A chọpụtala na Eze Charles nke Briten bu ọria kansa

Eze na Ezewaanyi

Ebe foto si, PA Media

    • Onye dere ya, By Sean Coughlan
    • Ndị mere akụkọ a, Royal correspondent

Onye na-elekọta obi Eze Britein kwuru na nyocha gosiri na Eze Britein bụ Eze Charles nwere ụdị ọrịa kansa ọna arịa.

Ọbụghị kansa akapamamiri mana anyị chọpụtara nke a n'otu nyocha ọ gara maka ọrịa akpamamiri.

Ozi si n'obi Eze kwuru''akabegị chọpụta udị kansa ọ bu mana Eze ebidola nnata ọgwụgwọ ọrịa n'ụbọchị Monde.''

Eze Britien gbara afọ 75, ga-akwụsịtụ ị ga mmemme ọha, Ezenwaanyị Camila na ọpara Eze William ga anochị anya ya n'emumme ndị a dịka ọ ga na-anata ogwụgwọ.

O weghị ozi ọzọ ezitere banyere kansa.

Mana obi Eze dịna Buckingham kwuru na Eze nwere okwukwe na ọgwụgwọ ndị ọ na-anata, ọ na atụanya na ọ ga ebido jebe mmemme ọha n'oge na dịghị anya.

A'gbanyeghị na ọ ga akwụsịtụ mmemme ọha, Eze ga-aga niru na ọchịchị obodo dịka iwu ala siri tinye n'aka ya.

A hụrụ ya n'emumme emere n'ụlọụka dị na Sandringham n'ụbọchị Sonde, ebe ọ na efeere ndị biaraụka aka.

Enyere ya ọgwụgwọ ọrịa akpa mamiri n'otu ụlọogwụ dị na Britein n'otu izuụka garaaga.

Lee ozi obi Eze n'uju.

Ozi obi Eze Buckingham n'uju

Eze ekpebiela ibuputa ọgwụgwọ ọrịa akpamamiri ya n'ọha iji kpalite mmuo ụmụwoke ndị ọzọ ka ha nweike malite njem nyocha akpamamiri ha

E kwuru na obi dị ya ụtọ etu osiri mee ka uwa mata maka ọnụdu n'ọrịa akpa mamiri ya, ọkachasị etụ ụlọọrụ NHS siri kwu na ọtụtụ ụmụwoke nwere ya bu ọrịa ugbua.

Aghotara na ọbụchaghị ọrịa kansa mana achọpụtara ya oge ọ jere ogwụgwu ọrịa akpamamiri n'nsonso a.

Ezenwaanyi ka ọna apụ n'ụlọọgwụ

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ezewaanyị hapuru ụlọogwụ dị n'etiti Britien ka ya na Eze rutere

Eze ga-akwụsịtụ mmemme ọha, Ezenwaanyị na opara Eze ga-anọchịte anya ya dịka ọga na-anata ọgwụgwọ.

Eze gbara afọ 75, gana achị dịka onyeisi ala ọbụ ka iwu ala siri dị .

Ahụru ya na-emmumme ulọụka dị na Sandringham n'ụgbọchị Sonde ka ọ na efeere ndị biara ụka aka.

Ọ natara ọgwụgwụ ọrịa akpamamiri n'ụlọogị̀u dị na Britein n'otu izuụka garaaga, ọna enwete onwe ya nwanyo-nwanyo.

Eze kpebiri ị gwa ọha maka ọrịa akpamamiri ya iji kwe kpalite mmuo ha ka ha jee mee nyocha ma ha ebu ọrịa ahụ.

E kwuru na obi dị ya utọ etu osiri mee ka oha mata mata na o bu ọrịa ahụ,ọkachasị ka ụlọọru NHS kwputara na ọtụtụ ụmụwoke bu ọria akpamammiri ugbua.

Eze Charles

Ebe foto si, PA Media