụkwọ Aminu Mohammed maka ihe o dere gbasara Aisha na Twitter.

Ọkaiwu na-anọchị anya Aminu bụ C.K. Agu bụ onye gbara ama nke a n'ozi ekwentị o zigaara BBC n'ekwentị.

Nwanne nna Aminu bụ Baba Shehu Azare kwukwara na ọkaiwu ya nakwa nakwa nwanne ya nọ n'ụzọ a ga ụlọ mkpọrọ dị na Suleja izute ya.

Agu kwuru na o tinyebuola akwụkwọ ka akpọpụta Aminu n'ụlọ mkpọrọ nwa oge bụ 'bail' na Bekee kemgbe ụbọchị 25 ọnwa Novemba mana ọ mịtaghị mkpụru.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Iwu ụlọikpe nyere maka Aminu Mohammed

Aminu Mohammed

Ebe foto si, Amnesty International

Ụlọikpe etụnyela iwu ka a tụnye Aminu Adamu Mohammed n’ụlọ nga dịka ọkaiwu ya bụ Chijioke Kingsley Agu si gwa BBC.

A nwụchiri ya ma kpọga ya ụlọikpoe ukwu nke dị na Maitama district, Abuja n’ụbọchị Tuzde.

Ọ ga-anọ n'ụlọikpe ahụ dịka ya bụ ikpe ka na-aga n'ihu ruo mgbe e mechara mkpebi na okwu ya.

N'ụlọikpe ahụ, nwata akwụkwọ ahụ ekweteghị na ụta dịrị ya n’ikpe nọ n’isi ya bụ ikpe imetọ aha mmadụ dịka onye ọkaiwu ya kwuru na ha etinyela akwụkwọ ka a tọhapụ Mohammed ka o nweeike na-ese n’ụlọ na-abịa ikpe ya.

Aminu Mohammed

Ebe foto si, Nans/Aisha Buhari/Amnesty International

Ka nke a na-eme, otu jịkọrọ ụmụakwụkwọ mahadum na Naịjriịa bụ National Association of Nigerian Students (Nans) kwuru na Tuzde na ha na-enye ndị ọrụ nchekwa abalị abụọ ka ha tọhapụ nwata akwụkwọ Aminu Mohammed bụ onye a sị ndị ọrụ nchekwa nwụchiri maka okwu ikparị nwunye onyeisiala Naịjirịa.

Otu Nans katọrọ nwụchi nwaamadị a dịka onyeisi ha bụ Usman Barambu zipụtara ozi rịọ mgbaghara mmehe maka ihe a sị Mohammed kwuru.

Onyeisi oche ndị a otu a na mpaghara ugwu ebe a nwụchiri ya bụ Bashir Limanci kwuru na ha ga-amalite ngagharịiwe nye ndị ọrụ nchekwa ma ọ bụrụ na abalị abụọ gaacha ma a tọhapụghị ya.

Ruo ugbua, ndị uweojii nakwa ndị ọrụ nchekwa ọzọ gụnyekwuoro ndị na-ekwuru nwunye onyeisiala Naịjriịa bụ Aisha Buhari ekwebeghi zaa ozi anyị zitere ha maka okwu akụkọ nwụchi Mohammed.

Etu e siri nwụchie Mohammed

Ezinaụlọ nwata akwụkwọ mahadum University of Dutse nke Jigawa steeti a sị ndị ọrụ nchekwa nwụchiri maka ịkparị nwunye onyeisiala Naịjirịa apụtala rịọ mgbahara maka okwu a.

Aminu Adamu Mohammed gbara afọ iri abụọ na atọ zipụtara ozi a sị mere e jiri nwụchie ya.

Ka akụkọ siri kwuo, a kọwara na Mohammed tinyere foto Aisha Buhari n’oge gara aga nakwa foto ya o sere na nso nso a ma kwuo na Aisha na-ebuwanye oke ibu.

BBC enweghi ike ịgba ama ya bụ ozi ugbua.

Akụkọ na a na-achọ nwaamadị malitere na-efesa na soshal midia na ngwụcha izu gara aga dịka ndị mmadu nakwa ndi ogbo ya n’ụlọakwụkwọ ya malitere ikwu na ha na-achọ ya achọ.

E kwuru na akụkọ ofufu ya tinyere nne na nna na ndị ezinaụlọ ya n’ọnọdụ gbagharịa dịka e kwuru na ọ bụ n’ụlọakwụkwọ ya ka ndị ọrụ nchekwa bịara nwụchie ya.

