Agha Sudan: BBC ekpugheela etu e siri gbuo ụmụ mmadụ ma dinaa ụmụ nwaanyị n'ike

Ebe foto si, Hafiza
- Onye dere ya, Heba Bitar
- Ndị mere akụkọ a, BBC Eye Investigations
- Ebeg o si, Darfur, Sudan
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 10
"O kwughị okwu ikpeazụ. Ọ nwụgo anwụ mgbe e butere ya," Hafiza kwuru dịka ọ na-akọwa etu e siri gbuo nne ya n'obodo eweghaara na Darfur n'agha obodo Sudan, nke malitere afọ abụọ gara aga.
Nwaanyị ahụ dị afọ iri abụọ na otu dekọta eto ndụ ezinaụlọ ya siri tụghara n'ihi ọnwụ nne ya, na otu n'ime ekwentị ụlọ mgbasa ozi BBC World Service gbalịrị zubata ebe ndị mmadụ tọrọ na nkwakọrịta mbọ ne-eme n'el-Fasher.
N'ihi ogbunigwe a na-atụ mgbe niile, ewepụla el-Fasher na mpụga ụwa ihe ruru otu afọ, nke mere ka ndị ntaakụkọ ghara ị banye n'obodo ahụ.
Maka ihe nchekwa, anyị na-eji naanị aha mbụ ndị chọrọ ịse ndụ ha ma kesaa akụkọ ha na ekwentị BBC.
Hafiza kọwaara etu ya ji bụrụ onye na-elekọta nwanne ya nwoke dị afọ ise na ụmụ nne ya nwaanyị abụọ.
Nna ha nwuru tupuu agha amalite, nke kpasuru ọgụ ndịagha megide ndịagha nnupụisi Rapid Support Forces (RSF) ma bute oke nsogbu enyemaka mmadụ n'ụwa.

Ebe foto si, Hafiza
Ndị otu abụọ a na-emekọrịta ihe mbụ – jikọrọ aka ọnụ n'otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị - mana daa maka atụmatụ mba ụwa kwadoro iwete ọchịchị ndị nkịtị.
Ụlọ Hafiza bụ obodo ikpeazụ gbara ọkpụrụpụ ndịagha weghaara na ugwu Darfur dị na ndịda Sudan mana ndịagha nnupụisi RSF weghaara ya kemgbe ọnwa iri na abuọ gara aga.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
N'ọnwa Ọgọst 2024, ogbunigwe dara n'ahịa ebe nne ya gara ire ngwaahịa.
Hafiza kwuru n'ihe onyonyo mbụ o nwetara mgbe ọ nwetasịrị ekwentị ya, obere oge ka nne ya nwụchara, sị: "Mwute siri ike, o kwebeghị ịga nleta ebe nne ya na-arọ ọrụ.
"Naanị m nọ n'ụlọ ebe akwa"
A na-ebo otu abụọ ahụ na-alụ ọgụ ebubo mpụ agha na ịkpachara anya na-emegide ndị nkịtị - nke ha na-agọnahụ. Otu ndịagha nnupụisi RSF agọnarịgo n'oge mbụ ebubo mba Amerịka na otu ndị na-ahụ maka ikike mmadụ na ọ na-eme igbukpọ megide agbụrụ abụghị Arabụ n'akụkụ Darfur mgbe o weghaara mpaghara ndị ahụ.
RSF bụ ndị na-ahụ maka ọpụpụ na mbata n'obodo mana oge ụfọdụ ha na-ekwe ka ndị nkịtị hapụ nke mere ka Hafiza nwere kpọpụ umụ nne ya ka ha gaa nọnyere ndị ezinaụlọ ha bi n'ebe agha adịghị.
Mana ọ nọọrọ ka ọ nwete ego o ji elekọta ha.
N'ime ozi ya, ọ kọwara etu o si na-ekesa akwa mkpuchi 'blanket' na mmiri enye ndị a chụpụrụ n'ebe obibi, na-enyere aka na kichin obodo na akwado otu ndị na-ahụ maka ọrịa kansa n'ara na nkwụghachi o nwete obere ego iji nyere ya aka.
Dịka nnanị ya na-anọ, si: "A na m echete etu nne ya na ụmụ nne ya si anọrọ ọdụ, nke mere ka malite ibe akwa", o kwuru.

