You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Awakpoola ụlọọrụ Inec ọzọ n'Isu, Imo Steeti
Ụlọọrụ ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naijirịa bụ Independent National Electoral Commission (INEC) ekwuola na onyeisi ụloọrụ ha n'imo Steeti bụ Sylvia Uchenna Agu agbaala ama na ndị omekome wakporo ụlọọrụ ha nke dị n'okpuruọchịchị Isu nke Imo Steeti n'isi ụtụtụ ụbọchị 20 ọnwa Disemba afọ 2022.
Ọ bụ n'akwụkwọ ozi nke ọnye na-ahụ maka mgbasaozi Inec bụ Festus Okoye depụtara ka ha kwuru nke a.
O kwuru na ndị a mebiri opio asatọ na ihe eji egbochi oshi bụ Burglary Proof.
Akwụkwọ ozi ha kwuru na ndị omekome a enweghị ike ịbata ụlọọrụ ha, ma sịkwa na enweghị ngwa ọrụ ha ndị ahụ zuuru.
Ha kwuru na ha eburula akụrụngwa ha ji arụ ọrụ dịka akpati a na-atụ vootu na ihe ndị ọzọ gaa ogige ụlọọrụ ha ọzọ.Dịka o siri dị, ha echekwaala akwụkwọ atụm vootu ma zipụ kwa ndị nchekwa iji hụ na ha kesara akwụkwọ atụmvootu.
Akwụkwọ ozi ha a kwuru na nkea mere yaugboroi anọ a na-awakpo ụlọọrụ ha n'ime ihe dịka izụụka atọ.
Anyị anwuchiela ndị wakporo ụlọọrụ Inec n'Owerri, Imo Steeti - DSS
Ngalaba nchekwa nke Department of State Security Service bụ DSS n'ịchafụ nke Imo steeti ekwuola na ha anwuchiela ndị isi na-ahazị mwakpo awakporo ụfọdụ ụlọọrụ gọọmentị nke dị N'Imo Steeti.
Ọ bụ n'ụbọchị Wenezde ka onyeisi otu a n'Imo Steeti bụ Wilcox Idaminabo nọ n'ihu ndị ọnụ na-eru n'okwu na steeti ahụ nke gụnyere kọmịshọna ntuliaka nke steeti ahụ bụ Sylvia Agu were sị na ha anwuchiela ndị isi ndị haziri mwakpo awakporo isiụlọọrụ INEC nke dị n'Owere Imo Steeti.
Idaminabo kwukwara na ha wakporo ma chụsasịa ndị omekome a n'ogige ha dị n'obodo Ọsụ ebe ha ji mere isiụlọọrụ ha.
O kwuru na mbọ ndị nchekwa gbara mụtara mkpụrụ dịka ha nwuchiri otu onye ha kpọrọ Mike Ahize nke ha na-ebo ebubo ịbụ onyeisi ndị omekome a n'okpuruọchịchị Ọsụ.
Idaminabo kwuru na ọ bụ mwakpo ha wakporo ogige ndị omekome a mere ha jiri sị Ọsụ gbapụ gbaga mpaghara Aku/Ihube nke dị n'okporoụzọ Okigwe ebe ha sị awakpo ebe dị iche iche.
Kama O kwupụtara obi ụtọ ya dịka o kwuru na ha nwuchịrị onyeisi ha bụ 'Ejima' n'abali Tuzde.
O kwuru sị, " Anyị ga aga n'ihu na-enyocha ogige ha nke dị nỌsụ, Njaba, Ọlụ na Okigwe, mwakpo anyị mere ha na Njaba mere ka anyị nwuchie otu onye a kpọrọ Ejima bụ onye na-eyi egwu na-ekwu na ọ ga-amụnye steeti a ọkụ.Obi dị m ụtọ na anyị nwuchiri ya n'abalị Tuzde, ma ugbua, ọ nọ anyị n'aka".
