Mwakpo ụlọọrụ Inec agaghị egbochi ntuliaka n'Ọwụwa Anyanwụ - INEC Enugwu

Ụlọọrụ 'Independent National Electoral Commission' ekwuola na mwakpo ụlọọrụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ agaghị egbochi ha maọbụ jụọ ha obi oyi na nkwado maka ntuliaka 2023.

Victor Okafor, bụ onye na-ahụ maka mmekọrịta Inec na ndị ọha mmadụ n'Enugwu steei, kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ụtụtụ Tuzde, ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Jenụwarị 2023.

Okafor kwuru nke a dịka ndị omekome wakporo ụlọọrụ Inec dị n'Enugwu Saụt n'abalị ụbọchị Sọnde, Jenụwarị 15, gbaa ya ọkụ ma gbukwaa otu onye uweojii na-echekwa ebe ahụ.

Nke a bụ nke atọ a na-awakpo ụlọọrụ Inec n'ime afọ 2022 ruo ugbua. Mana malite na 2019 ruo 2023, awakpola ụlọọrụ Inec ugboro ise n'Enugwu steeti.

Victor Okafor kwuru na mwakpo ahụ mere n'ụlọọrụ Inec n'Enugwu South, emetụtaghị akụrụngwa ọbụla ndị Inec ji arụ ọrụ.

"O metụtaghị akwụkwọ ikike e ji atụ vootu bụ 'PVC', akụrụngwa ọrụ anyị niile enweghị nke mebiri. Onweghị onye ọrụ anyị emerụrụ ahụ," Okafor kwuru.

"Ụdị ihe a emeela n'ebe dị icheiche, ọbụghị naanị n'Enugwu Saụt, mana ọ bụghị ihe ga-egbochi maọbụ dọghachi aka elekere azụ na nkwadebe Inec dị ime ntuliaka n'ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị nakwa ụbọchị 11 nke ọnwa Maachị.

"Onyeisi anyị bụ Dkt Chukwuemeka Chukwu, na-enwe nzukọ kwa mgbe kwa mgbe, ya na ndị isi ọrụ nchekwa dị icheiche bido ugbua wee ruo mgbe a ga-eme ntuliaka. Ya bụ na egwu ọbụla adịghị.

Ihe mere oge a wakporo ụlọọrụ Inec n'ụbọchị Mọnde

N'abalị ụbọchị Sọnde bụ Jenụwarị 15 2023, ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ wakporo isi ụlọọrụ Inec dị n'okpuru ọchịchị Enugwu Saut.

Ha na onye uweojii na-eche nche ebe ahụ kwakọtara mgbọ, ha wee gbuo onye uweojii ahụ.

Ndị ekperima a tụnyere ogbunigwe e ji mmanụ petrol rụọ n'ime ụlọọrụ Inec ahụ o wee gbaa ọkụ, mana ndị Inec kwuru na ọkụ ahụ emetụghị akụrụngwa dị mkpa ha ji arụ ọrụ.

Cheta na ụdị ihe a mekwara na mpaghara Okpuru Ọchịchị Igboeze-North n'ọnwa Julaị 2022.

Ndị omekome wakporo ụlọọrụ Inec dị ebe ahụ, gbaa ya ọkụ ma mebie akụrụngwa ntuliaka ndị ọzọ dịka igbe vootu, ebe a na-anọ atụ vootu, oche na tebulu na ihe ndị ọzọ.