Ọchịagha Ibok-Ete Ibas awuchiela obi ọchịchị gọọmenti Rivas Steeti ma bido ọrụ ya

Ebe foto si, RSGH Media
Onyeisi ọrụ na Rivas Steeti bụ Ọchịagha Ibok Ete Ibas amalitela ọrụ ya na Rivas Steeti dịka Onyeisiala Tinubu duchara ya n'iyi ọrụ.
Ọ malitere ọrụ ya site n'inwe ọgbakọ ndịisi nchekwa, ndịisi ọrụ gọọmentị Rivas Steeti nakwa ndị nnọchiteanya gọọmentị etiti n'obi ọchịchị gọọmentị dị na Port Harcourt.
Onyeisi ọrụ a kwere nkwa ịgwa ndị ntaakụkọ okwu ma ọ bụrụ ọ natachaa ozi si n'aka ndịisi ọrụ, odeakwụkwọ steeti ahụ nakwa ndị nchekwa.
Ibas wuchiri n'obi ọchịchị gọọmentị ya na ndị ọrụ nchekwa, na ndị nnọchiteanya ministri na-ahụ maka nchekwa.

Ebe foto si, RSGH Media

Ebe foto si, RSGH Media
Mgbe Onyeisiala Tinubu duru Ibas n'iyi ọrụ

Onyeisiala Bola Tinubu eduola Ọchịagha Ibok-Ete Ibas lara ezumike nka n'iyi ọrụ dịka onyeisi ọrụ na Rivas Steetị n'ụbọchị Wenezde 19 Maachị, 2025.
E duru Ibas n'isi ọrụ n'obi ọchịchị gọọmentị dị n'Aso Rock, Abuja dịka Onyeisiala Tinubu kwụsịtụrụ Gọvanọ Fubara, osote ya na ndị ụlọomeiwu steeti ahụ ọrụ ma tinye ọnọdụ gbatagbata.
Tinubu sị na o mere nke a n'ihi ọgbaghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị na steeti ahụ na-akwanye njọ ma kwuo na ọ gbakwasịrị ụkwụ na mpaghara 305(5) nke iwu Naịjirịa e mere n'afọ 1999.
Ibas dịka e duchara ya n'iyi ọrụ ahụ kwuru na ihe mbụ ọ ga-ebu ụzọ mee bụ ime ka o wete udo na nchekwa na Rivas Steeti.
O kwuru na ọ dị njikere ya ndị ọnụ na-eru n'okwu ijikọta aka hụụ na e wetere udo na steeti ahụ.