Ebe foto si, Mostafa
N'ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ onynyo ọ bụla Mostafa dị afọ 32 zitere anyị, a na-anụ ka ụda mgbọ na egbe n'azụ ebe ọ nnọ.
"Anyị na-anagide ogbunigwe ndị RSF na-atụ ụtụtụ na ehihe", o kwuru
Ọ lọtara otu ụbọchị ọ gachara nleta ezinaụlọ ịhụ n'ogbunigwe tụrụ ụlọ ya dị n'etiti obodo, nwere mebie ọtụtụ ihe dịka ndị ohi kwasara ebe niile.
"A tụgharịrị ihe niile ihu. A kwakọrọ ọtụtụ ihe n'ụlọ anyị," ka o kwuru, na-ebo ndị RSF ebubo.
Mgbe Mostafa nọ na-arụ ọrụ ebere n'ebe nchekwa ndị a chụpụrụ achụpụ, a wakporo mpaghara ahụ nke ukwuu. Ọ na-edobe igwefoto ya ka ọ na-ezo, na-atụgharị na mgbawa ọ bụla.
"Enweghị ebe nchekwa na el-Fasher," o kwuru. "A na-atụkwa mgbọ ebe ndị agbara ọsọ agha bi."
Ọnwụ nwereike ịdakwasị onye ọbụla, oge ọbụla na adọghị aka na ntị...mgbọ, ogbunigwe,agụrụ na akpịrị ịkpọ nkụ.

N'ozi ọzọ, o kwuru maka enweghị mmiri dị mma ma kọwaa etu ndị mmadụ si aṅụ mmiri sitere n'ihe nsị mebiri.
Ma Mostafa na Manahel dị afọ 26, ndị nwetakwara ekwentị BBC, wepụtara onwe ya na kichin obodo, nke a na-akwado site na onyinye sitere n'aka ndị Sudan bi ebe ọzọ.
Ụlọọrụ UN adọọla aka na ntị na-agụrụ dị n'obodo ahụ bụ ihe megoro n'obodo ahụ dị nso n'ogige Zamzam nke mmadụ karịrị 500,000 a chụpụrụ n'ụlọ bi.
"Ọtụtụ ndị mmadụ anaghị agazi ahịa maka ha gaa, ngwaahịa na-adị oke ọnụ ahịa", Manahel siri kọwaa.
Ezinụlọ ọ bụla hà nhata ugbu a - enweghị ọgaranya maọbụ ogbenye. Ndị mmadụ enweghị ike ị nweta ihe ndị dị mkpa dịka nri."

Ebe foto si, Manahel
Mgbe ha siri nri dị ka osikapa na stew, ha na-ebugara ndị a chụpụrụ n'ebe obibi nri ahụ. N'ebe ọtụtụ nọ, ọ bụ naanị nri ha ga-eri n'ụbọchị ahụ.
Agha bidoro mgbe Manahel gụchaara Mahadum ebe ọ gụrụ 'Sharia na law'.
Mgbe agha rutere el-Fasher, ya na nne ya na ụmụ nne ya kwagara ebe agha adighị.
"Ụlọ gị ga-efunarị gị ma ihe niile ị nwere, i were hụ onwe gị n'ebe ọhụrụ na-enweghị ihe ọ bụla," ka ọ na-ekwu.
Mana nna ya ekweghị ahapụ ụlọ ha. Ụfọdụ ndị agbataobi nyefere ngwongwo ha o nwere nọrọ na-elekọta ihe ndị ahụ - mkpebi butere ọnwụ ya.
O kwuru na ọ bụ ndịagha RSF gburu ya n'ọnwa Septemba n'afọ 2024.