O kwukwara na ha napụtara ndị omekome a ọtụtụ ngwa ọgụ, mgbọ egbe na ọgwụ odeshi.
Idaminabo rịọrọ ndị obodo ka ha na ndị nchekwa rụkọọ ọrụ ma hụ na ekpochapụrụ ndị omekome a .
Ihe Gọvanọ Imo Steeti kwuru maka mwakpo na-eme na steeti ahụ
Gọvanọ Imo Steeti bụ Hope Uzodinma ekwuola na mwakpo ụlọọrụ ndị Inec nke mere n'Owere n'ụtụtụ Mọnde a egosila na ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-akwado enweghị nchekwa dị n'Imo Steeti ugbua.
Uzodinma kwuru nke a dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'isi ụlọọrụ ndị uweojii Imo steeti n'ụtụ Mọnde a, dịka ọ gara ịhụ ndị ekperima wakporo isi ụlọọrụ INEC dị n'Owere n'isi ụtụtụ ụbọchị Mọnde.
"N'imo steeti ka e nwere ndị ndọrọndọrọ ọchịchị chọrọ imeri ntuliaka n'ụzọ ọbụla, na-esoghi usoro ziri ezi," Uzodinma kwuru.
"Mana obi dị m ụtọ mbọ ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa anyị na-agba. Anyị ga-aga n'ihu na-enye ha nkwado ka ha na-agbasi mbọ ha ike."
Uzodinma kwere nkwa na ọnọdụ nchekwa ga-adịwanye mma maka ndị na-alọta ụlọ maka emume ekeresimesi, n'ihi na ndị ọrụ nchekwa kere nkwụcha ma mụrụkwa anya.
Mmadụ anọ anwụọla na mwakpo ụlọọrụ Inec n'Owerri
Ndị ekperima amaghị ndị ha bụ wakporo isi ụlọọrụ ngalaba na-ahazi ntuliaka bụ 'Independent National Electoral Commission' (Inec) dị n'Owerri, Imo Steeti n'isi ụtụtụ ụbọchị Mọnde a.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo Steeti bụ Michael Abattam kwuru na ndị uweojii gburu mmadụ atọ n'ime ndị bịara mwakpo a ebe otu onye uweojii nwụkwara.
Otu onye uweojii ọzọ merụkwara ahụ dịka ha na ndị ekperima ahụ na-akwakọrịta mgbọ.
"N'elekere iri na abụọ nke isi ụtụtụ taa, ndị a na-eche na ha bụ ndị otu Ipob/ESN wakporo ụlọọrụ Inec, tụọ ogbunigwe 'dynamite' nakwa ogbunigwe e ji petrol rụọ," Abattam kwuru.
"Mana ndị uweojii lụsoro ha ọgụ ma chụọ ha ọsọ, dịka ha na-agba ọsọ, ha hapụrụ otu ụgbọala lexus ojii, mana ndị uweojii gburu mmadụ atọ n'ime ha.
"Anyị napụtara ha egbe AK47 atọ, egbe pump action atọ, ogbunigwe abụọ na-agbabeghị agba, ogbunigwe petrol ndị ọzọ, nakwa ọtụtụ ọgwụ a gwọrọ agwọ.
"Anyị ejidekwala mmadụ abụọ n'ime ha ndị mgbọegbe tụrụ."
Abattam gara n'ihu kọwaa na ndị ekperima ahụ si n'ogige ebe a na-ere mmanụ ụgbọala iji tụbanye ogbunigwe ahụ n'ime ụlọọrụ ndị Inec.
O kwuru na ọ bụ ụlọ abụọ nakwa otu ụgbọala dị n'ogige ụlọọrụ Inec ka ọkụ ahụ metụtara.
Ọ gara n'ihu kwuo na ha bụ ndị uweojii anaghị arahụ ụra gbasara ọnọdụ nchekwa n'Imo steeti iji hụ na ntuliaka 2023 ga-agarịrị n'ihu dịka e si hibe ya.