'Ịma ikpe ọnwụ agaghị akwụsị mbụbata ọgwụike na Naịjirịa'

 Nonso B. C Maduka

Ebe foto si, Nonso B. C Maduka

Dika Ụlọomeiwu Ukwu Naịjirịa mere iwu ka a gbanwe ntaramahụhụ a na-enye ndị na ebubata maọbụ na-agba mgbere ọgwụ ike na Naịjirịa ka ọ bụrụ ịma ikpe ọnwụ,ọtụtụ na-akatọ iwu ahụ.

Ha na-ekwu na nke ahụ agaghị akwụsịli mgbere ọgwụ ike.

Ha rụtụrụ aka na ndị omeiwu kpebiri okwu iwu ahụ na-enyocha ghị nke ihe ndị mere mbụbata na mbupụ ọgwụ ike ji arị elu.

Dịka ha siri kọwaa, o nwere ndị na-aṅụ ọgwụ ike maka ahụike ha, ma nwee ndị bịdọrọ ịṅụ ya na amaghị ka ha si banye n' ọnọdụ ahụ.

Nonso Maduka, onyeisi ụlọọrụ 'Bensther Development Foundation,'otu onye na-agba mbọ megide ịṅụ ọgwụ ike kwuru na 'Iwu ahụ bụ ịta ndị na-enweghị ka ọ ha ha bụ ndị hụrụ onwe ha n' ọnọdụ ha amaghị ka sị banye ahụhụ ma kposaa ndụ ha."

"Lee anya na mba niile nwere ịwụ ịma ikpe ọnwụ maka ọgwụike, ha ka sọ na mba kacha nwee nsọgbụ maka ịnụ ọgwụike na nsọgbụ ahụike na-esị na ọgwụike".

Ndị ọrụ nchekwa ga-eji ya mekpa ndị mmadụ ahụ

Nonso Maduka kwuru na iwu ahụ ga-enyere ndị ọrụ nchekwa aka imekpa ndị mmadu ahụ.

"Ọ ga-enye ndị ọrụ nchekwa nnukwu ohere imeto ikike dịịrị ndị mmadụ ikpe ọnwụ ama nkwụsị ihe ọbụla."

"Ọtụtụ ndị mmadụ aka ha dị ọcha nwere ike ịnwụ maka ịwụ ahụ."

"Amaghị m ebe ndị omeịwụ sị achọ ka a maa mmadụ ịkpe ọnwụ maka na ihe iwu na- echekwa ọgwụike kwuru na e jide gị ebe ịjị ọgwụ ike na-enweghị ikike ya bụ na ịdaala iwu."

"E nwere ndị bụ ide na mbụbata na mbupụ ọgwụike ahụ, mana ihe ndị ọrụ na-ahụ maka ibu agha megide ọgwụike na-achụ ọsọ bụ ndị obere mmadụ ndị bu ide ji agba mgbere ha."

Ọ gịnị mere ndị Naịjirịa jị aṅụ ọgwụike?

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Nonso kwuru na o nwere ihe mere ndị mmadụ gị aṅụ ọgwụ ike.

"Na mbụ, Naịjirịa bụ mba e si ebufe ọgwụike aga mba ọzọ tupu ndị mmadụ ebido na aṅụ ya aghara aghara."

"Ịhe anyị ga ajụ bụ ọ gịnị kpatara ya? Gini meziri na ọnụọgụgụ ndi na-aṅụ ọgwụ ike na Naịjirịa jị karịa ugbua?"

"Anyị ebidobeghị na ajụ ọ gịnị mere ndị mmadu jịrị na achọ ịnụ ọgwụike. Anyị chọpụta ya, oge ahụ ka anyị ga ebido chọwa ụsọro ka mma"

"Enwere ọgwụike ọhụrụ karịrị ise na ọnụ ọgụgụ achọpụtara ọhụ bụ nke na akpa mmadụ ara. ọtụtụ n'ime ha adighị na ndị nke gọọmentị machịrị"

"E nwere ọgwụike a na eji agwọ ọrịa na ụlọọgwụ dị ka Heroin; "kedụ ka a ga esị mara ihe dị ịche ọnye na ere ya na onye na aṅụ ya maka ahụike ya?"

" Ụgbụ a ị ga aba na nsọgbụ ma ọ bụrụ na ịzụta nke a na akpọ tramadọl, ndị NDLEA hụ ya na aka gị; ọ gị ịzụta ya na ụlọ ọgwụ ma ọ bụ ebe ọbụla".

"Ha kwụrụ na ịwụ ahụ bụ maka ndị na ebubata ọgwụike, mana kedụ ka a ga esị mara ihe dị ịche ọnye na ere ya na onye na aṅụ ya maka ahụike ya?"

Kengbe ka anyị na agwa ndị NDLEA ka ha nweputa ịhe a ga eji mara onye na anụ ọgwụike na ọnye na ebubata ya mana ha ekweghị.

Ịṅụ ọgwụike bụ nsọgbụ ahụike karịa ịhụta ya ka mpụ

Maduka gara n'ịhụ kwuo na ịṅụ ọgwụike bụ nsọgbụ ahụike karịa nsọgbụ mmadụ ịbụ ekperima.

"Anyị achụọla ịkwụsị ịnụ ọgwụike dịka ihe gbasara mpụ, karịa ịhụ ya ka ihe gbasara ahụike mana ekweghị".

Nonso kwuru na ime ka ọgwụike hara ịbata Naịjirịa ma ọ bụ mee ka o rụọ ndị na anụ aka bụ otu n'ime ihe gọọmentị kwesịrị ịme.