Ndị uweojii anwụchiela mmadụ 26 a na-enyo enyo wakporo ma gbuo ọtụtụ mmadụ na Benue Steeti

Ebe foto si, Nigeria Police/X
Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ Kayode Egbetokun ekwuola na ndị ọrụ ya anwụchiela mmadụ 26 e kwuru na aka ha dị n'ọnwụ ndị ahụ nwụrụ na mwakpo ahụ e mere na Benue Steeti.
Oge ọ gwara ndị ntaakụkọ okwu n'Abuja, Kayode Egbetokun kwuru na ha na-eme nnyocha iji nwụchie ndị ọzọ aka ha dị na mkpamkpa ahụ gbara ọsọ.
Egbetokun kwuru na a ga-akpụpụ ndị ahụ a nwụchiri a na-ekwughị aha ha na mmadụ 22 a nwụchiri gburu mmadụ itoolu na-eme njem maka agbamakwụkwọ na Quanpan, Jos ụlọikpe.
O kwere nkwa na ndị uweojii ndị uweojii na-agba mbọ ịchọpụta ma nwụchie ndị maọbụ onye ọbụla zụtara egbe na ngwaagha ndị ọzọ n'ụzọ naezighị ezi.
Onyeisi ndị uweojii ahụ kwuru na ndị ọrụ ya, ndịagha nakwa ndị ọrụ nchekwa ọzọ na-agba mbọ iweta ezi nchekwa n'okeala Naịjirịa niile iji gbochie ụdịrị ọdachi a ime ọzọ.

Ebe foto si, Nigeria Police/X
Onyeisiala Tinubu enyela iwu ka a nwụchie ndị ahụ gburu ọtụtụ mmadụ na Benue Steeti

Ebe foto si, State House, Abuja
Onyeisiala Bola Tinubu enyela ndị isi ọrụ nchekwa iwu ka ha nwuchie ndị ahụ wakporo obodo Yelwata dị na Benue Steeti ma gbuo ọtụtụ mmadụ meruo ndị ọzọ ahụ.
Onyeisiala Tinubu kwuru nke a ụbọchị Wenezde, 18, Juun, 2025 oge o mere njem nleta na Benue Steeti.
N'okwu ya, Onyeisiala Tinubu gwara onyeisi ndị uweojii bụ Kayode Egbetokun ka ndị ọrụ ya tinye anya n'ala ma hụ na ha nwetara ozi ga-enyere ha aka n'ọrụ nchekwa.
Ọ gara n'ihu jụọ ya ihe mere ha ji awuchibeghị onye ọbụla kemgbe mkpa mkpa ahụ mere.

Ebe foto si, State House, Abuja
Onyeisiala Tinubu kelere onyeisi ndịagha nchekwa bụ Ọchịagha Christopher Musa, onyeisi ndịagha Ọchịagha Olufemi Oluyede nakwa onyeisi ndịagha ụgbọelu maka mbọ ha na ndị ọrụ ha na-agba iji chekwaa obodo ahụ.
Ọ gara n'ihu gwa ha ka ha rụọ ọrụ iji nwuchie ndị omekome kpara ajọ agwa ahụ.
N'aka nke ọzọ, Onyeisiala Tinubu kpọrọ oku ka ndị Eze ọdịnala nyere gọọmenti steeti ahụ aka iji hụ na e nwere ezi nchekwa na Benue steeti.
Ọ kpọkuru Gọvanọ Hyacinth Alia na-achị Benue steeti ka ọ gbaa mbọ hụ na ndị ọrụ nchekwa steeti ahụ nwetara ezi nkwado zuruoke iji hụ na ha rụọ ọrụ ha.
Onyeisiala Tinubu ji ohere njem ahụ leta ụfọdụ ndị merụrụ ahụ na mwakpo ahụ nọ n'ụlọọgwụ enweta nleta.
Tupu ọ malite okwu ya, Onyeisiala Tinubu wepụtara otu nkeji iji kwanyere mkpụrụobi ndị ahụ nwụrụ na mwakpo ahụ ugwu.

