Sujimoto: Onye bụ nwamadị a Gọọmenti Enugwu boro ebubo igwu ha chandum ijeri naịra 5.7?

Olasijibomi Ogundele nwe ụlọọrụ Sujimoto Luxury Construction Limited na Peter Mbah bụ Gọvanọ Enugwu Steeti

Ebe foto si, Sujimoto Construction Limited

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Gọọmenti Enugwu Steeti ka na-ekwusike na Maazi Olasijibomi Ogundele nwe ụlọọrụ Sujimoto Luxury Construction Limited gwuru ha chandum ma buru ego ruru ijeri naịra ise na ụma asaa (N5.7bn) gbaa ọsọ.

N'ozi kọmishọna mgbasaozi bụ Malachy Agbo wepụtara, o boro ebubo na Ogundele nwetere ọrụ ngo n'aka gọọmenti Enugwu ịrụ ụlọakwụkwọ ọgbara ọhụrụ a kpọrọ "Smart School" dị iri abụọ na abụọ n'ebe dị iche iche na steeti ahụ.

O kwuru na ngwa ngwa a kwụrụ ya ọkpụrụkpụ ego dị ijeri naira ise na uma asaa (N5.7bn) ka ọ malite ọrụ na nwamadị ahụ furu na-ahụzighi ya anya ọzọ.

Gịnị dị n'akwụkwọ nkwekọrịta Sujimoto na Gọọmenti Enugwu?

Maazị Malachy Agbo kwuru "i ji doo anya, ọ bụ n'ọnwa Julaị afọ 2024 ka gọọmenti Enugwu nyere Sujimoto Luxury Construction ọrụ ngo n'ọnụego ijeri naịra iri na otu, nde narị iri anọ na iri ise na asaa na puku narị itoolu na puku iri atọ, narị itoolu na iri ise. (N11,457,930,950.52) ka ha rụọ ụlọakwụkwọ "Smart School" iri abụọ na abụọ n'ime ọnwa isii.

"Gọọmenti nyere ya ọkara ego ahụ bụ pasentị (50%) ka ọ malite ọrụ. Ọ gara n'ihu na-arụ ụlọ adịgboroja ma were ndị ọrụ injinia na-amaghị ọrụ, na-arụ ihe abụghị nkwekọrịta ntọala ya na gọọmenti nwere."

Nke ka nke bụ na o buuru ego ahụ gbaa ọsọ ma a na-achọ ya achọ.

E ruuru n'ụbọchị 8 na 9 nke ọnwa Mee, 2025, ndị ụlọọrụ na-ebuagha megide mpụ na nrụrụaka ego bụ EFCC na mịnịstrị na-ahụ maka ọrụ kpagharịrị n'ụlọakwụkwọ iri abụọ na abụọ ma chọpụta na o nweghi ihe dị mma ọ rụrụ.

"Anyị chọpụtakwara na ọ naghị aga n'ihu ọrụ chaa chaa ma chọpụtakwa na mpụ na nrụrụaka dị n'etu si nara gọọmenti Enugwu ego site n'ụlọakụ abụọ bụ Jaiz Bank na Zenith Bank."

Ha gara n'ihu gwa ndị Enugwu ka ha ghara ịna ntị n'akwa aghụhọ Olasijibomi Ogundele na-ebe na soshal midia ma kwuo ka ọ gaa zara ọnụ n'ụlọọrụ EFCC etu ya na ego ahụ si gaa.

Ihe Sujimoto sara n'ebubo e boro ya

Olasijibomi Ogundele

Ebe foto si, Sujimoto Construction Limited

Maazị Olasijibomi Ogundele wepụtara ihe onyonyo ebe o ji anyammiri akwa na-ekwu na ọ bụghị onye ohi nke o ji abụ onye na-egwu chandum.

Ọ gara n'ihu kwuo na ego e nyere ya ezughi ịrụ orụ ahụ gọọmenti na-achọ maka na ngwaọrụ etinye ego karịa ka ọ dị mgbe e nyere ya ego ahụ.

Ọ kwara arịrị na e ji n'ihi nke a emebi ezigbo aha ya'

"Akụrụngwa e ji arụ ọrụ ariala elu, nke mere na ego ahụ agaghị arụli ụlọakwụkwọ ndị a.

O boro Gọọmenti Enugwu ebubo na ha ewetaghi ego oge ha kwesiri iweta ya.

Olasijibomi Ogumdele bụ onye a ma ama n'irụ ụlọ dị oke ọnụahịa n'obodo Legọs, Abụja nakwa ebe ndị ọzọ.

Ọ gbara afọ iri anọ na atọ ma bụrụ nwafọ Ekiti steeti.

O kwuru na ọ ga-aga zara ọnụ ya n'ụlọọrụ EFCC n'oku ha kpọrọ ya.

Lee ụfọdụ ụlọakwụkwọ 'smart school' ndị a sị ọ rụru

Ụlọakwụkwọ a na-arụ arụ na Nsude, Udi

Ebe foto si, Enugu State Government

Nkọwa foto, Ụlọakwụkwọ a na-arụ arụ na Nsude, Udi
Ụlọakwụkwọ a na-arụ arụ n'Obeleagu Umuana

Ebe foto si, Enugu State Government

Nkọwa foto, Ụlọakwụkwọ a na-arụ arụ n'Obeleagu Umuana
Ụlọakwụkwọ a na-arụ arụ n'Amaeke Nnachi

Ebe foto si, Enugu State Government

Nkọwa foto, Ụlọakwụkwọ a na-arụ arụ n'Amaeke Nnachi
Ụlọakwụkwọ a na-arụ arụ n'Obinofia, Ezeagu

Ebe foto si, Enugu State Government

Nkọwa foto, Ụlọakwụkwọ a na-arụ arụ n'Obinofia, Ezeagu