WhatsApp ọ na-akwado inye ndị mmadụ ohere isi na ya akpata ego igwe?

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Zoe Kleinman
- Ndị mere akụkọ a, Technology editor
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
Igwe nziritaozi na soshal midia bụ WhatsApp etinyela akụrungwa atọ ọhụrụ n'ọbaozi ha nke ga-adịre na mbaụwa niile.
Ụlọọrụ Meta nwee ya kwuru na akụrụngwa a kpọrọ ads bụ ịgbasaozi azụmaahịa agaghị egosi n'ọbaozi ndị mmadụ nke zoro ezi maọbụ ozi ha zoro ezo.
Kama WhatsApp ga-eji mba, obodo nakwa asụsụ onye ahụ ji nakwa ndị ha nay a na-akparịtaụka wulite ụdịrị ihe ngosi onye ahụ ga na-enwete n'ọbaozi ya.
Ndị jikọtara akara WhatsApp na nke Facebook maọbụ Instagram ha ga-enwe ohere ịna-ahụta mgbasaozi azụmaahịa (ads) karịa ndị ọzọ.
Kedụ etu akụrụngwa ọhụrụ a ga-esi arụ ọrụ?

Ebe foto si, Getty Images
WhatsApp kwuru na ndị na-eji akara ha ezirita ozi n'ụwa ruru mmadụ otu ijeri na ụma ise n'ụwa (1.5m).
Onye nwere akara WhatsApp chanelụ nwereike ịgbasa ozi azụmaahịa (ads) iji dọta mkpụrụobi ndị ọhụrụ ga na-eso ya.
O nwekwara ike ị sị ndị mmadụ kwụọ ụgwọ tupu ha enwete ozi pụrụiche ọ na-agbasa na chanelụ ya.
Ụlọọrụ WhatsApp ga-ewere pasentị iri (10%) n'ego ahụ, onye ahụ nwekwara ike inwetekwu ego site n'ogogo 'app store' site n'etu ogogo azụmaahịa ya si dị.
Ndị nwere ụlọọrụ nwereike ịgbasaozi banyere ngwaahịa ha site n'akụrụngwa 'whatsapp status' dịka etu o si dị n'Instagram, ma jikọọ ya na ọbaozi mkparịtaụka ma ọ bụrụ apịa aka n'akara ya.
Onye ọkachamara n'ihe banyere soshal midia bụ Matt Navarra gwara BBC na ụlọọrụ Meta "na-atọ ntọala ka WhatsApp bụrụ ọbaozi ndị mmadụ ga na-esi enwete ego n'ebe ọ dị ukwuu".
Mana "ime ka ọ bụrụ ebe a ga-esi na-enwete ego, dịka ọ ga-ezo nziritaozi ndị mmadụ ezo, ga-abụkwa ihe ize ndụ nye ọtụtụ ụlọọrụ, ka ọ gbakwụnyere.
O kwuru na ndị nke a ga-emetụta karịa bụ ndị Briten na Yurope, dịka ha na-ahụta WhatsApp dịka ebe nzirita ozi, uche adịchaghị n'ịgbasaozi azụmaahịa (ads).
"Ọ bụrụ na ahụta WhatsApp dịka ọbaozi ebe a na-eme mkpọtụ dịka Facebook, na ọ ga-eme ka ọtụtụ mmadụ gbahapụ ya."
'Nkwalite ohere nziritaozi'
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Akụrụngwa ọhụrụ a ga-eme ka WhatsApp yie ọbaozi soshal midia ndị ọzọ dịka Facebook na Instagram.
"N'ezie ha niile bụcha otu," ka onyeisi WhatsApp bụ Will Cathcart kwuru.
"Anyị nwere akụrụngwa 'stories' n'ọbaozi Facebook, Instagram na WhatsApp mana ugbua a ga-enye ohere ka ndị nwere ngwaahịa na-agbasaozi banyere ngwaahịa ha na WhatsApp, anyị cheere na ọ bụ ihe dị mma."
O kwuru na nke a bụ "ịkwalitekwu ohere nziritaozi" na akụrụngwa ndị a adịghị iche ka ọ dị n'ọbaozi ndị ọzọ na-ama ya aka dịka Snapchat na Telegram.
Navarra na-ahụta nke a dịka ịbanye n'ọgbọ ọzọ n'ọbaozi soshal midia.
"Ọtụtụ ndị mmadụ anaghị eji ike ekesazi ihe na soshal midia kama nziritaozi na ikiri 'stories' na-arị elu.
Meta chọrọ ịgbanwe WhatsApp mana ndị na-eji ya ezi ozi amaghị, ọ bụrụ na ha mee ka o yizie ọbaozi ndị ọzọ e ji agbasaozi azụmaahịa, o nwereike ime ka ndị mmadụ kwụsị iji ya akparịtaụka maọbụ wepụ ntụkwasị obi na ya."
"Di feed dey die, public sharing dey down, pipo dey retreat into DMs and Stories in small groups," e tok.
"Meta dey try turn WhatsApp to platform without users realising it and if dem move too fast or e begin dey look like anoda ad network, pipo fit stop to dey use di app or worse, distrust di app."
Maazị Cathcart bụ onyeisi 'Whatsapp' kwuru na ọ bụghị iwu na mmadụ niile ga-eji ya na-agbaozi azụmaahịa. Na ha anaghị amanye ndị mmadụ n'ike ịhụ ozi ndị a maọbụ soro chanelụ ọbụla.
"Achọrọ m ikwusi ike na nke a agaghị emetụta ọbaozi gị (inbox).
"Ọ bụrụ naanị mkparịtaụka ka ị na-eji WhatsApp eme, ị gaghị ahụ ya mgbasaozi azụmaahịa (ads) ndị ahụ.
"Achọrọ ime ka o doo gị anya na mgbanwe a agaghị emetụta ọbaozi gị."
O kwuru na akụrụngwa ọhụrụ ndị a apụtachaghị ihe n amba UK kama na ọ gbapụtara ihe na mpaghara ụwa ndị ọzọ.
Ọ gara n'ihu kwuo na ha ka na-anwale ọhụrụ ndị a iji maara ebe a ga-agbanwe maọbụ ndị ga-adịgide.








