You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
"Ndị PDP Imo steeti niile so Ihedioha aga ebe ọbụla ọ na-aga" - Barr. Kissinger
Otu onye a ma ama na ngalaba PDP nke Imo steeti bụ Barr. Kissinger Ikeokwu kọwara na ọpụpụ Emeka Ihedioha na pati ahụ bụ nke dabara adaba.
Ọ sịrị na PDP agaala n’ihu na-agbakọrọ pati nọ n’ọkwa ọchịchị n’Imo steeti aka n’ọrụ karịa ịgba ụkwụ megide atụmatụ ya ndị nke na-adịghị mma.
Ikeokwu kwukwara na PDP akụọla afọ n’ala idozi ọtụtụ nsogbu ndị chere ya ihu.
N’okwu ya, “PDP n'Imo steeti so Ihedioha pụọ, ebe ọ bụla Ihedioha gara ka anyị ga-aga.”
Emeka Ihedioha hapụrụ PDP n'ụbọchị Tuzde 23 Eprel 2024 dịka ọ nọchara ọtụtụ afọ na pati ahụ.
Cheta na Ihedioha jiiri aha PDP zọọ ọkwa aka na-achị Imo steeti n'afọ 2015 ma nwetakwa mmeri mana ụlọikpe mechara kagbuo mmeri ahụ ma nyefee ya n'aka APC.
End of Mgbe ọzọ Emeka Ihedioha pụtara n'akụkọ
Emeka Ihedioha esila na pati PDP pụọ, gịnị ka ọ pụtara?
Aka chịburu steeti imo na pati People's Democratic Party, PDP bụ Emeka Ihedioha ekwuola na ya esoghizi pati ahụ.
Ihedioha kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o zigara onyeisi pati ahụ ma tinye n'akara ya na Facebook.
O kwuru na kamgbe afọ 1998 ka ya nọ na pati PDP ma na-etinye ike ya na ọganihu ya.
Mana ugbua, pati ahụ anọghịzi n'ụzọ nkwenye ya.
N'okwu ya, "ọ dị mwute na pati anyị na-agazi n'ụzọ megidere nkwenye m.'
"Agbalịala iweli olu m nye ndumọdụ mana patị ahụ enwezi ike igbanwe n'ime onwe ya, rubere iwu nke ya isi maọbụ welite isi megide pati nọ n'ọchịchị bụ All Progressive's Congress".
Ihe a ka Ihedioha dere n'akwukwọ ozi ahụ.
O kwuru na n'ihi ihe ndị a o depụtara, ya enweghizi ike ịnọ na ya bụ pati ọzọ.