Fuel Scarcity: Lee etu ụkọ mmanụ ụgbọala si anyụ ndị mmadụ ịkpakwụ
Ụmụ Naịjirịa pụtara n'ụtụtụ Monde chọpụta na ahịrị ụgbọala amalitekwala ọzọ n'ebe dị icheiche.
Ihe ahụ gara n'ihu rue ụbọchị Tuusde a dịka BBC Igbo gara gbaa ọtụtụ mmadụ ajụjụ ọnụ.
Ndị na-akwọ ụgbọala na-ekwu na ebe niile tọgbọ chakoo, na o nweghizi ndị mmadụ ha hụrụ iburu.
Ebe ndị ọzọ na-ekwu na ụkọ emeela ka ọnụ ya bụ mmanụ ụgbọala rịa elu.

Bobby Eberechi Dick bụ onyeisioche ndị na-ere mmanụ ụgbọala tinyere ọnụ n'okwu a.
Ọ sị na NNPC bụ ndị ọ bụ naanị ha na-ebubata mmanụ agbịdị na-eresi ndị nkịtị mmanụ ahụ nke mere ọ ji dị oke ọnụ maka na ndị ahụ na-ere ya n'ọnụ ọbụla sọrọ ha.
Dick sị "ahụhụ ọzọ anyị na-agagbiga bụ na ụzọ e si aga ọdọ mmanụ agbịdị n'ọwụnwa anyanwụ emebichaala, ọ na-eme ka ụgbọala tanka anyị na-ada nke na-ebutere anyị ọghọm n'ahịa anyị na-azụ".
Nke a bụ ugboro abụọ a na-enwe ụkọ mmanụ ụgbọala na Naịjirịa n'afọ 2022.









