Electricity Tariff Hike: ''Ọ dị ka anyị ga-alaghachi n'ịmụ ọkụ mpanaka ugbua”

Ebe foto si, ekdc
Mbulị e buliri ọnụego ọkụ latrik na Naijiria ugbua bụ okwu a kpụ n’ọnụ.
Ndị ọrụ na echekwaba ka esi ekesa ọkụ Latrik na Naijiria bụ NERC n’aha ịchafụ wepụtara ozi n’izu ụka gara aga gwa ndị nkesa ọkụ akpọrọ Discos ka ha malite tinye ego akatamkpo ọhụrụ na ime ego ole a na-ana n’ụgwọ ọkụ.
Ego ọhụrụ ahụ pụtara na esila na N68 bụlie egọ otu kilowatt gaa N255 maka ndị nọ na band A.
Dịka ndị NERC siri kọwaa, band A bụ ndị na-enewta ọkụ latrik oge ruru awa 20-24 kwa ụbọchị.
Ebe band B rue E bụ ndị na-enwe ọkụ Latrik awa 16 gbadaa.

Ebe foto si, getty
Kedu ka mbuli a ga-esi metụta gị?
Ihe ọpụtara bụ na ezi-na-ụlọ na eji ọkụ di 50kva kwa ụbọchị, ga akwụ ego karịrị N350,000 kwa ọnwa, nke pụtara N4m kwa afọ.
Ọpụtakwara na ọkụ ejibu ego dika N10,000 egota ga-abụzị N40,000 ugbua.
Ndị mmadụ n’akwa arịrị ebe niile
Ọtụtụ ndị mmadụ anyị gbara ajụjụ ọnụ ekwuola na ya bụ mbuli n’ọnụ ego kariri akari.
N’Enugwu otu onye bi na Inedendence Layout gwara BBC na obi adighị ya mma n’ihi na ya ọkụ ya jiri N10,000 gota na pre-paid meter ya ụnyịahụ enweghị isi ma ncha.
Otua kwa ka ọ dị na Lagos ebe ha maliteworo ire ya bụ ọkụ n’ego ọhụrụ.
Ndị nke “Estimated Billing” ga enwekwa ya bụ mbuli n’ọnụ ọgụ.









