You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Mkpụrụosisi, akwụkwọ nri na ihe ndị ọzọ onye nwere nje HIV/Aids kwesịrị iri ka ahụ ya na-akwọ mụrụ mụrụ
- Onye dere ya, ikechukwu kalu
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
Na mmadụ na-arịa ọrịa HIV/Aids abụghị na a maala onye ahụ ikpe ọnwụ dịka ụfọdụ ndị na-eche na "ụwa agwụla."
E nwere ụfọdụ ihe onye nwere nje a kwesịrị ime ka ahụ ya na-adị na-adị mma nke gụnyere ịṅụ ọgwụ, iri nri, ịmegharị ahụ nakwa ihe ndị ọzọ.
Ụbọchị mbụ nke ọnwa Disemba ọbụla bụ ụbọchị pụrụiche ij ncheta nje HIV/Aids ma kụziere ndị nwere ya ọtụtụ ihe banyere ya.
BBC Igbo kpọtụụrụ ọkachamara n'ihe banyere nri bụ Amaka Ezeoke - onyeisi ụlọọrụ 'Nutrifit Wellness and Consult' ka onye ọ rụtụaka n'ụfọdụ nri ndị nwere nje HIV/Aids kwesịrị ịna-eri.
Ezeoke kwuru na o nweghi nri pụrụiche ha kwesịrị ịna-eri, kama na ọ bụ iri ezigbo nri ma rie ya mgbe o kwesịrị.
"E nwere ụfọdụ nri nwere akwụrụngwa pụrụiche ga-enyere ime ahụ aka n'ibuso nje a agha.
"Ihe ọzọ dị mkpa bụ ka onye nwee nje HIV/Aids na-eri ezigbo nri ọfụma ma na-aṅụ ọgwụ ya mgbe kwesịrị site na ntuziaka onye dọkịnta."
Ụfọdụ nri ndị a gụnyere;
Mkpụrụosisi
Ọ sị na onye nwere ọrịa HIV kwesịrị ịna-aracha mkpụrụosisi nke ọma nakwa n'oge niile, na ọ na-enye aka ibulite vitamin na minaral dị n'ahụ onye ahụ iji buso nje ahụ HIV/Aids agha.
Mkpụrụosisi ndị dịka oroma, ọkwụrụ Bekee, apụl, unere, ube, anyụ Bekee dgz, ndị dị mma na-abụghị ndị rere ere.
Akwụkwọ nri
O kwuru na onye ahụ kwesịrị iri akwụkwọ nri nke ọma na-abụghị nke rere ere maọbụ nke e sigwọrọ esigwọ, na akwụkwọ nri na-enyekwa akụrụngwa vitamin na minaralụ n'ahụ - nke na-enye aka ibuso ọrịa ahụ agha.
Akwụkwọ nri ndị a gụnyere ụgụ, tomanto, ọha, onugbu, kukumba na karọt na ndị ọzọ.
Nri ndị e siri n'ọkụ
Onye ahụ ga na-eri nri ndị e siri n'ọkụ nke ọma na-abụghị mgbe niile ọ na-eri nri eghere eghe.
Nri ndị a gụnyere osikapa, ji, akwa, nduku, ofe na garrị, akwa, mmiri ara ehi dgz.
Ọ gara n'ihu kwuo na onye ahụ kwesịrị ị na-eri nri e siri n'ụlọ ya na-abụkarịghị nke e siri n'ezi, ọ zụtara azụta.
Nke ọzọ bụ na ọ ga-asapụ aka ya ọcha tupu ọ na-eri nri ọbụla ọ chọrọ iri.
Ịṅụ ezigbo mmiri
Dịka ahụ onye ọbụla chọrọ mmiri, etu a ka ahụ onye nwere nje HIV/Aids chọkwaa mmiri.
Nke a pụtara na onye ahụ agaghị eji ịṅụ mmiri egwu egwu, o nwereike ịṅụkwa ihe ndị ọzọ nwere mmiri dịka mmiri a pịpụtara na mkpụrụosisi nke Bekee kpọrọ 'juice'.
"Gbaara nri nwere oke nnu na ọtọbịrịbịrị ọsọ
Ezeoke kwuru na onye nwere nje HIV/Aids ekwesịghị iri nri nwere oke nnu na ọtọbịrịbịrị, maka na nri dị etu a na-emetụta mkpụrụobi mmadụ n'ụzọ na-adịghị mma.
"Belata aka n'iri nri nwere oke abụba na mmanụ"
"Na-agbanyeghi na abụba na-enye ike n'ahụ, ọ bụghị ya mere ka onye nwere nje HIV/Aids ga-eji rie ya nke ukwuu.
"O kwesịrị ibelata etu o si eri ya maka ọrịa mkpụrụobi."
Ezeoke gara n'ihu nye ndị nwere nje HIV/Aids ndụmọdụ ka ha na-emegharị ahụ kwa mgbe kwa mgbe, maka na ọ na-enye aka imezi ahụ.
Ọ sị na nke kachasị mkpa bụ ka onye ahụ ṅụọ ọgwụ ya dịka o kwesịrị, rie ezigbo nri dosa aka ya na onwe ya ọcha ma megharịa ahụ nke ọma.
Na onye ọbụla na-agbaso usoro a ga-enwe ezi ahụike nke na-agaghị egosi na o nwere nje HIV/Aids ma dịkwuo ndụ.