Atọhapụla mmadụ 23 fọrọ n'ime ndị atọrọla n'ụgbọoloko Abuja-Kaduna

Ụgbọoloko e si na ya tọrọ ndị mmadụ

Ebe foto si, Screenshot

Atọhapụla mmadụ 23 fọrọ n'ime ihe karịrị mmadụ otu narị ndị Boko Haram tọrọla n'ụgbọoloko si Abuja aga Kaduna, n'ụbọchị 28 nke ọnwa Maachị 2022.

Ozi si n'aka otu mmadụ asaa e hibere maka ntọhapụ mmadụ 23 a, nke akpọrọ Chief of Defense Staff Action Committee (CDSAC), kwuputere na mmadụ 23 ahụ nọ n'aka ndị agha ugbua.

Gen. Leo Irabor, bụ onyeisi ndị ọrụ nchekwa Naịjiria, hibere otu CDSAC a iji hụ na a kpọpụtara mmadụ 23 a n'aka ndị tọrọla ha.

Ozi gọọmentị ziputere

Ebe foto si, Aso Villa

N'ozi ha ziputara, nke Ọkammụta Usman Yusuf, bụ odeakwụkwọ otu CDSAC binyere aka, otu CDSAC kelere ndịagha Naịjiria maka mbọ ha gbara iji hụ na a tọhapụrụ ndị a.

Ha kelekwara onyeisiala Muhammadu Buhari maka mbọ ya niile.

Atọhapụrụ mmadụ 23 a ebe elekere anọ nke mgbede Wenezde, Ọktoba 5 2022.