Emepere m ụlọ ekpere, ọ bụghị ụlọụka - Rosemary Chukwu
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
Nwaafọ Igbo a ma ama na-eti egwu bụ Rosemary Chukwu Onumaegbu ekwuola okwu gbasara akụkọ na-efegharị ebe niile na o mepere ụlọụka.
Oge ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka pụrụiche, Onumaegbu kọwara na ọ bụ ụlọ ekpere ka o mepere, na ọ bụghị ụlọụka.
Ọ kọwara na ihe kpaliri mmụọ ya ihiwe ụlọ ekpere ahụ bụ iji kụziere ndị mmadụ okwu Chukwu a na-agbaghị mmiri.
Rosemary Chukwu kwukwara na ọ naghị ede egwu, kama egwu ndị ọ na-eti na-abịara onwe ha.
Gbasara ụmụ ya atọ, Onumaegbu kwuru na egwu na-amasị ha nke ukwuu, ọkachasị nwa ya nke nwoke, bụ onye o kwuru na eti ngwa egwu dị iche iche ma na-agụkwa agụ.
O kwuru na ndị mmadụ na-etigharị egwu ya kwa mgbe kwa mgbe, mana ọ naghị ebutere ha na ya nsogbu n'ihi na ọ bụ Chukwu ka ihe niile dị n'aka.

Ebe foto si, Sis.Rosemary Chukwu/Facebook



