Onyeisiala mba Tanzanịa aṅụọla iyi ọrụ n'agbanyeghị ọgbaaghara a hụtara n'oge ntuliaka

Onyeisiala mba Tanzanịa aṅụọla iyi ọrụ dịka e nwechara ọgbaaghara n’oge ntuliaka

Ebe foto si, AFP via Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ndị ọrụ nchekwa ejupụtala ebe niile dịka a malitere idu Onyeisiala mba Tanzanịa bụ Samia Suluhu Hassan n'iyi ọrụ maka ọchịchị nke ugboro abụọ ya.

Ọnọdụ a sochiri ntuliaka jupụtara na ngagharịiwe, ma bụrụkwa nke otu ndị na-agba ọchịchị ụkwụ kọwara dịka nke jupụtara n'aghụghọ.

A na-ahazi emume idu n'iyi ọrụ ahụ n'ogige ndịagha dị n'isi obodo mba Tanzanịa bụ Dodoma.

E gbochiri ọhanaeze ịbanye n'ogige idu n'iyi ọrụ ahụ, kama ụlọmgbasaozi mba ahụ bụ TBC na-egosi ka ọ sị aga.

E kwupụtara Samia dịka onye nwetara mmeri n'ụbọchị Satọde, site n'inweta vootu dị pasenti iri itoolu na asatọ.

Ọ bụ mmadụ ole na ole mara ya aka n'ihu, dịka ndị a ma ama na-agba ya ụkwụ nọ n'ụlọmkpọrọ, maọbụ bụrụ ndị e gbochiri ịzọ ọkwa ahụ.

Ndị mbaụwa hụrụ ka ntuliaka ahụ siri gaa gosiri mmetụta gbasara nkwụwaakaọtọ nke ntuliaka ahụ nakwa ọgbaaghara sochiri ya, dịka e nwetara ozi na e gburu ọtụtụ mmadụ ma merụọ ndị ọzọ ahụ.

Samia Suluhu Hassan emeriela ntuliaka Onyeisiala mba Tanzania

Onyeisiala Samia Hassan banyere n'ọkwa ọchịchị n'afọ 2021 dịka nwannyị mbụ ga-eji ọkwa onyeisiala mba Tanzania. Ọ bụbu osote Onyeisiala John Magufuli nwụrụ n'afọ 2021

Ebe foto si, Getty Image

Nkọwa foto, Onyeisiala Samia Suluhu Hassan meriri ntuliaka ahụ akụkọ kwuru na e nwere ọtụtụ ọgbaaghara juputara na ya

Onyeisiala mba Tanzania bụ Samia Suluhu Hassan emeriela ntuliaka ọkwa onyeisiala nke ugboro abụọ.

Jacob Mwambegele bụ onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na Tanzania kwuru na Onyeisiala Hassan nke patị Chama Cha Mapinduzi (CCM) nwetara ọnụọgụgụ vootu ruru pasentị iri itolu na asatọ n'ime nde vootu iri atọ na abụọ niile a tụrụ n'ụbọchị Wenzede.

Mmadụ abụọ na-agba gọọmenti ụkwụ iweghara ọchịchị bụ Tundu Lissu onye nke a nwụchiri maka ebubo ịgba ọchịchị mgba okpuru nakwa Luhaga Mpina nke patị ACT-Wazalendo e wepụrụ maka ịda iwu esoghị zọọ ọkwa ahụ.

Ndị okwu ntuliaka doro anya si ebe dị iche iche, kwuru na a haziri ntuliaka ahụ n'ụzọ na-edoghị anya ma kwuo na ọgba aghara juru ebe niile nke mere ka ọtụtụ narị mmadụ nwụọ ma merụọ ahụ.

Onyeisiala Samia Hassan banyere n'ọkwa ọchịchị n'afọ 2021 dịka nwannyị mbụ ga-eji ọkwa onyeisiala mba Tanzania. Ọ bụbu osote Onyeisiala John Magufuli nwụrụ n'afọ 2021.

