Paul Biya abụrụla Onyeisiala kachasị kaa nka n'ụwa

Paul Biya
    • Onye dere ya, Paul Nije
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Paul Biya ji ugbua ọkwa onyeisiala kachasị kaa nka n'ụwa ugbua dịka o merichara na ntuliaka mba Kemerun.

Nwa amadi a gbara afọ 92 kwechiiriy, na-agbnyeghị oku ọtụtụ kpọrọ ka o rituo nọrọ n'ụsọ dịka ọ pụtara nanaị otu ugboro maka achụmtavootu.

Ọ nọọla n'ọkwa onyeisiala kemgbe afọ 1982., ọnọkwaa afọ azam ọ bụrụ afọ 50 ọ nọrọla n'ọkwa nke ga-ebu n'afọ 2032 bụ oge ọ ga-eruwala nso n'afọ 100.

Ọtụtụ na-ebo ebubo wuruwuru na ntuliaka nke o meriri na ya mana gọọmentị na-agọ na nke abụghị eziokwu.

Kaụsụl na-ahụ maka iwu nke mba Kemerun a kpọrọ 'Constituttional Council' na Bekee na ọ bụ Paul Biya gbara afọ 91 meriri na ntuliaka nke mba ahụ mere na nsonso a.

Biya onye bụ ya agba nke asatọ ọ na-abanye n'ọkwa ahụ bụ nke o nwetara vootu dị pasent 53.7 , ebe Tchikoroma Bakary ya na ya zọkọrọ ya nwetara vootu dị pasent 35.2.

Biya onye banyere ọkwa onyeisiala ya mbụ n'afọ 1982 m bụ ugbua onyeisiala kachasị kaa nka na mba ụwa.

Ntuliaka Kamerun 2025: Paul Biya na-achọ ihu ụmụnwaanyị, ndị ntorobia dịka ịtụ vootu na-abịa nso

Paul Biya

Onyeisiala mba Kamerun bụ Paul Biya dị afọ 92 pụtara n'ọha mbụ ya n'ogologo n'ọgbakọ achụmpta vootu e mere na Maroua na mpaghara ụgwụ mba ahụ.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

N'okwu ya o kwere nkwa ịme ihe gbasara ụmụnwaanyị na ndịntorobịa isi e jiri kwawa okpu ma ọ banye ọzọ.

N'okwu enweghị ọrụ, ọ sịrị, "Agaghị m ezu ike rue oge e nwere ihe pụtara ihe."

Ọ gara n'ihu sị "Anyị ga-etinye uchu n'agụmakwụkwọ na ịkwalite ụmụnwaanyị" ma kwee nkwa ichekwa ikike dịịrị ụmụnwaanyị nakwa ịhụ na e nyere ụmụnwaanyị ọkwa ọchịchị.

Onyeisiala Biya gụpụtara ihe ọchịchị ya rụrụ nke ọ gụrụnyere ewumewu na-enyere ndụ aka, agha megide ndị Boko Haram ma kwee nkwa igbo nsogbu nchekwa na-eme na mpaghara dị iche iche na mba ahụ.

Mana nsogbu Boko Haram ka na-aga n'ihu na mba ahụ, ebe mpaghara abuo a na-asụ Bekee na mba ahụ nwere nsogbu ndị na-eti mkpu nnwereonwe.

Ndị ahụ na-eti mkpu nwereonwe machiri ndị mmadụ isonye na ntuliaka nke gọọmentị na-ahazi.

Achụm nta vootu Biya n'Ugwu Kamerun na-abịa dịka ụfọdụ na-akatọ ya maka anya ahụghị ya kemgbe e bidoro achụmta vootu, kama o ji ihe onyonyo e ji igwe 'AI' hazie akọwapụta ihe ndị o mere n'ọchịchị.

N'afọ 2018, Biya mere achụmntavootu n'otu ebe ahụ bụ ebe so n'ebe atọ a na-enwetakarị vootu n'Ugwu mba ahụ.

Biya ga-ezute mmadụ itoolu ndị ọzọ na-azọ ọkwa na ntuliaka ahụ a ga-eme n'abalị 12 nke ọnwa Oktoba afọ 2025 dịka mmadụ abụọ sobu azọ ọkwa onyeisiala rituru ma kwụsị bụ nke ha ji na-akwado Bello Bouba Maigari bụ onye ya na Biya na-adịbu na mma.

Biya adanubeghị na ntuliaka.

Ndị ọkachammara n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị na-ekwu na ọ bụ ọjụjụ ndị ya na ha na-azọ ya bụ ọkwa jụrụ ikwekọrịta wepụta otu onye ga-enye Biya ohere imeri na ntuliaka na-abịa.