Gịnị mere ego 'passport' ji dị iche iche na mpaghara Naịjiria?

Akwụkwọ ikike njem Naịjiria

Ebe foto si, Twitter/Nigeria Immigration Service

Ụlọọrụ Nigeria Immigration Service (NIS) asaala akụkọ fesara na ha na-akpa oke n'ịna ego mgbata akwụkwọ ikike njem Naịjiria na mpaghara dị iche iche.

NIS kwuru na ọ bụghị eziokwu na ha na-akpa ya bụ oke, ma kọwaa ihe butere e ji akwụ ụgwọ iche iche.

Ndị NIS dere na Twitter ha sị na ọ bụ ihe ịtọ ọchị na a na-asị na ha na-akpa oke n'ihi na ụlọọrụ ha anaghị ebu steeti ebe onye bi n'uche tupu e nye onye ahụ akwụkwọ ikike njem ya.

Isah Jere Idris bụ onyeisi ụlọọrụ ahụ, kwuru sị "Akwụkwọ ikike njem anyị na-enye bụ nke ndị Naịjiria, n'agbanyeghi ebe onye bi, ọbụladị ma n'ofesi."

Ha kọwakwara na ọ bụ ụdịrị akwụkwọ ikike njem abụọ ka ndị mmadụ na-agbata ugbua - nke a kpọrọ 'electronic Passport na enhanced electronic Passport'.

NIS kọwara na nke 'enhanced electronic Passport' ka bụrụ nke ọgbara ọhụrụ karịa nke 'electronic Passport' site n'ụfọdụ ihe ọhụrụ ndị a gbakwunyere ya.

Nke ọhụrụ nwere ihe nchekwa ọhụrụ nakwa otu mpempe akwụkwọ e ji 'poly carbonate' rụọ. E nwere ya n'ụzọ atọ:

  • Mpempe akwụkwọ 32 na-anọ afọ ise (N25,000)
  • Mpempe akwụkwọ 64 na-anọ afọ ise (N35,000)
  • Mpempe akwụkwọ 64 na-anọ afọ iri (N70,000)

Nke a na-abịa dịka ụfọdụ ndị mmadụ kpụ ha n'ọnụ na soshal midia gbasara etu ego mgbata akwụkwọ ikike njem Naịjiria si dị ọnụ na Ndịda karịa n'Ugwu.

Ihe ndị mmadụ kwuru

Ebe foto si, Screenshot

Ihe ndị mmadụ kwuru

Ebe foto si, Screenshot

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Cheta na ọ bụ n'afọ 2019 ka e wepụtara akwụkwọ ikike njem nke 'enhanced electronic Passport'.

Kemgbe ahụ, naanị ọgbọ mgbata akwụkwọ asaa (Ikoyi, Abuja, Alausa, Festac, Portharcourt, Kano na Gwagwalada) maliterela inye ya ndị mmadụ.

NIS kọwara na nke 'electronic Passport' bụ ụdịrị nke a na-enyebu ndị mmadụ kemgbe afọ 2007 a malitere inye ya bụ 'ePassport'.

Ha kọwara na ego mgbata nke ahụ bụ ebe N8,750 ruo N17,800, nke dabere n'afọ ole onye na-agbata ya dị nakwa ụdịrị ogogo akwụkwọ ikike onye ahụ na-achọ.

Ha kwukwara na ka ọ dị ugbua, ha ejirila nwayọ nwayọ na-ebugharị ọgbọ mgbata akwụkwọ ikike ha niile ka ọ bụrụ ebe a ga na-enye 'enhanced electronic Passport'.

Ụlọọrụ ha dị na mpaghara Ndịda-Ndịda, Ọwụwa-Anyanwụ nakwa Ọdịda-Anyanwụ nakwa ebe ha si arụ ọrụ na UK nakwa USA, abanyela n'inye nke 'enhanced electronic Passport'.

Ebe ndị nke Ugwu, Canada na ndị ọzọ adịrịla njikere ịbanye na nke 'enhanced electronic Passport' n'oge adịghị anya.