Ebe niile e nwere ogbubu na ntọ na Naịjirịa kemgbe ntuliaka gwụchara

Nwaanyị Benue na-akwa akwa nakwa ili ndị nwụrụ nke ọhụrụ a

Ebe foto si, Adakole Inalegwu Daniel/Getty Images

Ọ bụ n'ụbọchị asaa nke ọnwa Eprelu ka ndị omekome gara n'ogige ndị gbara ọsọ ndụ na Benue steeti ma gbawa ha egbe.

Dịka ọnụọgụgụ si kwuo, mmadụ ruru iri atọ na asaa so na ndị nwụrụ na ya bụ mwakpo ebe ihe karịrị mmadụ iri anọ merụrụ ahụ na ya.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Sewuese Anene gwara BBC na nke a mere n'ezie.

Onyeisiala Muhammadu Buhari tụkwara arịrị maka oke ogbugbu a mere dịka ọ pụtara ihe na ihe ruru mmadụ 400 anwụọla n'aka ndị omekome n'izuụka atọ na steeti ahụ.

Ọ gwakwara ndị ọrụ nchekwa ha sie imi n'ala hụ na ejidere ndị na-akpa mkpamkpa a.

N'otu aka ahụ aka na-achị ya bụ steeti bụ Samuel Ortom arịọla onyeisiala Buhari ya jiri omume soro okwu ya site n'iziteso ndị agha na steeti ahụ.

Ortom kwuru nke a mgbe ọ gara nleta n'obodo Mgbam dị n'okpuruọchịchị Guma so n'ebe ndị ogbugbu a metụtara.

Nke mere ka ndị mmadụ nọ na soshal midia pụta ịkatọ ya bụ ọnọdụ nchekwa ọjọọ.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Skip X post, 2

End of X post, 2

Ebe Africa Nationalist na-ekwu na ọ bụ n'ihi ụkọ ego mere n'ụfọdụ izu gara aga ka mkpamkpa ndị a ji belata.

Ọ kpọkwara oku ka amalitekwa ya ọzọ.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 3

Zamfara - Ndị omekome tọọrọ mmadụ 80 gụnyere ụmụaka

N'abalị ole na ole gara aga ka akụkọ pụtara na ndị ntọ tọọrọ ihe ruru mmadụ 80 na Zamfara steeti.

Akụkọ na-ekwu na ọ bụ ụmụnwaanyị nakwa ụmụaka karịcha ka ndị ahụ tọọrọ na mwakpo a mere n'ụbọchị Fraịde n'obodo Wanzamai dị n'okpuruọchịchị Tsafe na steeti ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Mohammed Shehu kwuru na nke a mere n'ezie mana o kwughi kpọm kwem mmadụ ole a tọọrọ na ya bụ mwakpo.

Ndị nne na nna ụmụaka a tọọrọ kọwara na ọ bụ ụmụaka ndị gara ịchọ ọrụ aka nakwa ndị gara ịkpata nkụ.

Ha kwukwara na ọtụtụ ndị a tọọrọ dị n'etiti afọ 12 na 17.

Sokoto - Ndị Hausa na ndị Fulani nwere esemokwu

N'ụbọchị 8 nke Eprelu, ọtụtụ ndị mmadụ nwụrụ n'obodo Gwadabawa dị na Sokoto steeti dịka esemokwu dapụtara n'etiti ndị Fulani nakwa ndị Hausa bi ebe ahụ.

Kaduna - Ndị omekome tọọrọ ụmụakwụwkọ 10

N'izuụka gara aga ka gọọmentị Kaduna steeti ziputara ozi na ndị ọrụ nchekwa eziterele ha ozi na atọrọla ụmụakwụkwọ iri n'okpuruọchịchị Kachia dị na steeti ahụ.

Kọmịshọna nchekwa na steeti ahụ bụ Samuel Aruwan ziputara ozi a kwuru na amabeghi ebe ọ bụ kpọmkwem a tọọrọ ụmụakwụkwọ ahụ mana ha ga-achọpụta ma o mere n'ime ụlọakwụkwọ ha.

"Gọọmentị ga-eziputa ozi ọzọ mgbe anyị chọpụtakwuru ihe maka akụkọ a" ka Aruwan kwuru.

Anambra - Ndị ntọ tọọrọ ojiegoachụego na mpaghara Aguata

Ndị