Ihe m ma maka mwakpo ndịagha wakporo ụlọ Nnamdi Kanu ha n’afọ 2017 - Okezie Ikpeazu

Nnamdi Kanu na Okezie Ikpeazu

Ebe foto si, Onyebuchi Ememanka/Kanu

Gọvanọ na-achị Abia Steetị bụ Okezie Ikpeazu ekpugheela ihe ọ maara maka mwakpo ndịagha Naịjirịa wakporo ụlọ Nnamdi Kanu bụ onye ndu Indigenous People of Biafra (Biafra) n’Umuahia n’afọ 2017.

Ikpeazu mere mkpughie a mgbe ọ na-aza ajụjụ n’ihe onyonyo mkparịtaụka ya na Dickson Iroegbu mere n’ụbọchị Fraịde 3 Juun 2022.

Akụkọ ndị ọzọ banyere Nnamdi Kanu na Okezie Ikpeazu

Ọ sị na mgbe ndịagha Naịjirịa wakporo ụlọ Nnamdi Kanu dị n’Afara Ukwu Umuahia n’ọnwa Septemba afọ 2017 na ha agwaghị ya.

N’okwu ya “Agwaghị m na ihe dị etu ahụ ga-eme, onye ndu ndịagha GOC nọ n’Enugwu mgbe ahụ bịakwutere m n’Umuahia sị na ọ chọrọ inwuchi Nnamdi Kanu.

“Ajụrụ m ya gịnị mere? Ọ sị na e nyere ya iwu ka ọ nwụchie Kanu, a gwara m ya ka o nye m awa ole na ole.

“Akpọrọ m ndị Eze ọdịnala gwa ha ihe GOC kwuru ma sị ha gaa n’ụlọ Nnamdi Kanu kpọta nna ya bụ Eze Isrela Kanu ka ọ nụrụ ihe GOC kwuru.

Mana tupu ha na-eru, nna Kanu gwara ha na ọ naghị abịa na ndịagha awakpoola ụlọ ha.

“Ya bụrụ na tupu onye ndu ndịagha a na-abịa ịhụ m, ọ dịla mbụ ziga ndịagha ya n’ụlọ Kanu ha maka na anọ m na-ahụ ndịagha ka ha na-agagharị na gburugburu Umuahia n’ụbọchị ahụ.”

Ihe Ikpeazu kwuru maka ọpụpụ Abaribe pụrụ na PDP

Sịneto Enyinnaya Abaribe

Ebe foto si, Senator Abaribe/Facebook

Okezie Ikpeazu jụrụ sị “gịnị ga-eme ka mmadụ si na pati ya pụọ maka na ọ dara ntuliaka ime ụlọ?”

Ọ sị na Sịnetọ Abaribe anọọla ihe ruru afọ iri abụọ (20yrs) n’ọchịchị.

“Ọ bụ People Democratic Party mere Abaribe ihe niile ọ bụ taa, afọ anọ dịka osote gọvanọ na afọ iri na isii dịka Sịnetọ.

“Ọ bụrụ na pati sị ka i chetu, ị na-esi ọnwụ, kedụzie mgbe pati ga-eto? Ndị dị afọ iri abụọ mgbe ị bụ osote gọvanọ dịzi afọ iri anọ ugbua.

Okezie sị na ihe dị mkpa n’ịbụ onye ndu bụ ka ịzụpụta ndị ga-abụ ndị ndu.

Ọ gara n’ihu kwuo na onye e meriri na ntuliaka ime ụlọ kwesịrị ịnabata ya ma nyere pati ya kwado onye meriri ya.

“Onye ọbụla na-emeghi nke ahụ bụ onye ụjọ”

Ikpeazu kwukwara na osote ya bụ Ude Okoh agwaghị ya na ọ chọrọ ịzọ ọkwa gọvanọ n’Abia Steetị.

“O buru ụzọ gagharịa gwa ndị ọzọ, tupu ha e nye ya ndụmọdụ ka ọ bịa gwa m.

“Mana mgbe ọ bịara, agwara m ya na oge agaala maka na e chere na ị ga-anọ n’akụkụ.”

Ikpeazu sị na o nweghi esemokwu ọbụla dị n’etiti ya na Okoh bụ osote ya.