Etu e si chọpụta ozu nwafọ Anambra a n'ụlọ ndina dị na Bauchi Steeti

Ebe foto si, Chukwunonso Chukwujekwu
Ndị uweojii Bauchi Steeti ekwupụtala ọnwụ nwafọ Igbo bụ Chukwunonso Chukwujekwu nke okpuruọchịchị Anambra East dị n’Anambra State.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Bauchi Steeti bụ Ahmed Wakili gwara BBC Igbo nke a ma sị na o mere n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Disemba afọ 2022 bụ nke ụbọchị abụọ a malitere ịchọ nwamadị a achọ.
Akụkọ kwuru na nwamadị a gara emume ngwụcha afọ ndị Igbo e mere n’abalị Wednesde
N’okwu ya “nwunye nwoke a kpọrọ Grace Chukwunonso bịara mee mkpesa n’ụlọọrụ ndị uweojii na 30 Nọvemba, 2022 na ha na-achọ di ya bụ Chukwunonso achọ.”
“Ọ sị na di ya hapụrụ ụlọ ha ma gawa n’ụlọahịa ha dị na Boi mana kamgbe ahụ ahụghị ya anya ọzọ.”
Ngwa ngwa o mechara mkpesa a onye DPO nọ nyere iwu ka a malite ịchọ nwoke a, e mechara hụụ ozu nwoke a n’ụlọ ndina dị na Tundun Wada nke okpuruọchịchị Bogoro.”
Ozu nwoke a tọgbọ n’ala dịka ọfụfọ na asụmmiri si ya n’ọnụ na-asụpụta”.
Wakili kwuru na e buuru ozu ya gawa n’ụlọọgwụ General dị na Bogoro ebe ekwupụtara ọnwụ ya.
Ọ gara n’ihu kwuo na kọmishọna ndị uweojii sị ka e mee nyocha ma chọpụta ihe gburu Chukwunonso.
Ihe dị mkpa banyere Chukwunonso

Ebe foto si, Chukwunonso Chukwujekwu
- Chukwunonso Chukwujekwu bụ nwafọ Nando dị n’okpuruọchịchị Anambra East nke Anambra Steeti.
- A mụrụ ya n’ụbọchị ise nke ọnwa Jenụwarị, afọ 1985.
- Ọ lụrụ nwunye ya bụ Grace Chukwunonso ebe ha mụtara ụmụ atọ.
- Tupu ọnwụ ya nwamadị ji echichi a kpọrọ ‘Onyewetehi nke Nando’ nakwa Kaigaman Boi bụ nke onye ndu Boi bụ Bala Ibrahim Likita chiri ya n’afọ 2019.
- Chukwunonso ebiela n’obodo Boi Bauchi Steeti ihe ruru afọ iri abụọ.









