Soludo, mụ na gị ga-arụkọ ọrụ maka ọdịmma ndị Anambara - Ezenwafor
Onye ji ọkọlọtọ otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party' (PDP) zọọ ọkwa gọvanọ n’Anambra Steeti ekweela nkwa na ya dị njikere isonye Gọvanọ Chukwuma Soludo rụkọọ ọrụ maka ọdịmma steeti ahụ.
Ezenwafor, onye kwuru nke ọge ọ gwara ụlọmgbasa ozi Channels TV okwu n'ụbọchị Mọnde 10 Nọvamba, kwuru na ya na Gọvanọ Soludo na-enwe mmekọrịta dị mma mgbe niile.
O kwuru n'ụtụtụ na-esote ụbọchị a kpọchara Soludo dịka onye meriri na ntuliaka ha mere ụbọchị Satọde 8 Nọvamba 2025 sị, “Enwere m ike inyere ya aka. Anọ m na-enyere ya aka mbụ; ọ bụ enyi m. Akpọtara m ya ọrụ n’Anambara.”
“Eso m na ndị gwara Soludo ka ọ zọọ ọkwa ahụ n'oge mbụ m bụ onye enyemaka pụrụ iche nke Gọvanọ Willie Obiano.
"Ọ bịara, o mere nke ọma mana ọ dịghịkwa onye zuru oke.”
Cheta na nchekwa bụ isi okwu dị mkpa n'etiti ndị na-azọ ọkwa gọvanọ na ndị ọzọ nwere mmasị na ya n'oge ntuliaka ahụ.
Mana Ezenwafor gara n’ihu kwuo: “Soludo na ndị otu nchekwa ya na-arụ ọrụ. Anyị nwere ndị isi ọrụ nchekwa ruru eru na Anambra.
Aga m agwa Gọvanọ Soludo: Na ihe ha chọrọ bụ ngwa ọrụ ka mma, enweghị nchekwa ga-akwụsị.
"Ekwere m na ọ ga-eme ihe karịrị ya."
Akpọrọ m ya oku iji kelee ya, mana ọ bụrụ na ọ meghị nke ọma, m ga-ekwu okwu."