Sudan Crisis: Ndị Sudan egwu ji agbaala ọsọ ndụ ọzọ ịgbalahụ ndị agha nnupuisi Arab na Darfur

Ndị gbara ọsọ ndụ

Ịgba ọsọ ndịụ ịgbalahụ ndịagha nnupuisi Arab abụghị ihe ọhụrụ nye ndị Suda a na-agba ọsọ ịgbaba mba Chad, ike ọgwụgwụ dị ha n' ihu gosiri ahụhụ ha gabigarala afọ kwuru afọ.

Mahmoud Adam Hamad gwara BBC sị, "Anyị ka laghachiri ụlọ iibido ndụ ọhụrụ oge ọgụ malitre ọzọ nke mere ka anyị gbapụkwa ọsọ ọzọ."

Nghọtahịa dapụtara n'etiti ndị isis agha mba Sudan abụọ n'abalị 15 nke ọnwa Epreluu afọ 20223 ebutela ọgbaghara n'etiti agbụrụ na agbụrụ na Darfur dị na mpaghara ọdịda Anyanwụ Sudan.

Otu United Nationa na-ekwu na ihe karịị mmadụ 100,000 agbala ọsọ ndụ gbapụ na mba ahụ , ọtụtụ n'ime ha na-agbaga Chad nke dị nso na Darfur.

Ọgbaghara adịla na Darfur ọtụtụ afọ dịka tigbuo-zogbuo na-ada n'etiti ndị Afrịka na ndị Arab.

Oge ndị abụghị ndị Arab palitere ngwa ọgụ imegide gọọmentị 'afọ 2003, ma ne-eti mkpu ịkpa oke megide ha, gọọmentị kpalitere ndị agha nnupuisi Arab bụ ndị e ji janjaweed mara , bụ ndị e boro ebubo ịkpa ọtụtụ mkpamkpa.

Ọtụtụ ndị agha Janjaweed a bụ ndị ghọrọ otu agha gbanụgbanụ a kpọrọ "Rapid Support Forces" (RSF), na-ebuzi ndị agha Sudan agha.

Ndị agha nnupuisi Arab bụ isi ahụụ kwaba oku na RSF dịzị ka ha eji maka nsogbu enweghị nchekwa dị na Dafur bute tigbuo-zogbuo na Dafur nke mere ka ọtụtụ ndị mmadụ gbapụ ọsọ ndụ.

ụfọdụ dịka Hamad na ezinaụlọ ya nọzị n' ebe ọnọdụ ndị gbara ọsọ ndị dị na Koufroune dị na Chad.

Ndị Sudan gbara ọsọ ndụ

Ihe dịka mmadụ 8,000 people bụ ndị jitụ ihe ụfọdụ ha ji biri na ụmụanụmanụ ha gbata ọsọ ndụ ebe ahụ.

Hamad meere njem ụgboro abụọ iji nwee ike isi Darfur kpọta nwunye ya abụọ na ụmụ ha asatọ n'ebe ahụ izuụka abụọ gara aga.

"Agara m njem ahụ n'abalị n'abalị. Esi m otu ebe duru ezinaụlọ gaa ebe ọzọ ma rue oge anyị rutere ebe a."

Dịka ọ kwụ n'akụku ụlọ gbanụgbanụ e ji osisi na mgbagbam rọba were rụọ Hamad kwuru sị, "Ọ fọrọ ebere ka e zuo m ohi na njem nke abụọ m."

Ndị agha nnupusi Janjaweed wakpoburu ogbe ya, dị na Darfur. mwakpo ahụ furu ya ugbo ya,. anụmanụ ya nakwa ụfọdụ ndị ikwu na ibe ya.

"Ha tiri anyị ihe, anyị rịọrọ ha ka ha tọghapụ anyị."

Hamad mechara kpọọ ndị ezinaụlọ ya laghachi Darfur , chee na udo achịwala mana ugbo a, ọsọ emeela ọzọ.

Ugbua o jizi baro ịkwara ndị ọzọ na-agba ọsọ ndụ ibu ha enweta nwa obere ego. nknke o ji azụ nri.