Ebidoro m iti ịgba n'oge m dị obere n'ọgbakọ ụmụaka 'block rosary' - Nazzy Drums

Aha onyonyo, Ebidoro m iti ịgba n'oge m dị obere n'ọgbakọ ụmụaka 'block rosary' - Nazzy Drums
Ebidoro m iti ịgba n'oge m dị obere n'ọgbakọ ụmụaka 'block rosary' - Nazzy Drums
    • Onye dere ya, Ikechukwu Kalu & Kelechi Anozia
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist & Video Journalist

Nwada na-eti ịgba aha ya bụ Chinaza Elizabeth Amaobi akọwaala mmasị o nwere n'iti ịgba na etu o siri malite.

Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere, nwada a e ji 'Nazzy Drums' maara kwuru na mmasị o nwere n'iti ịgba bụ n'oge ọ dị na nwata, ha na-eme ọgbakọ ụmụaka ụka Katọlik a kpọrọ 'block rosary'.

O kwuru na ga gaa ọgbakọ ahụ, ụmụaka ụmụnwaanyị ibe ya na-azọ igwe e ji agụ egwu mana ya onwe ya na-azọ osisi e ji eti ịgba.

"Ebidoro m njem a mgbe m nọ na nwata, mgbe ụmụaka na-ezukọ n'ọgba ụka Katọlik a na-akpọ 'block rosary'.

"Ụmụnwaanyị ibe m na-azọ ihe e ji agụ egwu, mụ onwe m ana-azọ osisi e ji eti ịgba."

Amaobi kwuru na ọ mechara banye n'ụlọụka nnukwu ma soro ndị na-ekwe ukwe na-etiri ha ịgba, si zie ebe ahụ tirizie ịgba na-aga.

O kwuru na ọ gbasiri mbọ ike ịhụ na o ji aka ya mụta ka e si eti ịgba ọfụma maka na ụfọdụ ndị nwoke chọrọ ikuziri ya na-achọ ka ya na ha mee ọyị tupu ha akụziere ya.

Dịka ọ dị ugbua, Amaobi sị na ọ na-eti ịgba n'ebe a na-eme emume dị iche iche dịka emume ncheta ọmụmụ, ịgba nkwụ, agbamaakwụkwọ na ndị ọzọ.

"Ana m eti ịgba n'emume ncheta ụbọchị ọmụmụ, akwamozu, agbamaakwụkwọ, ịgba nkwụ nwaanyị na emume ọbụla a na-enwe aṅụrị."

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ ego ọ na-enwete n'iti ịgba ka o ji azụ onwe ya n'ụlọakwụkwọ.

Kirie ihe o kwuru n'uju;