You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe niile ị kwesiri ịma ọria ‘Dengue’ na-efe na Naịjiria
Ngalaba na-ahu maka mgbochi ọrịa na Naịjirịa bụ NCDC na Bekee e kwuola na ọrịa Dengue atụọla ọtụtụ mmadu na Sokoto steeti na mpahara ugwu na ndida Naịjirịa.
Dịka ngalaba na-ahụ maka ahụịke na mba uwa bụ WHO siri kwu,‘’ọrịa ‘’Dengue’’ bụ orịa na-esi na anwunta e fee mmadu.
Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa amatala na ọrịa Dengue a tiwapula n’Sokoto steeti.
Etu osiri gbata kwụrụ,e nwere mmadu 71 ana-enyocha na ha e bụtela ọrịa a, agbaala akaebe na mmadu 13 bu ya bụ ọrịa. E nwebeghị onye ọrịa ahụ gburu na Sokoto.
‘’Ugbua a chọpụtala ọria Dengue n’okpụrụọchịchị atọ n’ime Sokoto steeti.
Ọkpụrụọchịchị ndi ahụ bụ: Sokoto saụt(60) Wamako(3), Dange Shuni(1)ngalaba na-ekwuchitere NCDC kwuru nke a.
Ha kwuru na ha-na ụlọorụ ndị ọzọ e tinyela aka ị hụ na ọrịa ahụ e tinwapụghị n’steetị ndi ọzọ na Naịjirịa.
‘’Nanị okpụrụọchịchị atọ ka ọrịa metụtara na Sokoto steeti, e weghị onye nwụrụ ma ọ bụ onye ọnọdụ ya dị oke njọọ’’. ha kwuru nke a.
Na mmechị, ha kwurụ na Naịjirịa di njikere ị bụsọ ọrịa ahu agha ma onwe ka ọsị ka njọọ.
Kedu ihe ndị na-egosi ịba ‘Dengue’
Ụlọọrụ na-ahụ maka ahụike mba ụwa bụ WHO e kwuola na ọrịa ‘Dengue’ bụ otu n’ime ọria ịri kachasi emebi ahụike egwu n’ụwa.
Ọ bụ otu ọrịa ana-ebute n’onwunta kachasi efe efe, ọkara n’ọnụọgụgụ mba ụwa niile nwere ohere i bụte ọrịa a.
Ọrịa ndi ọzọ ana-ebụte n’anwụnta bụ ‘’chikungunya’’ na ‘’Aedes albopictus’’.
Ihe e jiri mara ọrịa ndi a bụ na ọtụ usoro ka e ji egbochi ha, ha anaghị ebute ịsịọwụwa, ahụmgbu, ma ọ bụ ahụọkụ, mere o ji ahiaarụ ị chọpụta ya.
Ngosi ‘Dengue’ adighị akarị abali abụọ rụọ abali asaa.
Ịba ‘Dengue’ nwere ịke ị bụte nsogbu n’arụ ụfodu ndi, o nwere ike ime ka anyụrụ ma ọ bụ imi gba ọbara nakwa ọrịa umeju.
Ọrịa a bụ ihe kwesiri ị lebanye maka na ọ nwere ike ị gbu mmadu.
E nwere ike ị chọpụta ọrịa site n’eme ntule ana-akpọ ‘’polymerase chain reaction’’ (PCR) akabeghị nwe ọgwụgwọ ya.
A malitela ịrụ ọgwu mbochi ịba Dengue na mba ufodu, mana o rutebeghi Afrịka niile.
Etu ị ga esi gbochi ịba Dengue
Otu dọkịta na-arụ n’ụlọọgwụ Rigasa dị na Kaduna steeti, aha ya bụ Usman Qalbusunnah kwuru na etu e si egbochi ịba nkịtị ka e si egbochi ịba Dengue.
Usoro dịka ịhi ụra n’okpụru nche anwunta, ị sụchasị ọhia nọ na okirikiri ụlọ gi bụ usoro e ji egbochi ịba Dangue.
Dọkịta ahụ mere ka anyi mata na ọ bụ anwunta na-akpata ya bụ Dengue.