You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe ga-eme ndị ojiegbe ahụ gbagburu ndị otu anyị - Uweojii Imo Steeti
Ndị uweojii Imo steeti agbaala ama na mwakpo mere n’akụkụ okporoụzọ Okpala junction nke dị n’okpuruọchịchị Ngor Okpala na steeti tara isi mmadụ ise ndị otu ha.
Ọnụ na-ekwuru ha bụ Henry Okoye gwara BBC Igbo nke a n’ehihe Fraịdee a dịka o kwuru:
“Ọ bụ eziokwu na a wakporo ma gbuo mmadụ ise ndị otu anyị na Fraịdee a”
“Anyị ewụgaala ebe ahụ n’igwe ma malite ezigbo ọrụ nnyocha dịka anyị na-agba mbọ inwuchi ndị mere ihe a ngwa ngwa.”
Akụkọ si ebe ahụ kọwara na ndị ojiegbe ahụ wakporo ebe ahụ gbagbukwara otu di na nwunye nọ na njem n’akụkụ ebe ahụ.
Otu onye ezinaụlọ di na nwunye a agbugburu nke nọ ebe ihe ahụ mere kwuru na ndị uweojii ahụ si n’akụkụ Abo Mbaise bịaruo ebe ahụ iri nri.
Ọ kọwara na ka nọ na-eri nri ndị ojiegbe ahụ nyaara ụgbọala wụbata ebe ahụ ma malite ịgba ha egbe aghara aghara.
Ọ kọwara mmadụ atọ n’ime ndị uweojii ahụ nwụrụ ebe a dịka a gbara ha egbe ebe mmadụ abụọ ndị nke ọzọ ji ọsọ gbapụ ebe ahụ gbabaa n’ime otu ụlọahịa nọ nso ebe ahụ nke mere ndị ojiegbe ahụ jiri chụrụ ha bata, gbagbuo ha ma gbagbuo di na nwunye ahụ bụ ndị nwee ya bụ ụlọahịa.
“Ndị ojiegbe ahụ mabuuru egbe ndị uweojii ahụ ma gbapụ ọsọ, wụba ụgbọala ọcha ha ma si ebe ahụ pụọ”
“Ihe a mere n’ebe elekere asatọ nke ụtụtụ a.”
“Ihe a bụ ihe oke mwute dịka di na nwunye a ka si Legọs lọghachite obodo anyị otu afo gara aga. Anyị ebugala ozu ha n’ụlọ ebe a na-ebode ozu”
Otu onye ọzọ gakwara onye ntaakụkọ anyị na mgbe o bu ụgbọala ya gafee ụzọ Owerri-Aba n’ụtụtụ a,na o ji anya ha hụ ozu ndị tọgbọcha n’akụkụ ụzọ ebe ahụ.
Chetakwa na n’ụbọchị 27 nke ọnwa Maachị ndị ojiegbe wakporo ma gbuo nchịkọta ndị uweojii na ndị ọrụ Nigeria Security and Civil Defence Corps mmadụ ise n’okpuruọchịchị Ngor Okpala.
Akụkọ mwakpo ka na-adapụta n’akụkụ ọwụwa anyanwụ Naịjirịa dị iche iche dịka ndị ojiegbe na-awakpokarị ndị uweojii, ụlọọrụ ndị uweojii, ndị ọrụ gọọmentị, ụlọọrụ gọọmentị, ndị agha nakwa ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ, na-egbe ha, na-atọ ha nakwa na-anapụ ha ngwa agha ha.
Gọọmentị Imo ekwuola ugboro ugboro na ọ na-agba mbọ ịdajụ ihe ndị na-eme na steeti ahụ kemgbe akụkọ ndị a malitere idapụta.