Naịjirịa ahụla ọnụego mmanụ ụgbọala kachasị kemgbe e hibere ya

Ebe foto si, Getty Images
Ọnụego mmanụ ụgbọala na mpaghara Naịjirịa ugbua nọzi n’elu ọji maka na nke a bụ ọnụego mmanụ ụgbọala kachasị kemgbe e hibere mba Naịjirịa.
Ụkọ mmanụ ụgbọala banyela izu ụka nke isii ya, emela ka e nwe ogologo ahịrị n’ọdọ mmanụ ụgbọala na Legọs, Abuja nakwazi steeti ndịọzọ.
BBC chọpụtara na ọnụego a na-ere mmanụ ụgbọala na Legọs abụghị ihe a n-ere ya n’Abuja na ebe steeti dịka Enugu, Ebonyi, Anambra na steeti ndịọzọ.
Na Legọs, ụfọdụ ọdọ mmanụ ụgbọalaa na-ere otu lita 950 naịra ebe ụfọdụ na-ere 1000.
Akụkọ na-ekwu na ọnụego otu lita ruru 1000 naịra na ụmaa n’ụfọdụ ọdọ mmanụ ụgbọala dị n’Abụja, Kaduna, Kano, Port Hacourt, Niger, Nasarawa na steeti ndịọzọ dị na mpaghara ugwu, nke a mere ka ọtụtụ ọdọ mmanụ ụgbọala mechie.

Ebe foto si, Getty Images
Ego ole ka a na-ere mmanụ ụgbọala na mpaghara Naịjirịa?
Abuja
Anyị chopụtakwara na ndị na-ere nke a kpọrọ ‘black market’ n’Abuja na-ere oru galọnụ lita iri naịra puku iri abụọ (N12,000).
Legọọs
A hụrụ nnukwu ahịrị na Legọọs. A na-ere mmanụ ụgbọala site N660 ruo N900 n'ebe ụfọdụ.
Anambra, Enugwu, Ebonyi na Abịa kwanụ?
Na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa, enweghị ogologo ahịrị kama na ihe ha na-anya bụ ọnụego ọdọ mmanụ majinyere site N900 ruo ihe karịrị otu puku.
BBC Igbo gara n’ọdọ ụfọdụ nwe chọpụta na ọ bụ okwu ‘onye na-ere etu o si zụta’.
Gịnị kpatara ụkọ mmanụ ụgbọala nke banyere izu isii?

Ebe foto si, Getty Images
Na agbanyeghị na Naịjirịa nwere mmanụ agbịdị dịka ọnatarachi, ọ hịara ụmụ Naịjirịa ahụ ịnọ otu afọ enweghị ụkọ mmanụ ụgbọala maka ihe ọtụtụ dịka nrụrụ aka na ime ihe n'ụzọ ezighi ezi.
Mana n'oge nke a site n'ọnwa Juunu ruo Ọgọst nke afọ 2024, ihe kpatara ụkọ mmanụ ụgbọala dịka n'ozi ụlọọrụ Nigerian National Petroleum Company Limited (NNPCL) wepụtara sị na ihe mere e ji nwe ụkọ mmanụ ụgbọala bụ maka na enweghị ọtụtụ ndị na-ekesa mana ha ekwughị ihe mere ọnụego mmanụ ụgbọala ji rịa na-ụdị a na-ahụtubeghị na Naịjirịa.
N'aka nke ọzọ, onyeisi ụlọọrụ Independent Petroleum Marketers Association of Nigeria (IPMAN) bụ Abubakar Maigandi kwuru na ihe kpatara oke ahịrị na ụkọ mmanụ ụgbọala bụ maka ndị na-ego ya maka egwu na o nwereike ịkọ.
O kwuru na ọ bụ ngagharịiwe e mere metụtara ndọ ọrụ ha jiri ghara ikesa mmanụ na mpaghara Naịjirịa gba gburugburu.








