You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Chinwoke Mbadinuju bụbu gọvanọ Anambra Steeti anwụọla
Ezinụlọ Mbadinuju ekwuola na Chinwoke Mbadinuju onye bụbu gọvanọ Anambra Steeti anwụọla dịka ọ gbara afọ 78.
Ọ bụ Cheta Chinwoke Mbadinuju kwupụtara nke a ma sị na ọ nwụrụ na Tuzde, ụbọchị 11 nke ọnwa Eprel afọ 2023 n'ụlọọgwụ gọọmentị nke dị n'Abuja dịka ọ rịara obere ahụ.
Cheta kwuru na ha ga-ekwuputa ọkwa maka olili ya n'ọdịnaihu.
Skip Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị and continue readingAkụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Ihe ị kwesịrị ịma maka Chinwoke Mbadinuju
- Ọ chịrị Anambra steeti malite n’ụbọchị Mee 29 nke afọ 1999 ruo ụbọchị 29 nke ọnwa Mee 2003 n’aha otu People's Democratic Party (PDP).
- Ọ gụrụ akwụkwọ dịka onye ọkaibe na ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa n’ọchichi na mahadum. Ọ gụrụ n’ihu gụọ akwụkwọ dịka onye ọkaiwu na mba Briten.
- Ọ rụrụ ọrụ dịka onye isi nhazi ụlọ mgbasaozi Times International
- Tupu ọ banye ndọrọndọrọ ọchịchị, ọ rụburu ọrụ dịka onye nkuzi na mahadum State University of New York.
- Ọ rụrụ dịka onye enyemaka aka chịbụrụ Enugu steeti bụ Jim Chris Nwobodo malite na 1979 ruo 1980
- Ọchịchị n’Anambra hibere otu nchekwa ‘Anambra Vigilante Services’ nke mechara bụrụ otu nchekwa ‘Bakassi Boys’ rụrụ ọrụ nchekwa na steeti ahụ n’oge ahụ.