Ọtụtụ ihe ụmụnwaanyị gabigara n'aka ndị omekaome kpachiri otu obodo na mba Haiti

Nwaanyị

Ebe foto si, BBC/ Phil Pendlebury

Nkọwa foto, Helene kwuru na ndị omekome gwara ya tepụ afọ ime ya mana ọ jụrụ ma rie mbọ mbọ ọsọ.
    • Onye dere ya, By Nawal Al-Maghafi and Jasmin Dyer
    • Ndị mere akụkọ a, BBC World Service, reporting from Port-au-Prince
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Helene dị naanị afọ isi na asaa mgbe ndị omekome na mpaghara isiobodo Haiti bụ Port-au-Prince metọrọ ya ma dinaa ya n'ike.

O mere ka nwa ya rahụ ụra n'ụkwụ ya dịka ọ na-akọwa etu ndị omekome ji egbe si tọrọ ya nakwa ihe niile mere tupu ọ gbapụ ọsọndụ ka ọ nọchara ihe karịrị ọnwa abụọ.

"Ha dinara m n'ike ma na-akụ m ihe ụbọchị ọbụla. Ụmụnwoke dị iche iche mere m ya. Ndị m na-amaghị aha ha. Ọtụtụ ihe ha mere m na-ara m ahụ ịgwa gị".

"Mgbe ha tụwara m ime, ha gwara m ka m tepụ ya mana a jụrụ m. Nwatakiri a nwereike ịbụ naanị ihe m ga-amụ na ndụ m ọzọ".

Ọ gbara mbọ si n'ebe ndị omekome ahụ dowere ya gbaa ọsọ mgbe ọgụ dara n'ebe ahụ. Ugbua ọ dị naanị afọ iri na itoolu, ọ nọ n'ime obodo ọzọ zoro ezo na-azụlite nwa ya.

Ebe ọ nọ bụ ebe ụmụnwaanyị ruru iri atọ mana Helene bụ onye afọ ole ọ dị ka ndị niile e dinara n'ike bụ ndị gbatara ọsọndụ n'ebe ahụ. Onye kacha bụrụ obere nwa nwaanyị e dinara n'ike so ha nọrọ ebe ahụ dị naanị afọ iri na abụọ. Onye nke ahụ ataala oke ahụhụ maka agụụ ma pee mpe karịa afọ ole ọ dị.

Ndị umụ ntoroọbịa ji egbe

Ebe foto si, BBC/ Phil Pendlebury

Nkọwa foto, Ndị omekome na-achị ihe ruru pasenti 90 n'ogbe dị na Port-au-Prince

Kamgbe e gburu Onyeisiala mba ahụ bụ Jovenel Moïse n'afọ 2021 ndị omekome ji egbe bụ ndị na-ekwu ihe na-eme na mpaghara dị iche iche na mba ahụ.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Dịka Medical charity Medecins Sans Frontieres (MSF) bụ ndị nwere ụlọọgwụ na Port-au-Prince si kwuo na ọ ga-ahịa ahụ ị mara mmadụ ole a mara elu n'ike nakwa ndị e metọrọ.

Ndekọ BBC hụrụ gosiri na ọnụọgụgụ ndị ihe ahụ mere na-agbago agbago kemgbe afọ 2021.

Ndị omekome ahụ na-aga ebe ọbụla ha chetere gbuo igwe mmadụ, tọrọ ndị ha ga-atọrọ ma dinaa ụmụnwaanyị n'ike.

BBC gara hụụ ndịisi ndị omekome ahụ ma jụọ ha ajụjụ banyere idina ụmụnwaanyị n'ike nakwa igbu mmadụ.

Otu n'ime ha kwuru na "ndị otu ha na-eme ihe ha na-ekwesighị ime". Onye ọzọ kwuru na udiri ihe ndị ahụ na-eme mgbe ha na gọọmenti na-alụ ọgụ. "n'oge ahụ anyị adịghịzị abụ mmadụ".

Onyeisi ndị ọrụ gbatagbata na Haiti bụ Manilla Arroyo kwuru na ọtụtụ akụkọ na-agbawa obi ka ha na-enweta banyere ihe a na-eme ụmụnwaanyị.

"Ndị gbapụtara ọsọ ndụ na-agwa anyị ihe mere ha. Ma mgbe e jiri ngwagha kụọ ha ihe tinyere ha n'ọnọdụ ọ dị ndụ ọnwụ ka mma".

