Mkpụrụosisi, akwụkwọ nri na ihe ndị ọzọ onye nwere nje HIV/Aids kwesịrị iri ka ahụ ya na-akwọ mụrụ mụrụ

Mkpụrụosisi, mmiri ọṅụṅụ na akwụkwọ nri

Ebe foto si, BBC/Getty Images

    • Onye dere ya, ikechukwu kalu
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Na mmadụ na-arịa ọrịa HIV/Aids abụghị na a maala onye ahụ ikpe ọnwụ dịka ụfọdụ ndị na-eche na "ụwa agwụla."

E nwere ụfọdụ ihe onye nwere nje a kwesịrị ime ka ahụ ya na-adị na-adị mma nke gụnyere ịṅụ ọgwụ, iri nri, ịmegharị ahụ nakwa ihe ndị ọzọ.

Ụbọchị mbụ nke ọnwa Disemba ọbụla bụ ụbọchị pụrụiche ij ncheta nje HIV/Aids ma kụziere ndị nwere ya ọtụtụ ihe banyere ya.

BBC Igbo kpọtụụrụ ọkachamara n'ihe banyere nri bụ Amaka Ezeoke - onyeisi ụlọọrụ 'Nutrifit Wellness and Consult' ka onye ọ rụtụaka n'ụfọdụ nri ndị nwere nje HIV/Aids kwesịrị ịna-eri.

Ezeoke kwuru na o nweghi nri pụrụiche ha kwesịrị ịna-eri, kama na ọ bụ iri ezigbo nri ma rie ya mgbe o kwesịrị.

"E nwere ụfọdụ nri nwere akwụrụngwa pụrụiche ga-enyere ime ahụ aka n'ibuso nje a agha.

"Ihe ọzọ dị mkpa bụ ka onye nwee nje HIV/Aids na-eri ezigbo nri ọfụma ma na-aṅụ ọgwụ ya mgbe kwesịrị site na ntuziaka onye dọkịnta."

Ụfọdụ nri ndị a gụnyere;

Mkpụrụosisi

Mkpụrụ osisi na-eme ahụ mmadụ gbasie ike n'ibuso nje HIV/Aids agha

Ebe foto si, Chidinma Njoku

Ọ sị na onye nwere ọrịa HIV kwesịrị ịna-aracha mkpụrụosisi nke ọma nakwa n'oge niile, na ọ na-enye aka ibulite vitamin na minaral dị n'ahụ onye ahụ iji buso nje ahụ HIV/Aids agha.

Mkpụrụosisi ndị dịka oroma, ọkwụrụ Bekee, apụl, unere, ube, anyụ Bekee dgz, ndị dị mma na-abụghị ndị rere ere.

Akwụkwọ nri

Akwụkwọ nri gụnyere ụgụ, tomato, ọha, onugbu, kukumba, karọt na ndị ọzo.

O kwuru na onye ahụ kwesịrị iri akwụkwọ nri nke ọma na-abụghị nke rere ere maọbụ nke e sigwọrọ esigwọ, na akwụkwọ nri na-enyekwa akụrụngwa vitamin na minaralụ n'ahụ - nke na-enye aka ibuso ọrịa ahụ agha.

Akwụkwọ nri ndị a gụnyere ụgụ, tomanto, ọha, onugbu, kukumba na karọt na ndị ọzọ.

Nri ndị e siri n'ọkụ

Ofe egusi na nri ọka nri ọka

Ebe foto si, Getty Images

Onye ahụ ga na-eri nri ndị e siri n'ọkụ nke ọma na-abụghị mgbe niile ọ na-eri nri eghere eghe.

Nri ndị a gụnyere osikapa, ji, akwa, nduku, ofe na garrị, akwa, mmiri ara ehi dgz.

Ọ gara n'ihu kwuo na onye ahụ kwesịrị ị na-eri nri e siri n'ụlọ ya na-abụkarịghị nke e siri n'ezi, ọ zụtara azụta.

Nke ọzọ bụ na ọ ga-asapụ aka ya ọcha tupu ọ na-eri nri ọbụla ọ chọrọ iri.

Nri ndị eghere eghe

Ịṅụ ezigbo mmiri

Mmiri ọṅụṅụ

Ebe foto si, Getty Images

Dịka ahụ onye ọbụla chọrọ mmiri, etu a ka ahụ onye nwere nje HIV/Aids chọkwaa mmiri.

Nke a pụtara na onye ahụ agaghị eji ịṅụ mmiri egwu egwu, o nwereike ịṅụkwa ihe ndị ọzọ nwere mmiri dịka mmiri a pịpụtara na mkpụrụosisi nke Bekee kpọrọ 'juice'.

"Gbaara nri nwere oke nnu na ọtọbịrịbịrị ọsọ

Ọ bụghị nnu niile ka a na-eri eri

Ebe foto si, Getty Images

Ezeoke kwuru na onye nwere nje HIV/Aids ekwesịghị iri nri nwere oke nnu na ọtọbịrịbịrị, maka na nri dị etu a na-emetụta mkpụrụobi mmadụ n'ụzọ na-adịghị mma.

"Belata aka n'iri nri nwere oke abụba na mmanụ"

Udu mmanụ

Ebe foto si, Getty Images

"Na-agbanyeghi na abụba na-enye ike n'ahụ, ọ bụghị ya mere ka onye nwere nje HIV/Aids ga-eji rie ya nke ukwuu.

"O kwesịrị ibelata etu o si eri ya maka ọrịa mkpụrụobi."

Ezeoke gara n'ihu nye ndị nwere nje HIV/Aids ndụmọdụ ka ha na-emegharị ahụ kwa mgbe kwa mgbe, maka na ọ na-enye aka imezi ahụ.

Ọ sị na nke kachasị mkpa bụ ka onye ahụ ṅụọ ọgwụ ya dịka o kwesịrị, rie ezigbo nri dosa aka ya na onwe ya ọcha ma megharịa ahụ nke ọma.

Na onye ọbụla na-agbaso usoro a ga-enwe ezi ahụike nke na-agaghị egosi na o nwere nje HIV/Aids ma dịkwuo ndụ.

Nje HIV/Aids n'ọnụọgụgụ

Aha onyonyo, World Aids Day: HIV n'ọnụ ọgụgụ