Ebe foto si, State House, Abuja
"Nwa m nọ na-agba ọsọndụ mgbe ndị a jidere ma gbuo ya na Benue Steeti"

Ebe foto si, Nigeria Police/Facebook
Ogbugbu e gburu ọtụtụ mmadụ n'obodo Yelwata dị na Benue Steeti na ngwụcha izuụka gara aga ewetela oke ihe anya mmiri nye ọtụtụ ezinaụlọ.
Otu nwoke so ndị na-eru uju na mwakpo ndị omekaome mere na mpaghara di iche iche na Benue, nke gụnyere obodo Yelwata dị n'okpuruọchịchị Guma na Abafakyai nke nọ okpuruọchịchị Gwer East.
Nwoke a na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwara arịrị ma kọọrọ BBC Igbo etu ndị a si gbuo nwa ya nwoke bụ Terkimvi Shachia.

Ebe foto si, Screenshot
O kwuru na ha nọ na-ehi ụra n'abali Satọde 14 Juun, 2025 mgbe ndị mmadụ malitere iti mkpụ sị "onye ọbula gbawa ọso na ndị Fulani na-egbu ndị mmadụ,ha ji egbe na ngwaagha ndị ọzọ bia."
"Dịka nke a na-eme, ndị mmadụ bidoro gbawa ọsọ, n'otu ntabi anya, nwa m nwoke e tinye isi n'ebe ọzọ, dịka ọ na-agba ọsọ, ndị a jidere ya ma gbuo ya"
O kwuru na obi adịghị ya mma maka etu ya si nwụọ mana nke kachasị ewute ya bụ na o nweghị ihe gọọmenti na-eme gbasara ọnọdu ha.
Ozi anyị nwetere site n'ọnụ ndị bi na Benue kwuru na ọ bụghị naanị na Yelwata ka e gburu ndị mmadụ kama na ihe mere o ji ada ụda bụ maka na ọnụọgụgụ ndị e gburu ebe ahụ ka.

Ebe foto si, Nigeria Police/Facebook
Jonathan Onoja bụ onye ọkachamara n'okwu nchekwa gwara BBC Igbo na ihe na-eme na Benue steeti na-egosi na ọnọdụ nchekwa Naịjirịa na-akwanye njọ.
Onoja gara n'ihu kwuo na kamgbe ụbọchị ole ma ole akụkọ a pụtara na o nwebeghi onye e jidere ruo ugbua.
"Ọbịbịa onyeisiala Tinubu na-akwado ịbịa na Benue enwechaghị uru ọ ga-abara anyi ma ọ bụrụ na o tinyeghi ọnọdụ gbata gbata dịka o mere na Rivas steeti."
Onyeisi ndị ọrụ nchekwa bụ Christopher Musa, Gọvanọ Benue bụ Hyacinth Alia na Onyeisi ndị uweojii bụ Kayode Egbetokun aṅụọla iyi na ha ga-akwụsị ogbugbu ndị mmadụ na steeti ahụ.
Ha gara n'obodo Yelwata n'ụbọchị Mọnde 16 Juun, 2025 ma nye ndị ọrụ ha iwu ka ha tọọ ntọala ma gosi etu ha ga-esi meminaa iyi ndụ egwu.
Ndị nwakpo a mere na ngwụcha izuụka wetere ọnwụ mmadụ karịrị iri ise na itoolu ma chụpụ ndị mmadụ karịrị puku atọ n'ụlọ obibi ha.
Aga m ewepụta ohere gaa na Benue steeti - Tinubu

Ebe foto si, Bola Tinubu/X
Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ekwuola na ọ ga-ewepụta ohere gaa njem nleta na Benue Steeti n'ụbọchị Wenezde 18 Juun, 2025.
"Aga m ewepụta ohere gaa hụụ ndị Benue Steeti n'ụbọchị Wednezde," ka Tinubu kwuru n'ụbọchị Mọnde ka ọ na-agbape ụlọọrụ na-enye mmiri n'Abuja.
O kwuru na ọ ga-eji ohere ahụ nwee nzụkọ ya na ndị niile ihe a metụtara nke gụnyere ndị eze ọdịnala, ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị okpukperechi, ndịisi obodo, na ndị ntoroọbịa iji gboo nsogbu ogbugbu ndị mmadụ.
"Ana m ekpere ndị Benue steeti ekpere"

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi ụka Katọlik n'ụwa bụ Pope Leo tupu ọ malite ikpe ekpere Angelus n'ụbọchị Sọnde 15 Juun 2025 n'obodo Rome, mba Ịtali kwuru na ọ na-ekpere ndị nke a metụtara ekpere.
"Ana m ekpe ekpere maka "nchekwa, ikpe ziri ezi, na udo" maka ogbugbu mere na Benue steeti.
O kwuru na ọ na-eche echiche maka "ndị ụka Kraịst nọ n'ime obodo Benue steeti."