Ebe foto si, Manahel
Kemgbe agha malitere afọ abụọ gara aga, ihe ruru mmadụ puku abụọ anwụọla maọbụ merụọ ahụ n'el-Fasher dịka UN siri kwuo.
Ndị mmadụ anaghị hapụ ụlọ ha n'oge mgbede. E nweghị ọkụ eletrik na-eme ka ụjọ na-adị n'etiti otu nde mmadụ bi n'el-Fasher n'oge abalị.
Ndị nwere ọkụ anyanwụ maọbụ batrị na-atụ egwu ịgbanye ọkụ n'ihi na "ọ nwereike ịchọta ha site na duronu", Manahel na-akọwa.
O nwere oge anyị anaghị enwete ya maọbụ ndị ọzọ ogoloa ụbọchị n'ihi e nweghị ịtanetị.
Mana n'ime nchegbu ndị a niile, enwere otu egwu nke Manahel na Hafiza na-ekekọrịta ma ọ bụrụ na obodo ahụ dabara n'aka RSF.
"Dịka nwaanyị, e nwereike idina m n'ike," Hafiza kwuru n'ozi ya.
Ya, Manahel na Mostafa sitere n'obodo Afrịka na egwu ha sitere na ihe mere n'obodo ndị ọzọ RSF weghaara, ọkachasị el-Geneina, kilomita 250 (400km) ọdịda anyanwụ nke el-Fasher.

N'afọ 2023, ọ hụrụ ngbukpọ n'usoro agbụrụ, nke Amerịka na ndị ọzọ kwuru na ọ bụ mgbukpọ 'genocide'. Ndịagha nnupụisi RSF na ndịagha Arabụ jikọrọ aka boro ebubo na ha wakporo ndị sitere n'agbụrụ ndị Arabụ, dịka Massalit - nke RSF gọnahụrụ n'oge gara aga.
Otu nwaanyị m hụrụ n'ebe ndị gbara ọsọ agha bi n'okeala Chad kọwaara etu ndịagha RSF siri jikọ aka dinaa ya n'ike nke mere o jiri siere ya ike ịga ije ihe ruru izuaka abụọ ebe ụlọọrụ UN kwuru na eji ike edina obere ụmụ nwaanyị dị afọ iri na anọ.
Otu nwoke gwara m etu o siri bụrụ onye akaebe banyere ngbukpọ ndịagha RSF dịka ọ gbanarịrị ha mgbe ha merụrụ ya ahụ ma hapụ ya ka ọnwụọ.
UN na-ekwu na ihe ruru mmadụ puku iri (10,000) na puku iri na ise (15,000) ka e gburu na el-Geneina naanị na 2023. Ma ugbu a, ihe karịrị otu ụzọ n'ụzọ anọ nke nde mmadụ si n'obodo ahụ - ọkara ndị bibu ya - so na ndị bi n'ogige ndị gbara ọsọ ndụ na Chad.
Anyị nyere ndị a RSF ebubo ndi a mana ọ zaghị. N'oge gara aga, ọ gọnarịrị na ọ naghị etinye aka na mkpocha agbụrụ na Darfur, na-ekwu na ndị na-eme ihe ike na-eyiri uwe RSF.
Ndị ntaakụkọ ole na ole enwetala el-Geneina kemgbe ahụ, mana ka ha na ndị ọchịchị obodo nwechara mkparịtaụka ọnwa ole na ole, e kwere ka ndị otu BBC anyị bịa na Disemba 2024.

E nyere anyị ndị nlekọta n'ụlọ ọrụ gọọmenti, a na-ahapụkwa anyị ka anyị hụ naanị ihe ha chọrọ igosi anyị.
Nke a gosiri na ọ bụ ndịagha RSF na-achị, Ahụrụ m ndịagha ha ka ji ụgbọala ndịagha na-eche nche n'okporoụzọ ma soro ụfọdụ n'ime ha kparịtaụka obere oge, mgbe ha gosiri m ogbunigwe ha na-agbapụ rọkịt (RPG).
O teghị aka ịghọta otú ha si ele esemokwu ahụ anya n'ụzọ dị iche. Onye ọchịagha ha siri ọnwụ na ha abụghị ndị nkịtị dịka Hafiza, Mostafa na Manahel bi n'el-Fasher.
"Onye na-anọ na mpaghara agha na-ekere òkè n'agha, ọ dịghị ndị nkịtị, ha niile sitere na ndịagha," ka o kwuru.
O kwuru na el-Geneina nwere udo ugbu a yana n'ọtụtụ ndị bi na ya "ihe dịka 90%" alọghachila. "Ndị mmadụ ebirila n'ụlọ ndị tọgbọrọ chakoo na mbụ."
Ma ọtụtụ narị puku ndị bi n'obodo ahụ bụ ndị gbara ọsọ ndụ na Chad, ahụkwara m ọtụtụ ógbè ndị a gbahapụrụ agbahapụ na ndị e bibiri ebibi ka anyị na-anyagharị.

