Paul Biya abụrụla Onyeisiala kachasị kaa nka n'ụwa

- Onye dere ya, Paul Nije
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2
Paul Biya ji ugbua ọkwa onyeisiala kachasị kaa nka n'ụwa ugbua dịka o merichara na ntuliaka mba Kemerun.
Nwa amadi a gbara afọ 92 kwechiiriy, na-agbnyeghị oku ọtụtụ kpọrọ ka o rituo nọrọ n'ụsọ dịka ọ pụtara nanaị otu ugboro maka achụmtavootu.
Ọ nọọla n'ọkwa onyeisiala kemgbe afọ 1982., ọnọkwaa afọ azam ọ bụrụ afọ 50 ọ nọrọla n'ọkwa nke ga-ebu n'afọ 2032 bụ oge ọ ga-eruwala nso n'afọ 100.
Ọtụtụ na-ebo ebubo wuruwuru na ntuliaka nke o meriri na ya mana gọọmentị na-agọ na nke abụghị eziokwu.
Kaụsụl na-ahụ maka iwu nke mba Kemerun a kpọrọ 'Constituttional Council' na Bekee na ọ bụ Paul Biya gbara afọ 91 meriri na ntuliaka nke mba ahụ mere na nsonso a.
Biya onye bụ ya agba nke asatọ ọ na-abanye n'ọkwa ahụ bụ nke o nwetara vootu dị pasent 53.7 , ebe Tchikoroma Bakary ya na ya zọkọrọ ya nwetara vootu dị pasent 35.2.
Biya onye banyere ọkwa onyeisiala ya mbụ n'afọ 1982 m bụ ugbua onyeisiala kachasị kaa nka na mba ụwa.
Ntuliaka Kamerun 2025: Paul Biya na-achọ ihu ụmụnwaanyị, ndị ntorobia dịka ịtụ vootu na-abịa nso

Onyeisiala mba Kamerun bụ Paul Biya dị afọ 92 pụtara n'ọha mbụ ya n'ogologo n'ọgbakọ achụmpta vootu e mere na Maroua na mpaghara ụgwụ mba ahụ.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
N'okwu ya o kwere nkwa ịme ihe gbasara ụmụnwaanyị na ndịntorobịa isi e jiri kwawa okpu ma ọ banye ọzọ.
N'okwu enweghị ọrụ, ọ sịrị, "Agaghị m ezu ike rue oge e nwere ihe pụtara ihe."
Ọ gara n'ihu sị "Anyị ga-etinye uchu n'agụmakwụkwọ na ịkwalite ụmụnwaanyị" ma kwee nkwa ichekwa ikike dịịrị ụmụnwaanyị nakwa ịhụ na e nyere ụmụnwaanyị ọkwa ọchịchị.
Onyeisiala Biya gụpụtara ihe ọchịchị ya rụrụ nke ọ gụrụnyere ewumewu na-enyere ndụ aka, agha megide ndị Boko Haram ma kwee nkwa igbo nsogbu nchekwa na-eme na mpaghara dị iche iche na mba ahụ.
Mana nsogbu Boko Haram ka na-aga n'ihu na mba ahụ, ebe mpaghara abuo a na-asụ Bekee na mba ahụ nwere nsogbu ndị na-eti mkpu nnwereonwe.
Ndị ahụ na-eti mkpu nwereonwe machiri ndị mmadụ isonye na ntuliaka nke gọọmentị na-ahazi.
Achụm nta vootu Biya n'Ugwu Kamerun na-abịa dịka ụfọdụ na-akatọ ya maka anya ahụghị ya kemgbe e bidoro achụmta vootu, kama o ji ihe onyonyo e ji igwe 'AI' hazie akọwapụta ihe ndị o mere n'ọchịchị.
N'afọ 2018, Biya mere achụmntavootu n'otu ebe ahụ bụ ebe so n'ebe atọ a na-enwetakarị vootu n'Ugwu mba ahụ.
Biya ga-ezute mmadụ itoolu ndị ọzọ na-azọ ọkwa na ntuliaka ahụ a ga-eme n'abalị 12 nke ọnwa Oktoba afọ 2025 dịka mmadụ abụọ sobu azọ ọkwa onyeisiala rituru ma kwụsị bụ nke ha ji na-akwado Bello Bouba Maigari bụ onye ya na Biya na-adịbu na mma.
Biya adanubeghị na ntuliaka.
Ndị ọkachammara n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị na-ekwu na ọ bụ ọjụjụ ndị ya na ha na-azọ ya bụ ọkwa jụrụ ikwekọrịta wepụta otu onye ga-enye Biya ohere imeri na ntuliaka na-abịa.









