You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
2023 Governorship Elections: Nchikọta ihe ndị mere na ntuliaka ọkwa gọvanọ
Nchịkọta ihe ndị mere na ntuliaka gọvanọ 2023
Dịka ụlọọrụ Inec siri kwuo, ntuliaka ọkwa gọvanọ gara n’ihu na steeti 28 n’ụbọchị Satọọde ebe ntuliaka ndị ụlọomeowu steeti gakwara n’ihu na steeti niile nọ na Naịjirịa n’otu ụbọchị ahụ.
Ntuliaka e mere gara siriri werere n’akụkụ ụfọdụ ebe dịka akụkụ ụfọdụ akụkụ ndị ọzọ zutere, nkụsa ntuliaka, nzuru ihe ọrụ ndị Inec, mwakpo n’aka ndị agboro.
Ụfọdụ ebe akụkọ ihe ndị etu a metụtara gụnyere Legọs, Anambra, Rivers, Delta, Ebonyi, Bayelsa, Imo, Cross Rịvas, Enugu, Ogun, Benue na Oyo.
Site n’ihe a hụrụ n’anya, ndị pụtara tụọ vootu na ntuliaka ibughi ibu ruo etu ọ dị n’oge ntuliaka ọkwa onyeisiala.
Ụfọdụ ndị mmadụ gwara BBC na ọ bụ ụjọ mwakpo mere ha apụtaghị tụọ vootu ebe ndị ọzọ kwuru na ọ bụ enweghị ntụkwasị obi n’ebe Inec nọ bụ ihe mere ha apụtaghị tụọ vootu.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Na Legọs ebe akụkọ mwakpo kacha si pụta, okwu ịkpaoke agbụrụ bịa bụrụ isi sekpụ ntị dịka ụfọdụ kwuru na amajara maka agbụrụ ebe ndị ọzọ kwuru na e gbochiri ha ịtụ vootu ma ncha maka agbụrụ ha.
N’ebe ụfọdụ, e kwukwara a ndị na-atụnyeghịrị pati ụfọdụ na amajara ha.
Ndị uweojii Naịjirịa nwụchiri ụfọdụ ndị pụtara iwakpo ndị mmadụ n’Anambra, Legọs, Kano nakwa ebe ndị ọzọ.
Anụkwara akụkọ na a tọọrọ onye ọrụ Inec n’okpuruọchịchị Isu nke Imo steeti mana ndị uweojii mechara zịpụta ozi na ya bụ onye ọrụ Inec nọzị n’aka ha ugbua.
Agbanyeghị nke a ntuliaka gara n’ihu n’ebe dị iche iche, e nwere ebe ndị akagburu ntuliaka n’ihi nsogbu ndị dapụtara ebe ahụ dịka Inec kwuru na a ga-emegharị ntuliaka n’ebe ndị ahụ n’elekere asatọ nke ụtụtụ Sọnde.
Ngụkọ vootu malitere n'abalị Satọdee dịka Inec kwuru na a ga-amalitekwa ịgụkọ vootu n'ọgbọ ngụkọ vootu ha dị iche iche n'akụkụ Naịjirịa n'ụbọchị Sọnde.
Nsogbu Bvas ?
E nweghị ọtụtụ akụkọ pụtara nke gosiri na ngwa Bvas Inec arụghị ọrụ etu o kwesịrị. Inec kwere nkwa dịka e mechapụrụ ntuliaka onyeisiala na ha ga-ahazị ngwa teknụzụ Bvas ha ma hụ na nsogbu ndị dapụtara na ntuliaka nke ọzọ agaghị eme na nke ọkwa gọvanọ.
Peter Obi nke Labour Party kwuru n'ozi o zipụtara na Twitter na ọ bụ ihe mwute na ndị mmadụ pụtara ịtụ vootu ntara mwakpo dịka ọ katọrọ etu ntuliaka ahụ siri gaa. Ozi sokwa ozi ndị ọzọ nwere agba na Naịjirịa nke kwuru na ya bụ ntuliaka gara n'ụzọ ezighi ezi n'anya ha.
So akụkọ niile gbasara ntuliaka ọkwa gọvanọ na ndị omeiwu Naịjirịa ka ha na-adapụta n'ọkụ, n'ọkụ ebe a.