Gịnị butere esemokwu metụtara ụlọngosinka ego ya dị $25m na akpụrụakpụ Bini e si ala Bekee weghachi?

Ebe foto si, AFP/Getty Images
- Onye dere ya, Todah Opeyemi
- Ndị mere akụkọ a, BBC Africa
- Ebeg o si, Benin City
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
Ụlọ ngosi nka ọhụrụ 'Museum of West African Arts(MOWAA) nke Naịjirịa abanyela na nsogbu ndọrọ ndọrọ n'izuụka e kwesiri imepe ya maka ọha na eze.
Ogige ahụ ala ya ruru hekta isii (15-acre) dị n'etiti Bini, isiobodo Edo steeti. Ihe dị na ya gụnyere olulo ihe gboo(archaeological dig) nakwa ụlọ nke onye sere nhazi ya bụ ịnjinịa mba Gana a ma ama bụ David Adjaye bụ onye a ma ama maka eserese ụlọngosinka 'National Museum of African American History and Culture a gbapere na Washington n'afọ 2016.
O ruola afọ ise kemgbe a malitere ịrụ ụlọ nka ahụ - nke e kwuru na ọ ga-abụ ihe na-egosi nrụpụta gara aga si mpaghara a maara dịka ọlanchara nakwa ihe ndị ọzọ ndịagha mba Briten zuuru n'obi eze obodo ahụ na 19th Century.
Ọ bụ ihe ịtụ n'anya - dịka a na-akwado mgbape ya, ọtụtụ ndị mmadụ na ndị ọrụ juru na Mowaa ndị na-achọ igosi na ebe ahụ bụ ụlọ ngosi nka bụ ọkaibe n'etiti ndị ọzọ dị na n'Ọdịda anyanwụ Afrịka.
Ọtụtụ ndị mmadụ gosiri ihe nrụpụta dị iche iche ma kpọsa ya ebe ihe ngosi na-adị.
Ogige ahụ bụ Philip Ihanacho bụ onyeisi Mowaa ugbua chepụtara ya.
"Achọrọ m ka anyi wulite ọnọdụ akụnaụba ndị bi na mpaghara a," ka ọ gwara BBC, ma kwuo na ebumnobi ya bụ ime ka Benin bụrụ ọkaibe n'ihe gbara ọdịnala.
Mowaa, na-ahụ onwe ya dịka ụlọọrụ ga-emepụta ọrụ ruru 30,000 ma weta ego ruru $80m (£60m) kwa afọ site na mmekọ ha dị iche iche.
What we have become is a museum that is really about creating an ecosystem to support creatives in West Africa"
O nweela ego ruru $25m (£19m) iji rụọ ebe a - ego e nwetara n'aka ndị nkwado, gọọmenti Fransi na Jamini, ụlọ ngosi nka Briten nakwa gọọmenti Edo steeti.
Mana ugbua, gọọmenti okpuru ọchịchị etinyela nsogbu na ya ma kagbuol ikike e nyere ha ịrụ ogige ahụ n'ala ebe a rụrụ ya,
Otu onye na-ekwuru gọọmenti Edo steeti gwara BBC na nke a bụ maka na a kpọrọ ya Edo Museum of West African Art n'akwụkwọ nkwado mbụ e nyere ha - mana e wepụtala "Edo" n'aha ha.
Nkwuputa a na-abịa dịka e mere ngagharịiwe n'ụbọchị Sọnde, oge ndị mmadụ bịara ebe ahụ ma kwuo na ha chọrọ ka a kpọọ ebe ahụ Benin Royal Museum.
Ndị ngagharịiwe ahụ malitere ịkparị ndị si mba ofesi bịa mmemme ahụ nke mere ndị uweojii kpọrọ ha pụọ ebe ahụ maka nchekwa ha.

Ebe foto si, AFP/Getty Images

Ebe foto si, AFP/Getty Images
Onyeisiala Bola Tinubu gbara mbọ ikpezi esemokwu ahụ site n'ihiwe otu kọmitii ga-eme nnyocha ma chọpụta ụzọ ka mma iji dozie okwu ahụ.
Mana ugbua, ihe niile akawanyela njọ.
Akụkọ kwuru na ebe okwu a niile si malite bụ maka na ọ bụ ọchịchị Godwin Obaseki kwadoro ọrụ ụlọ ngosi nka ahụ tupu ọ pụọ n'ọkwa dịka Gọvanọ.
Ndị mmadụ kwuru na ọ dị ka Gọvanọ na-achị ugbua onye ya na Eze obodo ahụ na-adị na mma chọrọ irite uru n'ọrụ a. Iji ma atụ, ndị ngagharịiwe ahụ na-akpọ oku ka ọ bụrụ Eze obodo ahụ bụ Oba Ewuare na-alekọta ogige ahụ.
Nke a na-ewebata nlebanye anya n'esemokwu nke Benin Bronzes, otu n'ime akụ omenala ndị Afrịka kacha ewu ewu.

N'ihi na ọ bụrụgodị na ụlọ ngosi nka mechaa mepee, ọlanchara ahụ agahị adị ebe ahụ.
Ha bụ ihe ọkpụkpụ ọla, ọdụ́ na osisi, bụ́ ndị chọburu ụlọ eze nke Benin n'otu oge tupu ndị agha Britain lụbatara ha n'afọ 1897 n'oge njem ntaramahụhụ.
Taa, puku kwuru puku mmadụ ka dị n'ebe ngosi nka na Yurop na Nọt Amerịka - gụnyere British Museum, Berlin's Humboldt Forum na Metropolitan Museum of Art.
Iweghachita ha bụ okwu a kpụ n'ọnụ n'ụwa niile taa. Ihe ruru 150 n'ime alaghachitela - ebe a na-atụ anya ndị ọzọ na nso nso a.
Oge e kwuru maka ịrụ ihe ngosi nka ahụ na Benin n'afọ 2019, ọtụtụ ndị ihe ngosi nka na-amasị kwuru na nke a ga-abụ ihe ọma nye Naịjirịa.









