‘Ndị ogbe m chere na isi adịghị m mma’ - Nwoke na-azụ ọchịcha

Aha onyonyo, Cockroach farming: ‘Ndị ogbe m chere na isi adịghị m mma’ - Nwoke na-azụ ọchịcha

Otu nwoke onye kapinta si mba Tanzania mere ihe tụrụ ndị mmadụ n'anya oge ọ malitere ịzụ ọchịcha.

Azụmaahịa ya na-eme nke ọma na mpaghara ụwa dịka Chaịna bụ ebe a na-azụ ma na-ere ụdịrị ọchịchị dịka ha na-ata ya ka nri.

Mana nke nwoke bụ ihe ịtụnanya nye ndị mmadụ n'obodo ya, maka na a hụtụbeghi ya na mbụ.

Nke a mere ọtụtụ jiri na-eche na isi adịchaghị nwoke ahụ mma.

Kirie ihe onyonyo ya n'uju.

Nwoke na-azụ ọchịcha

Onye tụgharịrị akụkọ a: Chioma Nkemdilim Daramola.