Etu Tanko Muhammad bụbu Nnukwu Ọkaikpe Naịjirịa siri nwụọ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onye bụbu Nnukwu Ọkaikpe Naịjirịa bụ Ọkaikpe Tanko Muhammad anwụọla

E kwuru na Muhammad nwụrụ n'otu ụlọọgwụ dị na mba Saụdi Arebịa dịka ọ fọdụrụ izuụka abụọ ka o cheta afọ iri asaa na abụọ ya.

Ka ọ dị, aka na-achị Bauchi Steeti bụ Gọvanọ Bala Mohammed akasiela ezinaụlọ Muhammad obi n'ihi ọnwụ Ọkaikpe ahụ lara ezumike nka.

Ọ nwụrụ dịka ọ fọdụrụ ntakịrị ka o ruo afọ atọ na ọkara ọ hapụrụ ọrụ n'ike n'ụbọchị 27 Juun, 2022 n'ihi nsogbu ahụike.

Tanko Muhammad bụ nwaafọ Doguwa dị n'okpuru ọchịchị Giade na Bauchi Steeti, ma bụrụkwa Nnukwu Ọkaikpe Naịjirịa nke iri na asaa.

Ụfọdụ ihe ị kwesịrị ịma maka Tanko Muhammad

A mụrụ Ọkaikpe Tanko Muhammad n'ụbọchị 31 Disemba, 1953. Ọ bụ onye Doguwa dị n'okpuru ọchịchị Giade na Bauchi Steeti.

O nwetara nzere ya niile n'ihe ọmụmụ iwu, gụnyere LLB, LLM nakwa PhD site na mahadum Ahmadu Bello University dị na Zaria.

Ọ gbagoro n'ọkwa site n'ogogo Magistrate Grade II iji bụrụ Nnukwu Ọkaikpe Naịjirịa.

Onyeisiala Naịjirịa lara mmụọ bụ Muhammadu Buhari họpụtara ya dịka onye ga-arụgodu ọrụ ka Nnukwu Ọkaikpe Naịjirịa n'ụbọchị 25 Jenụwarị 2019.

Ka ọnwa isii gara, Buhari duru ya n'iyi ọrụ dịka Nnukwu Ọkaikpe Naịjirịa nke iri na asaa n'ụbọchị 24 Julaị 2019.