Dịka ndị nlekọta si ele anyị anya, ọ dịghị mfe anyị ise foto ma sete etu ọnọdụ dị na el-Geneina. Ha dugara anyị ebe a na-ere akwụkwọ nri bụ ebe m juru ndị mmadụ ajuju maka ndụ ha.
A chọpụtara m na ha nere onye nlekọta anya tupuu ha azaa m ajuju njuru ha sị na "ihe niile di mma" na-ewepụ ọnụ ahịa.
Mana onye nlekọta ahụ na-agwa m na ndị mmadụ na-ekwu ihe na-abụghị etu ọnọdụ si dị banyere ọnụ ahịa.
Anyị mechiri njem anyị n'oge anyị gbara Tijani Karshoum ajuju ọnụ,
Tijani bụ gọvanọ mpaghara ọdịda anyanwụ Darfur nke e gburu onye ọ nọchịtere anya ya n'ọnwa Mee 2023 ka o bochere ndị RSF ebubo igbu mmadụ n'ọha.

"Anyị malitere ikwu maka udo, ibikọta ọnụ, na ịchefu ihe mgbanwaobi mere n'oge garaaga" ka o kwuru ma kwukwaa na e bugoro ọnụ ọgụgụ ndị ọrụ UN e gburu na mpaghara ahụ.
N'ime ụlọ ahụ ka nwoke e mere ka anyị mara na ọbụ onye nnọchịta anya otu RSF.
Asịsa niile Karshoum nyere banyere ihe niile dịka ọ bụ otu ihe. Ihe niile m juru ya dịka igbu mmadụ n'igwe, ihe mere onye bụbu Gọvanọ aha ya bụ Khamis Abakar.
Naanị ihe dịka izu ụka abụọ m na Karshoum kpara ka otu jikọrọ Yurop manyere ntara m ahụhụ n'isi ya sị na "ọ maara ihe mere na nwakpo ndị ahụ butere ọnwụ mmadụ.
Ha sị na o so "na ndị kpara ya, nakwa ndị gosiri etu e si mee ya. ọ maara maka etu e si gbuo ndị mmadụ, maa ụmụnwaanyị elu n'ike, ịtọrọ ndị mmadụ na ihe ndị ọzọ".
N'oge m juru ya ajuju maka ebubo otu jikọrọ mba dị na Yurop boro ya ka ọ sị "kemgbe m bụ onye a na-enyo, ihe ọbụla m kwuru ugbua agaghị abụ ihe a ga-anabata dịka eziokwu"
Mana o kwuru na "ya esoghị na ndị nụrụ agha agbụru ma kwuo nay a nọ n'ụlọ ya mgbe niile a naanụ agha ahụ". Ọ sị nay a esoghị daa iwu mba ụwa.

Ebe foto si, Mostafa
Ọ bụrụ na ị nelee ihe niile m nụrụ nakwa okwu ndị na-achị el-Geneina amaghịm na ndị mmadụ ọ ga-alọghachịta ọzọ n'ụlọ ha.
Mmadụ ruru nde ire na abụọ bụ ndị Sudan gbara ọsọ, ọtụtụ bụ ndị nọ n'ụlọ ndị enweghị ebe obibi na ofesi nakwa n'ime Sudan.
N'ikpeazu, Hafiza, Mostafa na Manahel bidoro ndụ ọzọ n'el-Fasher mana n'ọnwa n´ọnwa Nọvemba 2024 ka ha niile gara bido ndụ ọhụrụ n'obodo ọzọ dị ha nso.
Ọ bụ naanị isi obodo ha bụ Khartoum nke ndịagha na-elekọta bụ naanị ebe fọrọ na Darfur ha na-achị dịka e mere el-Fasher bụrụ ebe a na-akwakọrịta mgbọ ugbua.
"El-Fasher na-atụ egwu," Manahel kwuru nke a dịka ọ na-ebukọta ihe niile ọ were ya.
"Anyị na-apụ ebe a na-amaghị ebe anyị ga-eje maọbụ ihe ga-eme anyị. Anyị ga-alọghachịta na mana ọ bụ mgbe agha kwụsiri. Mana anyị amaghị mgbe ọ ga-abụ"










