Aga m etinye mmepe Aba n'ọnọdụ 'State of Emergency' ma m bụrụ Gọvanọ - Gregory Ibe

Aha onyonyo, Aga m etinye mmepe Aba n'ọnọdụ 'State of Emergency' ma m bụrụ Gọvanọ - Greg Ibe
Aga m etinye mmepe Aba n'ọnọdụ 'State of Emergency' ma m bụrụ Gọvanọ - Gregory Ibe

Onye na-azọ ọkwa Gọvanọ Abia Steeti na pati 'All progressives Grand Alliance (Apga) bụ Gregory Ibe ekwuola na ihe mbụ ọ ga-eme ma ọ merie ntuliaka bụ itinye Aba n'ọnọdụ 'State of Emergency'.

Gregory Ibe kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ọdị nso a ebe ọ nọ kwuo ihe bụ ebumnuche ya ịzọ ọkwa gọvanọ.

Ibe kwuru na ahụmihe ya dịka onye ndu obodo eteela aka ọ malitere.

"Anyị bụ ụmụaka oge e kepụtara Abia Steeti, obi bụ anyị sọ aṅụrị, mana anyị etoola ugbua bụrụ nna, ụmụ anyị amụtakwa ụmụ, kama Abia Steeti ga na-aga n'ihu, ọ na-alaghachi azụ," Ibe kwuru.

"Etinyela m ego m ugboro ugboro iji nye aka ka gọọmenti mee ihe ha kwesịrị ime"

"Eso m na ndị wulitere ọnọdụ agụmakwụkwọ na Naịjirịa, mụ na Onyeisiala Olusegun Obasanjo rụkọrọ."

Gregory Ibe

Ebe foto si, Gregory Ibe

"Anaghị m atụ egwu ịgbanwe ihe dị njọ maọbụ iwete ihe ọhụrụ n'obodo. Emeela m ya na gọọmentị etiti, mee ya n'okpuru ọchịchị 774 dị na Naịjirịa."

"Ugbua, ekpebiela m na ọ bụrụ na m merie, m ga-ewere Aba tinye n'ọnọdụ 'state of emergency' dịka o si gbasata mmepe obodo."

"Ihe m ga-emere ndị akaọrụ n'Aba bụ na ihe ha na-arụpụta ga na-aga mba ụwa niile."

Gregory Ibe kwukwara na ụmụnwaanyị ga-enwe ọrụ pụrụ iche ma ritekwa uru buru ibu n'ọchịchị ya, "maka na ọ bụ ụmụnwaanyị na-ewulite obodo".

"Nwaanyị ọbụla nọ na steeti a ga na-atụrụ Chineke mmamma ma m merie, maka na nwanne ha hụrụ ha n'anya na-abịa ịchị ha."

Onye bụ Gregory Ibe?

Gregory Ibe

Ebe foto si, Gregory Ibe

Nkọwa foto, Ọ bụ Gregory Ibe hibere mahadum 'Gregory University' n'Uturu, Abia Steeti
  • A mụrụ ya n'ụbọchị 10 nke ọnwa Disemba afọ 1963.
  • Ọ gụrụ akwụkwọ na 'Boys High School' dị n'Ihube, Imo Steeti, 'School of Accountancy and Management', Abia Steeti; Mahadum nka na Tekịnụzụ (ESUT) Enugwu; na Mahadum California Coast nke dị na Santa Ana, California.
  • Ọ bụ ya hibere mahadum 'Gregory University' n'obodo ya bụ Uturu, Abia Steeti
  • Ọ bụ ọkammụta na ngalaba mmụta 'Management', dịka ọ kụziri nkuzi na Mahadum Abia steeti nakwa Tansian University
  • O hibekwara ụlọọrụ enyemaka ọ kpọrọ Gregory Iyke Foundation bụ nke o kwuru na ọ bụ i ji nyere ndị ogbenye aka
  • Ọ nọbu na pati PDP tupu ọ pụọ na pati ahụ n'ọnwa Maachị 2022
  • Gregory Ibe arụọrọla otu dị icheiche ọrụ dịka 'consultant', nke gụnyere Ecowas na United Nationa arụkọọla ọrụ