You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Herbal Bitters: Uru na ọghọm dị na mmanya ilu ndị a jupụtara n'ahịa ugbua
Ụdị mmanya maọbụ ọgwụ a na-akpọ 'bitters' jupụtara ebe niile na Naịjirịa nakwa ọtụtụ mba dị na Ndịda Anyanwụ Afrịka ugbua.
Ndị na-emepụta ma na-erekwa 'bitters' ndị a na-ekwu na ha na-agwọ ọrịa dị icheiche, ọ kachasị nwoke na-enwe nsogbu na mmekọ ahụ.
Mmanya 'bitters' ndị a na-adịkwa n'obere obere mkpọ, nke na-adịghị oke ọnụ ahịa, nke mere na ndị kacha aṅụ ya bụ ndị na-enweghị ego.
Mana kedụ uru nakwa ọghọm dị n'ịṅụ mmanya bitters ndị a?
Gịnị bụ 'Bitters'?
Iji ghọta okwu a nke ọma, BBC Igbo kpọtụụrụ Mazi Makuo Mobike, bụ ọkaibe na sayensị mmepụta ọgwụ nke bekee kpọrọ 'pharmacy'.
Ọ kọwara 'herbal bitters' dịka "ahịhịa maọbụ mgbọrọgwụ maọbụ azụ osisi (bark) nke e ji mmiri maọbụ mmanụ maọbụ 'alcohol' wee wepụta akụrụngwa ndị dị n'ime ha".
"I ji maa atụ, ọ bụrụ na iweta akwụkwọ olugbu, tinye ya na mmiri abalị abụọ, mmiri ahụ ga-ewepụta akụrụngwa na-edozi ahụ dị n'ime olugbu ahụ; mmiri ahụ bụ ihe e nwere ike ịkpọ bitters," Mobike kọwara
"Dịka mmụta anyị si dị, ọtụtụ n'ime ihe ọṅụṅụ 'bitters' ndị a dị n'ahịa ugbua bụ 'alcohol' ka e ji emepụta ha."
Ọghọm dị na Herbal Bitters
"N'uche nke m, ọghọm dị n'ịṅụ mmanya ilu (bitters) ndị a karịrị uru dị na ha," Rose Okafor na-ekwu.
Oriaku Rose Okafor bụ ọkachamara na sayensị gbasara iji ihe oriri ewulite ahụike, bekee na-akpọ ya 'dietician'; ọ na-arụ ọrụ n'ụlọọgwụ 'Holy Rosary dị n'Emekuku, Owere.
"Aga m asị onye aṅụla ya chaachaa, maọbụ na-aṅụrụtụ ya ntakịrị ntakịrị iji gbochie ọghọm."
"Nke mbụ bụ na o nwere ike ịba mmadụ n'anya mee ka onye ahụ na-emegheri emegheri".
Famasist Makuo Mobike kwuru na otu ọghọm dị na mmanya ilu ndị a juputara ahịa ugbua bụ ịṅụfe ya oke.
"N'ihi na ha na-adị n'obere mkpọ, ọnụ ego ha pekwara mpe, ndị mmadụ na-aṅụfezi ya oke karịa ka o kwesịrị," Mobike na-ekwu.
"Ị ga-ahụ otu onye ọkada ọ ṅụọ mkpọ anọ maọbụ ise n'otu ụbọchị, nke a na-etinye umeju nakwa akịrị mmadụ na nsogbu."
"Ọzọkwa bụ na ọtụtụ ka 'alcohol' dị n'ime ha karịrị akarị, mana ndị mmadụ na-aṅụ ha n'ihi na ha chọrọ ihe ga na-acha ha anya."
Mobike na Okafor kwuru na ịṅụfe mmanya na-aba n'anya oke na-ebute ọdachi dị icheiche n'ahụ mmadụ dịka:
- Ọrịa kansa dị icheiche
- Mmebi akịrị mmadụ (Liver damage)
- Ọrịa mkpọnwụ ahụ (stroke), na ndị ọzọ
Kedu uru dị na 'herbal bitters'?
"Bitters nwere ike ime ka agụụ gụọ mmadụ ka onye ahụ nwee ike iri nri nke ọma," Rose Okafor kọwara.
"Ọ bụrụ onye ịnyụ nsị na-ara ahụ, mmanya ilu ndị a nwere ike ime ka onye ahụ nyụọ nsị maọbụ nyụọ ahụrụ ọfụma."
Ma oriaku Okafor ma Mazi Mobike kwetara na ụfọdụ mmanya ilu ndị a na-enye aka ewetulata 'sugar' dị n'ọbara.
Mobike kwukwara na ụfọdụ ka mmanya ilu ndị a na-enyere ha aka ka ha daa jụụ.
Rose Okafor kọwakwara na mmanya ilu nwere ike inye aka n'iwetu abụba dị mmadụ n'ahụ ma gbochie mmadụ ibu oke ibu.
Herbal bitters ọ na-ewulite ike aramara nwoke?
Oriaku Rose Okafor kwuru na e nwere mgbọrọgwụ, dịka 'ginger', nke na-enye aka ime ka ọbara na-agbasa ọfụma n'ahụ mmadụ.
N'ihi nke a, mgbọrọgwụ ndị a nwere ike inye aka iwulite ike nwoke ji eme aramara.
"Ọ bụrụ na mmanya ilu mmadụ na-aṅụ nwere ginger n'ime ya nke ọma, ee, o nwere ike inyere ya aka na mmekọ ahụ, mana ọ bụghị ha niile nwere ya," Okafor kwuru.
"Mana n'uche m, kama ịṅụ mmanya ilu e ji 'ginger' mee, ọ ka mma ị na-etinye ginger n'ihe oriri gị, maọbụ na mmanya mkpụrụosisi a kpọrọ 'smoothie', iji nwetakwa uru niile dị na ya, karịa ịṅụ mmanya ọkụ nke nwere 'alcohol' nwere ike imebi ihe n'ahụ gị."
N'aka nke ya, Makuo Mobike kwuru na nwoke na-eji ọgwụ maọbụ mmanya ilu ewulite ike aramara ya, anaghị enyere onwe ya aka.
"Ọ bụrụ na i nwere nsogbu n'ihe i ji bụrụ nwoke, gaa ụlọọgwụ ka i mee nnyocha ma nata ọgwụgwọ zuru oke," Mobike na-ekwu.
"Ịṅụ 'bitters' ndị a nwere ike inye aka nwa mgbe nta, mana n'ọdịnihu, o nwereike ibute nsogbu karịrị nke ị nọ na ya ugbua, nke ga-ara ahụ ngwọta.