Onye bụ Ibok-Ete Ekwe Ibas

Ebe foto si, Ibok-Ete Ekwe Ibas
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Vice Admiral Ibok-Ete Ekwe Ibas bụ onye Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu họpụtara ka ọ bụrụ aka ga-achị Riva steeti dịka o kwuputala ọnọdụ gbatagbata na steeti ahụ.
Onyeisiala Tinubu nyere iwu ka Gọvanọ Siminalayi Fubara na osote ya bụ Prof. Ngozi Odu kwụsịtụ ọrụ ruo ọnwa isii n'ihi nsogbu na ọgbaaghara na-akpọtụ na steeti ahụ.
Ibas bụ onye agha mmiri Naịjirịa lara ezumike nka n'ọkwa 'Vice Admiral'. Ọ bụkwa onyeisi iri abụọ na abụọ nke ndịagha mmiri Naịjirịa site n'afọ 2015 ruo 2021.
A mụrụ ya n'ọnwa Septemba 27, 1960.
Amuru ya na Nko, Cross River Steeti, ndịda-ndịda Naịjirịa, mana ọ banyere n'ụlọakwụkwọ 'Nigerian Defence Academy' dika onye otu 26 Regular Course n'ọnwa Juun 20, 1979, e wee nye ya ọkwa sub-lieutenant n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Jenuarị 1983.
Ọ gara ụlọ akwụkwọ praịmarị Nko, n'afọ 1966 mana ọ gụchara akwụkwọ praịmarị ya na Big Qua Primary School, dị na Kalaba n'afọ 1971.
Ọ gakwara na Hope Waddell Training Institute Kalaba site na 1972 ruo 1976.
N'agbata afọ 1977 na 1979, ọ gara School of Basic Studies dị n'Ogoja tupu ọ gaa na Nigerian Defence Academy n'afọ 1979.
Lee ọzụzụ ndịagha ọ gara na nzere agụmakwụkwọ ya
Ibas gara ọtụtụ nkuzi ndịagha n'ụlọ na mba ofesi, gụnyere Sub-Lieutenant Technical Course na INS Venduruthy dị n'India site na Eprel 1983 ruo Mee 1984, yana ọzụzụ ịmụ etu e si akwa ụgbọelu 'Pilot Primary' na 301 Primary Flying Training School nke Nigerian Airforce Base dị na Kaduna site na Eprel 1986 ruo Ọktoba 1987.
Ọ gakwara na ụlọ akwụkwọ ndịagha nke Armed Forces Command and Staff College, Jaji, Kaduna steeti, n'ọnwa Jenụwarị 1990 wee gụchaa Junior Staff Course na Juun n'otu afọ ahụ.
Na Julaị 1992, ọ gara ụlọ akwụkwọ Amphibious Warfare nke Mahadum United States Marine Corps na Quantico, Virginia, US, ebe o jiri diplọma pụta na Mee 1993.
Na Febrụwarị 1994, Ibas bidoro ọzụzụ ya na Officer Long Course ebe o lebara anya n'ịbụ ọkachamara n'ịlụ agha n'okpuru mmiri n'ụlọ akwụkwọ Underwater Warfare, NNS Quorra, wee mechaa ya na Febụwarị 1995.
Site n'Ọgọst 1996 ruo Julaị 1997, ọ laghachiri na ụlọọrụ ndịagha a ma ama bụ Command Forces Command na Staff College Jaji, ebe ọ gụchara nkuzi ndịọrụ Senior Staff Course ma were akara dị mma pụta.
Ọ bụkwa otu n'ime ndị gụrụ akwụkwọ na National Defence College, Islamabad, Pakistan, ebe ọ gara National Defence Course site n'Ọgọst 2005 ruo Juun 2006.
O nwekwara nzere masta na Defence and Strategic Studies na Mahadum Quaid-i-Azam nke Islamabad dị na Pakistan.
Ụfọdụ nhọpụta ndịagha Ibas nwere tupu ọ laa ezumike nka
Ibas nwere ọtụtụ nhọpụta mgbe ọ nọ na ndịagha mmiri Naijiria gụnyere ije ozi dịka onyeisi oche NNS Ruwan Yaro, NNS Obuma na NNS Aradu.
A ghọrọ ya dịka onyeisi NNS Siri, NNS Ekun na NNS Ambe site Julaị 1993 ruo Ọgọst 1996.
Ọ jere ozi dịka ọchịagha nke ụlọ akwụkwọ agha Navy Underwater nke Naijiria site na Ọgọst 1997 ruo Septemba 1998, ma bụrụ onyeisi oche nke Forward Operating Base Ibaka site na Septemba 1998 ruo Juun 2000.
A họpụtara ya dịka onye na-eduzi ndị ọrụ na ụlọọrụ Armed Forces Command and Staff College, Jaji, site na Juun 2000 ruo Juun 2002.
O laghachiri na kọleji ahụ na Jenụwarị 2009 dịka onyeisi ngalaba na-ahụ maka agha mmiri - ọ nọrọ n'ọnọdụ ahụ ruo Nọvemba 2010.
Ọ rụkwara ọrụ dịka osote onyeisi ụlọ akwụkwọ kọleji ahụ site na Jenụwarị ruo Febụwarị 2014.
Ibas jere ozi dịka onyeisi ndịagha mmiri site na Eprel 2003 ruo Juun 2004 wee jeekwa ozi dịka onyeisi ndị ọrụ nke CNS site na Juun 2004 ruo Julaị 2005.
Ọ bụkwa onyeisi ọrụ n'isi ụlọọrụ ndịagha mmiri Western Naval Command, Legos, site na Juun ruo Disemba 2006, na site na Disemba 2006 ruo Jenụwarị 2009.
Ibas rụkwara ọrụ dịka ọchịagha nke Naval Air Base, Ojo, yana onyeisi ndị ọrụ n'isi ụlọọrụ, Naval Training Command, Legos, site na Septemba 2010 ruo Maachị 2011.
A họpụtara ya n'isi ụlọọrụ ndịagha mmiri, nke mbụ dịka onyeisi nchịkwa site na Maachị 2011 ruo February 2012, mana e mesịrị họpụta ya dịka odeakwụkwọ ndịagha mmiri site na Febụwarị 2012 ruo Jenụwarị 2013.
A ghọrọ ya dịka onyeisi ọkọlọtọ na-achị Western Naval Command site na Jenụwarị 2013 ruo Jenụwarị 2014.
A họpụtara ya ka ọ bụrụ onyeisi na-ahụ n'ihe na-aga ngwa ngwa 'chief logistics' na Febụwarị 2014 yana onyeisi nke Nigerian Navy Holdings Limited site na Disemba nke otu afọ ahụ.
A họpụtara ya dịka onyeisi nke iri abụọ na abụọ nke ndịagha ụgbọmmiri na 13 Julaị 2015.
Ibas lụrụ Theresa Ibas ma ha mụrụ ụmụ atọ.









