Onye ọbụla hụrụ Chinedu 'Chinmark' Ijiomah biko kpọtụrụ anyị - Interpol

Ọ na-ewu na soshal Midia na ndị uweojii na Interpol ezipụla akwụkwọ ozi nke ha jiri kwuo na onye hụrụ Ijiomah Marksman Chinedu e ji Chinmark maara nwuchie ya ma kpụga ya n'ụlọọrụ ndị uweojii nọ ya nso.
Ijiomah bụ onyeisi ụlọọrụ ji ego achụego a kpọrọ Chinmark a na-ebo ebubo nrụrụaka na ịnapụ ọtụtụ ndị mmadụ ego ha n'ụzọ ezighị ezi.
Nke a na-eso akwụkwọ ozi nke sị n'ụlọọrụ osote onyeisi ndị uweojii Naịjirịa, Interpol na isi ụlọọrụ ndị uweojii jikọrọ aka wepụta iji kwuo na ha na-achọ Mazi Ijiomah Marksman Chinedu achọ.

Ebe foto si, Nigerian Police
Onye uweojii bụ Detective Jonah Auta gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na ha na-achọ Mazi Ijiomah achọ.
Akwụkwọ ozi a kwuru na ndị uweojii na-achọ ya maka nrụrụaka ịntaneti na iji ụzọ aghụhọ napụ ndị mmadụ ihe ruru nde narị naịra anụ na iri asatọ, na puku iri na atọ (N480,013,000).
Akwụkwọ ozi a kwuru ka onye jidere Ijiomah kpụga ya ụlọọrụ ndị uweojii nọ ya nso.
Ihe Amanda Chisom bụ onye kwadoburu ụlọọrụ Chinmark gwara BBC Igbo maka ọchụchọ Ijiomah

Ebe foto si, Amanda Chisom/IG
Nwada bụ Amanda Chisom bụ onye na-akwalite ụlọọrụ na soshal Midia nke bụ 'Social Media Influencer' na Bekee gwara BBC Igbo na oteela aka ọ na-eche mgbe ndị uweojii ga-ebido ịchọ Ijioma.
Chisom so na ndị nyere aka gbasaa ozi maka ụlọọrụ Chinmark.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Kama o kwuru na aka ya dị ọcha maka etu e siri zuru ego ndị mmadụ ma na-ekwu kwa na ego ya tọrọ n'aka ụlọọrụ Chinmark.
Ọ gwara BBC sị, " Ọ gafeela otu afọ m na-ele anya ka ha nwuchie Ijiomah, n'ihi na ha hapụrụ ya na-enye anyị bụ ndị 'Influencer' nsogbu".
Chisom kwukwara sị, "Kama a na m eche na ọ bụrụ na ị chọrọ ịchọta mmadụ, mgbe ị gwara ọha na ị na-achọ ya, e chere m na ọ ga-eme ka onye ahụ zoo onwe ya nke ọma".
O kwukwara sị, "Oteela aka m na-agwa ndị mmadụ na Chinmark anọghịzi na Naịjirịa. Ọ bụ kamgbe jenụwarị 2, afọ 2022 ka mụ na ya kwusọrọ okwu".
Chisom gara n'ihu kwuo, " Achọrọ m ka e jide Chinmark n'ihi na e jide ya, ọ ga-egosi na aka m dị ọcha, ike mkparị a na-akparị m agwụla m, a chọrọ m ka e jide nwoke a".
O kwukwara na akụkọ na-ekwu na ndị uweojii na Interpol kpọrọ ya nso nso a abụghị eziokwu na ya na ndị ụlọọrụ Interpol na-arụkọ ọrụ kamgbe.
O kwuru sị, "Egosila m ihe niile gosiri na ihe m bụ naani 'Influencer'.
Ndị Interpol ji akara ekwentị m, ọ bụrụ na ha chọrọ ịhụ m ha ga-akpọ m... ha agbachiela ọbaego m kamgbe ihe karịrị ọnwa isii".
Chisom kwuru na ọ bụ Ijiomah ka ha na-achọ na ọ bụghị ya ka ha na-achọ.
Onye bụ Ijiomah Chinedu (Chinmark)
Chinedu Ijomah na-ewu kemgbe na soshal midia maka etu ndị mmadụ si pụta na-ekwu na o kweghị akwụ ha ụgwọ o ji ha dịka ụfọdụ n'ime ha tinyere ego ha n'ụlọahịa ya iji nweta isi ego na ọmụrụnwa.
Ọ bụ onye a maaama ka onye ojiego achọ ego nwere ọtụtụ ụlọọrụ ebe ana-akọ ugbo, na-agbasa ozi ma na ụlọoriri.
Ndị mmadụ ma ya dịka onye na-enye ọha aka.
O lụọla nwunye ma mụkwa ụmụ.
Mana Chinedu Marksman kwuru na ha na-aga ije ya iji mata ma SEC ọ ga-akpọpere ha ọbaego ha niile.