Ọ sị na ọtụtụ ụmụnwoke na-eme ha ihe ahụ erughị afọ iri na asatọ. Ọtụtụ kọwara ihe e mere ha n'ihu di ha nakwa ụmụ ha.

Ụmụnwaanyị

Ebe foto si, BBC/ Phil Pendlebury

Nkọwa foto, Ụmụnwaanyị anọ kọrọ akụkọ etu e si maa ha elu n'ike n'ihu dị ha na ụmụ ha.

Otu nwaanyị n'ime ha kwuru sị na "mgbe a mwakporo ogbo anyị, a lara m ụlọ zute nne m, nna m na nwanne m nwaanyị n'uzo. E gburu ha niile ma gbaa ụlọ anyị ọkụ".

"Ọ bụ mgbe m si n'ụlọ anyị na-achọ ịpụ ka m hụrụ ndị omekome ahụ. Ha dinara m n'ike"

Nwaanyị ahụ sị "edu m nwa m dị naanị afọ isii, ha dinakwara ya n'ike. Ha nọ n'ihu anyị niile gbuo nwanne m nwoke"

Umụnwaanyị ndị nke ọzọ kọkwara akụkọ yiri nke a.

Ebe nchere oge ndị mmadụ bi.

Ebe foto si, Guerinault Louis/Anadolu/Getty Images

Nkọwa foto, UN kwuru na ihe karịrị ọkara ndị Haiti enweghịzị ụlọ ebe ha ga-ebi.

A na-ekwu na ndị omekome ahụ were ikike ịkwu ihe na-eme na Haiti. Ọ bụ ha na-ahụ maka ihe na-eme n'ọtụ ogbe.

Anyị sonyere ndị ọrụ nchekwa mbaụwa mee ngagharị mana n'ihe na-erughi otu ntabi anya, a gbaa egbe n'ụkwụ otu ụgbọala ha nke mere anyị jiri laghachị azụ.

Ndị ọrụ nchekwa mbaụwa adịghị ahụ ụgbọala ha ọbụla. Ndị maara ihe na-eme na mba ahụ kwuru na ndị omekome ahụ na-enweta ngwaagha kwa mgbe kwa mgbe.

Ndị ji egbe

Ebe foto si, BBC/ Phil Pendlebury

Nkọwa foto, Ndị nchekwa ogbe ebidola ichekwa onwe ha n'aka ha.

Ndị na-arụrụ ụlọọrụ nchekwa nọ na gọọmenti Haịti gwara BBC na e nwere ụlọọrụ ndị nkịtị bụ ndị na-eji droonu awakpo ndị omekome ahụ ọkachasị ndịisi ha. Ha sị na otu n'ime ụlọọrụ ndị nchekwa ahụ bụ nke ndị si mba Amerịka.

O gosiri anyị ihe onyonyo ha setere na droonu gosiri mgba a wakporo onyeisi ndị omekome ahụ aha ya bụ Ti Lapli. Ọ sị na ka a tụchara ogbunigwe ebe ọ nọ na ọ nọ "ọ dị ndụ ọnwụ ka mma". Mana BBC enweghị ike ịchọpụta ma ọ bụ eziokwu tupu akụkọ a apụta.

Foto gosiri etu ọnọdụ dị na Port-au-Prince.

Ebe foto si, BBC/ Phil Pendlebury

Nkọwa foto, Mkpamkpa ndị omekome a kpara e jiri mebie ọtụtụ ogbe

Lola Castro bụ onyeisi ngalaba United Nation na-ahụ maka nri nke a kpọrọ "UN's World Food Programme" kwuru na Port-au-Prince bụ "ebe kachasị njọ nwaanyị ga-ebi".

Ụmụnwaanyị nọ ebe a na-ata ahụhụ maka ọgbaaghara na-eme.

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump akwụsịla enyemaka si n'ụlọọrụ Amerịka a na-akpọ US Agency for International Development (USAID).

Mgbe anyị gara n'ọnwa Juun ka Ms Castro kwuru na ọ bụ ihe enyemaka ikpeazụ ka ha na-eke.

Ọ sị na nke a ga-emetụta ụmụnwaanyị e kwesịrị inyere aka.

Ms Manilla Arroyo si MSF kwuru na ịkwụsị ego a na-etinye n'ọgwụ na ihe e ji eme ka nwaanyị ghara ịdị ime ga-emetụta ọtụtụ ụmụaka bụ ndị e dinara n'ike.