You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Gịnị ka a sị Stella Oduah mere Gọọmenti Naịjirịa jiri kpụpụ ya n'ụlọikpe?
Gọọmenti Naịjirịa akpụpụla onye bụbu Minista Njem Ụgbọelu bụ Sịnetọ Stella Oduah n'ụlọikpe, n'ihi ebubo nrụrụakaego.
Nke a na-abịa dịka ndị ọrụ EFCC nwuchiri onye bụbu Gọvanọ Anambra steeti ma bụrụkwa Minista hụrụ maka ndị ọrụ na inye ohere ọrụ bụ Chris Ngige n'ụbọchị Wenezde 10 Disemba, 2025.
Ọ bụ n'ihu Ọkaikpe Hamza Muazu nke Ụlọikpe Ukwu nke Isi Obodo dị n'Abuja ka a kpụpụrụ Oduah n'ihi ebubo nrụrụaka ijeri Naịra ise (N5b).
Nnukwu Ọkaiwu Naịjirịa bụ Lateef Fagbemi boro Stella Oduah ebubo ise ndị gbakwasara ụkwụ na nrụrụakaego na ịkpa nkata ọjọọ.
N'otu ebubo e boro Oduah, a sị na o jiri ụzọ aghụghọ nweta ijeri Naịra abụọ na ụma anọ (N2.4b) n'aka Mịnịstrị na-ahụ maka njem ụgbọelu, site n'ụlọọrụ Broad Waters Resources.
A na-ebo ebubo na o kwuru na ego ahụ bụ maka nlekọta ọrụ, ma bụrụkwa nke o mere n'ọnwa Jenụwarị, afọ 2014.
N'ebubo nke ọzọ, e kwuru na Stella Oduah natara otu ijeri Naịra na uma isii (N1.6b) nakwa narị nde Naịra asatọ na iri atọ na itoolu (N839m) site n'otu ụzọ ahụ, bụ nke megidere mpaghara asatọ nke iwu gbochiri mpụ ego bụ Advance Fee Fraud.
Ka ọ dị, nwaanyị ahụ bụbu Minista na onye otu ya bụ Gloria Odita gọrọ aka na ụkwụ ha n'ebubo ndị ahụ.
Ọkaikpe na-elebara okwu ahụ anya bụ Hamza Muazu nyere Stella Oduah beelụ n'ihi onye ọ bụ, ma nye iwu ka ọ tọgbọrọ ụlọikpe ahụ akwụkwọ njem ya.
Muazu nyekwara Oduah iwu ka ọ ghara ime njem pụọ na Naịjirịa na-ebughị ụzọ nata nkwado nke ụlọikpe ahụ.
Ihe a bụ nke ugboro abụọ Gọọmenti Naịjirịa ga-akpụpụ Stella Oduah n'ụlọikpe. E buru ụzọ kpụpụ ya n'Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja, ma mechaa kagbuo ebubo ndị e boro ya n'oge ahụ.
Onye bụ Stella Odua?
- Stella Oduah bụ nwaada si Akili-Ozizor dị n'okpuru ọchịchị Ogbaru n'Anambra Steeti.
- Ọ bụbu Minista hụrụ maka njem ụgbọelu na Naịjirịa site n'afọ 2011 ruo n'afọ 2014.
- Ọ bụkwa Sịnetọ nọchitere anya mpaghara Anambra North n'Ụlọomeiwu Ukwu Naịjirịa malite n'afọ 2015 ruo n'afọ 2022.