Mba Tanzanịa amalitela ntuliaka maka ịhọpụta Onyeisiala na ndị omeiwu ọhụrụ

Nwata nwaanyị yi uwe ọcha bụ ọrụ ndị na-ahazi ntuliaka na-achọ aha nwoke yi uwe ojii ụkwụrụ n'ihu ya, n'ime akwụkwọ ndị debanyere aha ịtụ vootu.
Nkọwa foto, Mmadụ iri na asaa na-azọ ọkwa onyeisiala na mba Tanzania nke gụnyere Onyeisiala Samia Suluhu Hassan nke pati na-achị achị bụ Chama Cha Mapinduzi (CCM).
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ntuliaka amalitela ugbua na mba Tanzania ebe a na-atụanya na nde mmadụ iri atọ na narị puku asaa debanyere aha ga-eme ntuliaka iji ahọpụta onyeisiala, ndị omeiwu na ndị kansụl ọchịchị ime obodo ọhụrụ.

Ka ọ dị ugbua, e mepeela ihe karịrị ebe ntuliaka puku iri itoolu n'ofe mba Tanzania na Zanzibar.

Ebe ụmụafọ mba ahụ ga-atụ vootu mepere n'elekere asaa nke ụtụtụ ma a na-atụanya na ha ga-emechi n'elekere anọ nke mgbede n'oge mpaghara mba ahụ.

Ntuliaka a na-abịa dịka oge nkewa dị n'etiti ndị otu na-agba gọọmenti ụkwụ na-ekwu ma ha amaghị ma ha ga-esonye n'usoro ahụ.

E kwuru na mmadụ iri na asaa na-azọ ọkwa onyeisiala na mba Tanzania nke gụnyere Onyeisiala Samia Suluhu Hassan nke pati na-achị achị bụ Chama Cha Mapinduzi (CCM).

Mana otu ndọrọndọrọ ọchịchị bụ isi na ịgba gọọmenti ụkwụ a kpọrọ Chadema, jụrụ isonye na ntuliaka ahụ, na-akpọ oku ka e nwee mgbanwe n'usoro ntuliaka ma na-ebo usoro dị ugbua ebubo ịkwado pati na-achị achị.

Otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọzọ dị mkpa, ACT-Wazalendo, ka a machibidoro onye ga-azọ ọkwa onyeisiala n'ọkọlọtọ otu ha bụ Luhaga Mpina, bụbu onye otu pati na-achị achị CCM - ịzọ ọkwa na ntuliaka a n'ihi mkpesa iwu megidere ya.

Dịka ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka Tanzania si kwuo, a na-atụanya na a ga-ewepụta mpụtara ntuliaka ahụ n'ime awa iri asaa na abụọ ka ntuliaka gwụchara.

Nke a bụ ntuliaka nke asaa a na-eme na mba ahụ kemgbe ọchịchị onyekwuouche ya nke ọtụtụ pati laghachiri n'afọ 1992.

Etu ntuliaka si aga na mpgahara Zanzibar Island

Nke a bụ ntuliaka nke asaa a na-eme na mba ahụ kemgbe ọchịchị onyekwuouche ya nke ọtụtụ pati laghachiri n'afọ 1992.

A malitela ntuliaka na mpaghara Zanzibar ebe a na-atụanya na ihe karịrị mmadụ puku narị asaa debanyere aha ga-eme ntuliaka na mpaghara nke ka dị jụụ ruo ugbua, bụ nke akụkọ ihe mere eme na-egosi na eji ndọrọ ndọrọ ọchịchị siri ike were maara.

Ndị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị abụọ bụ isi na ntuliaka ahụ bụ Chama Cha Mapinduzi (CCM) nke na-achị achị na pati na-agba gọọmenti ụkwụ bụ ACT Wazalendo.

Onyeisiala nọ n'ọkwa ugbua bụ Hussein Ali Mwinyi na-egosi ihe ọtụtụ ihe nke ọchịchị rụpụtara gụnyere ụlọakwụkwọ dị elu, ebe ahụike ọgbara ọhụrụ, na ọtụtụ narị kilomita nke okporoụzọ n'ofe mpaghara ahụ.

Mana otu ACT Wazalendo ekwekwala nkwa ịkwalite nnwere onwe nye Zanzibar, na-arụ ụka maka mkpa ọ dị ịchọ nkwado n'aka gọọmenti etiti na ọtụtụ mkpebi dị mkpa egbochila mmepe mpaghara ahụ.

A na-atụanya na ntuliaka ga-emechi n'elekere isii nke mgbede n'oge mpaghara ahụ, dịka ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka nke Zanzibar (ZEC) kwere nkwa iwepụta mpụtara mbụ n'ime awa iri abụọ na anọ mgbe ntuliaka gwụchara.