Ihe ezinaụlọ ya na-ekwu

Nne na nna nwaamadị a ezipụtala ozi nye Aisha Buhari bụ nwunye onyeisiala Naịjirịa na-arịọ mgbaghara maka okwu a.

Nna nwa a kwuru na o natara ozi n’ekwentị ya ebe Mohammed kpọrọ ya nwa mgbe nta ma kwuo na ọ nọ n’Abuja dịka o gwara nna ya na ndị ọrụ nchekwa nwụchiri ya maka ihe o dere na Twitter.

Shehu Baba Azare bụ otu nwanne nna nwata a ma bụrụkwa onye na-ekwuchitere ezinaụlọ a gwara BBC na ha na-arịọ arịọrịọ n’okwu a dịka ha chọrọ ka atọhapụ Mohammed.

Ozi ya kwuru

“Ihe anyị ma bụ na nwunye Onyeisiala bụ nne ọha, anyị na-arịọ ya mgbaghara ma na-arịọ ka ọ tọhapụ nwa anyị. Dịka nne mmadụ, biko tọhapụrụ anyị Aminu”

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

Ihe ndị mmadụ na-ekwu

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ọtụtụ akatọọla akụkọ nwụchị nwata akwụkwọ a dịka otu ogbo ya n’ụlọakwụkwọ University of Dutse gwara BBC Pidgin na ha na-akwado imalite ule n’izuụka na-abịa abịa.

Ọ gara n’ihu kwuo na nwụchi a nwereike imetụta agụmakwụkwọ nwata akwụkwọ a n’ụzọ ọjọọ ma ọ bụrụ na ọ gbajọọ ya bụ ule.

“Aminu nọ na Klas ikepazụ ya dịka anyị na-akwado ule ikepazụ anyị ugbua, anyị na-arịọ ka atọhapụ ya ka o nweeike kwado maka ule ya.”

Na Twitter ọtụtụ ozi nke isiokwu ya bụ ‘Free Aminu Adamu Mohammed’ na-ewu ebe niile kamgbe ngwụcha izuụka gara aga.

Nwata akwụkwọ ahụ gwara BBC Pidgin okwu gara n’ihu kwuo na obi dị ya mma na otu ikike dịrị onye nke ndị mbaụwa amalitela itinye ọnụ na ya bụ arịrịọ ọha na-arịọ.

Amnesty Internatinal bụ otu na-agba mbọ n’ọrụ ikwado ikike dịrị onye nye ndị mmadụ etinyela ọnụ n’okwu a ma na-agwa gọọmenti Naịjirịa n'ụbọchị Mọnde, ka ha gee ọha ndị mmadụ ntị ma tọhapụ nwaamadị a.

Otu a nakwa otu ndị ọzọ kwuru na nwụchi ya dara iwu dịka ha boro ebubo na ndị orụ nchekwa ekweghị ịnye ohere ka ndị ezinaụlọ ya nakwa ndị ọkaiwu gbachitere ya.

Ozi ha kwukwara na nnyocha ha na-egosi na a na-ata Mohammed ezigbo ahụhụ n'ụzọ megidere iwu ụwa nakwa nke Naịjirịa.

Twitter

Ebe foto si, Reuters

Ihe Aminu Mohammed mere

Ozi a a na-ekwu mere e jiri nwụchie nwaamadị a bụ ozi o zipụtara n’asụsụ Awụsa n’ụbọchị asatọ nke ọnwa Jun, 2022.

O boro ebubo na Aisha na-aza ma na-ebu n’ihi etu o siri na-eri ego ọha.

Ihe dị etu a ka mechapụrụ na Kano steeti na nso nso ebe a nwụchiri mmadụ abụọ maka ebubo ikparị onye ọchịchị.

Cheta na Ụlọikpe Majistrate dị na Kano enyere iwu nso nso a ka a pịa mmadụ abụọ na-eme ihe ịkpaọchị n'ọbaozi Tiktok ọnụ ụtarị iri abụọ, ma nyekwa ha nha puku naira iri nakwa ntaramahụhụ ịzachasị ogige ụlọikpe abalị 30 maka ebubo ịkparị Gọvanọ steeti ahụ bụ Abdullahi Ganduje, n'ọnwa Novemba afọ 2022.